Nigerian Wedding Budget: Ihe ọ ga-ewe nwaanyị ihazi agbamakwụkwọ ya

Ndị na-eme agbamakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụfọdụ oge ihe na-agụ ụmụnwaanyị bụ ka ndị bịara agbamakwụkwọ gbaa ha nkiri

Ị bụ nwaada na-akwado ịgba akwụkwọ? Akụkọ a bụ maka gị.

Site n'oge ha dị obere, ọtụtụ ụmụnwaanyị nwere ebumnobi na 'nrọ' maka etu agbamakwụkwọ ha ga-adị.

Mana mgbe ụfọdụ tolitere, ebumnobi ha ahụ na-agbanwe ma ghara ịdị ka ihe ha chọburu; ụfọdụ oge ọ bụrụ na ihe ha chọzịrị akala mma.

Nke a na-eme ka ụmụnwaanyị, ọkachasị ndị na-achọghị ịkwụ ndị ọrụ ha bụ ihazi agbamakwụkwọ ụgwọ, jiri aka ha hazie usoro agbamakwụkwọ ha, ka ọ bụrụ okwu a kpụ n'ọnụ.

Nke bụ eziokwu bụ na i nweghi ike ịsị "lee ego ole agbamakwụkwọ m ga-eri m", mana ọ bụzị mgbe i bidoro ka ị ga-ama ma ị chọrọ ka agbamakwụkwọ gị bụrụ ọnụkwube kaọbụ ka ọ bụrụ obere agbamakwụkwọ.

Lee ihe ọ na-ewe ịchịkọta agbamakwụkwọ

*Mara na nke a abụghị n'usoro o kwesịrị isi gaa, mana ha niile so n'ihe nwaanyị na-ahazi.

1) Nhọpụta isi atụmatụ nke ụbọchị ahụ:

Ihazi ihe ndị Bekee kpọrọ 'theme' bụ otu ihe na-adị nwaanyị na-agba akwụkwọ mkpa.

Ọ na-adị nwaanyị mkpa n'ihi na ọ na-eso ekwu etu nwaanyị ga-esi echeta ụbọchị agbamakwụkwọ ya; nwaanyị na-eji atụmatụ a emepụta ebumnobi ya.

Atụmatụ a na-eso egosikwa etu ụbọchị ahụ ga-esi aga, ihe dịka ejiji ndị mmadụ ga-eyi, ụdịrị agwa (color) ha ga-eyi, ụdịrị egwu ọ chọrọ ka a gbaa maọbụ ka a kụọrọ ya, ụdịrị nri a ga-eri, ụdịrị achịcha Bekee, etu ọ chọrọ ka foto ha ga-ese dịrị wdgz.

Etu ọ chọrọ ka ụbọchị agbamakwụkwọ ya dịrị ga-enyere ya aka ịhọpụta ebe ọ ga-anọ eme ya bụ emume.

2) Nhọpụta ebe a ga-anọ agba akwụkwọ:

Di na nwunye

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Di na nwunye gbara akwụkwọ n'elu ụgbọmmiri

Etu isi atụmatụ ụbọchị ahụ (lee anya n'okwu nke mbụ) ga-adị na-eme ka nwaanyị mara ebe ọ chọrọ ime mmemme ya.

Ọ chọrọ ka ọ bụrụ n'ime ụlọ? N'ezi? N'akụkọ mmiri? N'elu ụgbọelu (dịka ome ejije Nollywood bụ Omotola Jalade-Ekeinde mere)? N'obodo a maọbụ na mba ofesi?

Mmadụ ole ka ya na di ya ga-achọ ka ha bịa agbamakwụkwọ ha?

Ọ bụ eziokwu na ego ji ọrụ, mana ebe ọbụla ọ chọrọ ya ka a ga-anọ mee ya, ihe ọ nyịrị bụ ịgba di ya ọgwụ ka o mee ya obi aṅụrị site n'imezu ebumnobi ya.

3) Nhọpụta ndị ga-eduputa ya (Bekee kpọrọ ya Bridal Train):

Ụmụnwaanyị na-eduputa nwaanyị na-agba akwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-eji aka ha ahọpụta ụdịrị akwa ụmụnwaanyị ga-eduputa ha ga-eyi

Ebe ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ahọrọ ụmụnne ha ka ha bụrụ ndị ga-eduputa ya n'ụbọchị agbamakwụkwọ ya, ndị ọzọ na-ahọrọ ndị bụ ezigbo enyi ha.

Etu ụwa dị ugbua, ụfọdụ ụmụnwaanyị na-achọzị ihe ọpụrụiche dịka: "naanị ụmụnwaanyị ndị na-acha ọcha ga-eduputa m", "naanị ndị na-ebughi ibu ga-eduputa m", "naanị ndị toro ogologo ga-eduputa m" wdgz

Ụfọdụ ndị ọgbara ọhụrụ a na-ahọrọ naanị ndị ha ma ga-akwụnwu ụgwọ akwa ha ma jikee onwe ha.

Ebe ọ bụ ha na-ahazi ya, ihe ha bụ nwaanyị na-agba akwụkwọ chọrọ bụ ihe ga-eme.

4) Mkpebi maka nkwado ya:

Nwaanyị na-eme ntecha

Ebe foto si, Getty Images

Nwaanyị ka ọ dịrị ikwado onwe ya, site n'ụdịrị uwe ọ ga-eyi agba akwụkwọ, etu ntutu ya ga-adị (ọ ga-ebu ntutu ya ka ọ ga-etinye ihe n'isi), ọ ga-eme ntecha kaọbụ ọ gaghị eme, ụdịrị akpụkpọụkwụ ọ ga-eyi, ọ ga-eji akpa n'aka ka ọ ga-agba aka nkịtị, wdgz.

Ihe ndị a niile bụcha mkpebi dịrị nwaanyị tupu agbamakwụkwọ ya ebiri ọkụ.

Mana nke kaara nwaanyị mma bụ ime ihe ebe akpa ya na di ya ha.