Insecurity in Southeast Nigeria: Ebe niile awakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Abia, Anambra, Ebonyi, Enugu na Imo steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ekperima awakpola ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Obowo Imo steeti ma gbuo mmadụ abụọ.
Ha merụkwara ndị uweojii atọ ọzọ ahụ na mwakpo ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu gwara BBC Igbo na ndị uweojii gbukwara otu n'ime ndị ahụ wakporo ụlọọrụ ahụ.
Amatabeghị ndị mere ihe a mana Ikeokwu kwuru na ha ga-ewepụta akwụkwọ ozi n'oge n'adịghị anya.
Ịwakpo ụlọọrụ ndị uweojii bụzi ihe na-eme kwa mgbe kwa mgbe na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'ọdị nso a.
Lee ụlọọrụ ndị uweojii a wakporola na South-East kamgbe ọnwa isii

Ebe foto si, Police Ebonyi
Mwakpo ụlọọrụ uweojii Anambra
Dịka ndị uweojii n'Ebonyi steeti kwuru na ndị a na-eche na ha bụ otu Ipob wakporo ụlọorụ ha dị n'Ọnịcha Isu na Tọzde ụbọchị anọ nke ọnwa Jenuwarị afọ 2021.
Nke a abụghị mbụ ụdị a na-eme makana nsonso a, a wakpoola ọtụtụ ụloọrụ ndị uweojii na mpaghara Ọwụwanya Anyanwụ ma zuru egbe ha.
Akụkọ a na-egosi ụfọdụ ụloọrụ ndị uweojii a wakporo n'ime ọnwa isii na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Abia Steetị

Ebe o mere : Ebem Ohafia, Abia state
Mgbe o mere: Ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Eprelụ afọ 2020 (18th April, 2020)
Ihe o metụtara: Ụlọọrụ ndị uweojii nakwa ụlọ obibi nke DPO.
Onye kwuru: Nke a si n'ọnụ kọmshọna ndị uweojii n'Abia Steetị bụ Ene. Okon

Ebe O mere : Umuoba dị n'okpuruọchịchị Isiala Ngwa North nke Abia Steetị.
Mgbe o mere: Ụbọchị abụọ nke ọnwa Febụwarị, afọ 2021 (2nd February, 2021).
Ihe o metụtara: Otu onye uweojii nwụrụ ebe otu nwaanyị onye uweojii merụrụ ahụ, a gbara ụloọrụ ndị uweojii nakwa ụgbọala ha ji arụ ọrụ tinyere ụgbọala ndị ọzọ.
Onye kwuru: Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Abia Steetị bụ Geoffery Ogbonna.

Ebe foto si, Police Ebonyi
Ebe o mere : Ụlọọrụ ochie ndị uweojii a kpọrọ 'Old Zone 6 Annex' d n'Ogbor Hill Aba nke Abia Steetị.
Mgbe o mere : N'ọnwa Oktoba, afọ 2020 n'oge ngagharịiwe EndSARS.
Ihe o metụtara: Ụlọ obibi ndị uweojii nke Zone 6 Annex Aba.
Onye kwuru: Kọmịshọna uweojii Abia Steeti bụ Janet Agbede
Ebonyi Steeti

Ebe o mere : Ụlọọrụ ndị uweojii a kpọrọ 'Central Police Station' dị n'Abakiliki nke Ebonyi Steeti.
Mgbe o mere: Ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Ọktoba, afọ 2020 (26th October, 2020).
Ihe o metụtara: Ụlọọrụ ndị uweojii, ụgbọala, ọgbatumtum nakwa Keke.
Onye kwuru : Kọmịshọna uweojii n'Ebonyi Steetị bụ Philip Maku.

Ebe o mere : Obodo Uburu, okpuruọchịchị Ohaozara dị n'Ebonyi steeti.
Mgbe ọ mere : Ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Ọktoba, afọ 2020 (22nd October, 2020).
Ihe o metụtara: A wakporo ụloọrụ ndị uweojii ma merụọ ọtụtụ ndị uweojii merụrụ ahụ.
Onye kwuru: Kọmịshọna uweojii n'Ebonyi Steetị bụ Philip Maku.

Ebe o mere : Onueke dị n'okpuruọchịchị Ezza South nke Ebonyi Steeti.
Mgbe o mere : Ụbọchị asatọ nke ọnwa Jenụwarị, afọ 2021 (8th January, 2021).
Ihe o metụtara: Ndị uweojii atọ nwụrụ.
Onye kwuru: Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Ebonyi Steeti bụ Loveth Oda.
Anambra Steetị

Ebe o mere: Igboukwu dị n'okpuruọchịchị Aguata nke Anambra Steeti.
Mgbe o mere: Ụbọchị iri na isii nke ọnwa Disemba, afọ 2020 (16th December, 2020).
Ihe o metụtara: Ndị uweojii atọ nwụrụ.
Ihe kpatara ya: Onye uweojii gbagburu otu onye ọgbatumtum.
Onye kwuru: Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Anambra Steeti bụ Haruna Mohammed.

Ebe o mere : Amichi, Osumenyi, Ezinifite na Ukpọ dịcha n'Anambra Steetị.
Mgbe o mere : Ụbọchị iri na isii nke ọnwa Disemba, afọ 2020 (16th December, 2020) na Maachị na Epreelu 2021
Ụdịrị ọdachi : Egburu DPO, CSP Akpan Joseph, na ASP Agu Micheal, Station Officer (SO) na PC Udegbunam Sunday Celestine. A gbara ụloọrụ ha ọkụ, gbaa ụgbọala iri abụọ ọkụ ma mebie ọtụtụ ihe.
Ihe kpatara ya: Ngagharịiwe EndSARS.
Onye kwuru: Kọmịshọna Uweojii n'Anambra bụ John Anang.
Imo Steetị

Ebe o mere: Egbu dị n'Owerri nakwa Owerre nkwọọjị dị n'okpuruọchịchị Nkwere, Imo Steeti.
Mgbe o mere: Ụbọchị itoolu nke ọnwa Sepụtemba, 2020 (9th September, 2020, Maachị na Epreelu 2021).
Ihe o metụtara: E gburu otu onye uweojii ma napụ ndị ọzọ egbe ha.
Ihe kpatara ya: Aka ọrụ ndị omekome
Onye kwuru: Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Ikeokwu Orlando.

Ebe o mere: Nworieubi nke dị n'okpuruọchịchị Mbaitolu nke Imo Steeti.
Mgbe o mere: Ụbọchi iri abụọ na otu nke ọnwa Ọktoba, 2020 (21st October, 2020).
Ihe o metụtara: A gbara ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ.
Ihe kpatara ya: Ngagharịiwe EndSARS.
Onye kwuru: Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Ikeokwu Orlando.
Enugwu Steetị

Ebe o mere: Ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Emene, Amechi-Idodo, Uwani na Trans Ekulu nke Enugwu Steeti.
Mgbe o mere: Ụbọchi iri abụọ na otu nke ọnwa Ọktoba, 2020 (21st October, 2020).
Ụdịrị ọdachi: A gbara ụlọọrụ ndị uweojii ise ọkụ.
Ihe kpatara ya: Ngagharịiwe EndSAR.
Onye kwuru: Kọmịshọna ndị uweojii n'Imo Steeti ahụ bụ Ahmad Abdurrahman.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










