Mathias Ekweremadu: Ike Ekweremadu akwaala akwa arịrị maka ọnwụ nwanne ya nke nta

Mathias Ekweremadu

Ebe foto si, Facebook/Ike Ekweremadu

Nkọwa foto, Mathias Ekweremadu (1965 - 2021)
    • Onye dere ya, Ebere Ekeopara & Jessica Nwankwo
    • Ndị mere akụkọ a, Reporter, Igbo Service
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

"Ugbua ka o fochara m n'anya na nwanne m nwoke nke nta alaala mmụọ."

Nke a bụ akwa arịrị Ike Ekweremadu kwara n'ụbọchị Sọnde gbasara ọnwụ nwanne ya nwoke bụ Mathias Ekweremadu.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Nke a bụ nke mbụ Ike Ekweremadụ na-ekwu okwu banyere ọnwụ nwanne ya nwoke onye nwụrụ na mberede n'ụbọchị Tọzde, abalị anọ nke ọnwa Febrụwarị afọ 2021.

Ekweremadu onye ruburu ọrụ dịka Osote Onyeisioche ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa kelekwara ndị niile ziteere ya ozi iti aka n'obi n'ọnwụ nwanne ya.

Lee etu Ugwuanyi na ndị ọzọ si gaa mgbaru n'ụlọ Mathias Ekweremadu

Gọvanọ Ugwuanyi gara n'ụlọ Mathias Ekweremadu, ịhụ nwunye ya na ụmụ ya

Ebe foto si, Enugu State Government

Nkọwa foto, Gọvanọ Ugwuanyi gara n'ụlọ Mathias Ekweremadu, ịhụ nwunye ya na ụmụ ya

Gọvanọ Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi, osote ya ndị ọzọ agaala mgbaru n'ụlọ Maazị Mathias Ekweremadu nwụrụ anwụ ịhụ nwunye ya na ụmụ ya.

Ugwuanyi du osote ya bụ Cecilia Ezeilo, onyeisi ndị omeuiwu bụ Hon. Edward Ubosi na ndị omeiwu ọzọ gaa njem 'iti aka n'obi' a.

Onye nabatara ugwu bụ Bishọp ụka Anglikan nke Enugwu Dayọsisi bụ Emmanuel Chukwuma bụ onye kpere ekpere n'isi Mathia Ekweremadu.

M.J. Ekweremadu

Ọtụtụ ndị ọzọ gakwara mgbaru n'ụlọ Mathias Ekweremadu bụ onye nwụrụ n'ụbọchị Tọzde iji kwanyere ya ugwu.

Ọtụtụ mmadụ gbakọrọ na be ya dị n'Enugwu iji gosi na ọnwụ ya wutere ha.

Bishop Emmanuel Chukwuma na-ekpe ekpere

Ebe foto si, Enugu State Government

Onye hụrụ ebe ihe mere gwara BBC Igbo na ọtụtụ ndị nnukwu mmadụ gụnyere Rotimi Amechi bụ Minista na-ahụ maka njem bịwakwara na be ya iti ezinaụlọ ya aka n'obi.

Gọvanọ Ugwuanyi na ezinaụlọ Mathias Ekweremadu

Ebe foto si, Enugu State Government

Ọnwụ Ekweremmadụ ka na agbagwoju ndị mmadụ anya

Ndị mmadụ ka nọ n'iru uju n'ibe akwa maka ọnwụ ntụmade nke kọmishiona na-ahụ maka ime njem n'Enugwu steeti bụ Mazị Mathias J Ekweremmadụ Junior.

Mgbe BBC rutere na ụlọ ọrụ ya bụ Kọmishịọna nwụrụ anwụ, ndị ọrụ ya kwuru na ọnwụ ya bụ ihe nnukwu nwute.

Ndị mmadụ gbakọrọ be M.J. Ekeweremadu

Iji gosi ka obi dị ha, ndị na echekwa ka ụgbọ ala si aga anọghị ọrụ tata iji kwanyere ya ugwu ma gosi obi nwute ha.

PRO ya bụ ministri bụ Ngozi Ugwu kwuru na dịka ha siri nụ, na mazị Ekweremmadụ dara ma nwụọ ebe ọ nọ nzụkọ na Enugu steeti House of Assemly.

Ka ọ dị ugbua ndị mgbarụ na-aga n'ụlọ ya iji kasie ndị ezi na ụlọ ya obi.

Ihe ndị ịmaghị maka Mathias Ekweremadu

Mathias Ekweremadu (1965 - 2021)

Ebe foto si, Facebook/Mathias Ekweremadu

Mathias Ekweremadu bụ kọmishọna na-ahụ maka njem n'Enugwu Steetị ma bụrụkwa nwanne Sịnetọ Ike Ekweremadu anwụọla.

Ọnụ na-ekwuru mịnịstrị na-ahụ maka njem n'Enugwu Steetị gwara BBC Igbo na nke bụ eziokwu na ọ dara n'ụlọ omeiwu ndị Enugwu Steetị ma nwụọ.

O kwuru na ahụ siri Ekweremadu ike n'ụtụtụ a mgbe ha kpechara ekpere n'isiụlọọrụ ha tupu ọ gawa n'ụlọomeiwu bụ ebe ọ nọ nwụọ.

Onye bụ Mathias Ekeweremadu?

Mathias Ekweremadu (1965 - 2021) na nwunye ya

Ebe foto si, Facebook/Mathias Ekweremadu

Nkọwa foto, Mgbe Mathias Ekweremadu na nwunye ya gbara akwụkwọ

- A mụrụ ya n'obdo Amachaala mpu dị n'okpuruọchịchị Aninri n'Enugwu steeti

- Ọ dị afọ 55 dịka a mụrụ ya n'ụbọchị ọnwa Juun afọ 1965.

- Ọ lụrụ nwaanyị mụta ụmụ anọ mana nwa ya nwoke akpọrọ Ugochukwu nwụrụ n'afọ 2019.

Mathias Ekweremadu na ezinaụlọ ya

Ebe foto si, Facebook/Mathias Ekweremadu

Nkọwa foto, Mathias Ekweremadu, nwunye ya na ụmụ ya

- Ọ gụrụ 'Political Science' na Mahadum Enugu state university (nke a ma ka Esut) dị n'Enugu steeti ma gụọkwa 'Masters' ya na Mahadum Abia state University (Absu) n'Abịa steeti.

- Ọ bụ onyeisioche okpuru ọchịchị Aninri site n'afọ 2008 rue afọ 2011.

- O sobu n'otu UBE bụ na-akwalite agụmakwụkwọ na Naịjirịa niile.

- Ọ bụbu onyeisi ụlọomeiwu nke Enugwu steeti akpọrọ 'Chief Whip' na Bekee.

Mathias na Ike Ekweremadu

Ekweremadu

Ebe foto si, Getty Images

Mathias bụ nwanne Ike Ekweremadu nke obere si n'otu nne na otu nna. Ike ji afọ atọ were tọ Mathias.

Ike Ekweremadu bụ Sinetọ nọchiri anya Enugwu West n'ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa kemgbe afọ 2011.

Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka ebe ọ gụrụ 'Law'.

O tozuru ịbụ onye omeiwu n'afọ 1987 n'usoro akpọrọ 'Call to bar'