Emmanuel Nwobosi: Ihe ị maghị maka ọchịagha a so Ojukwu kwaa mgbọ n'agha Biafra

Emmanuel Nwobosi

Ebe foto si, Youtube/Heritage Multimedia

Nkọwa foto, Emmanuel Nwobosi bụbu onye fọrọ n'ime ndị so lụọ agha Biafra

Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na mpaghara ọwụwa anyanwụ akwaala arịrị maka ọnwụ Emmanuel Nwobosi, ọchịagha kpara ike oge a lụrụ agha Biafra.

Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano, bụ otu onye n'ime ha, ọ gara njem iti aka n'obi na be Nwobosi n'ụbọchị Tuzde Novemba ụbọchị 24, 2020.

Willie Obiano

Ebe foto si, Anambra Broadcasting Service/Facebook

Nkọwa foto, Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano ka ọ gara njem iti aka n'obi n'ezinụlọ Nwobosi

Nwobosi gbara afọ iri asatọ na abụọ tupu ọ laa mmụọ mana ihe ndị mmadụ ji echeta ya bụ ịhụnanya ike ọ kpara n'oge agha.

Ị nụchaa akụkọ Nwobosi, ị ga-ekweta ihe Otiegwu bụ Oliver De Coque kwuru sị: "A na-enwe obodo enwe, obodo anaghị eko n'elu ka ụgbọgụrụ'.

Aha onyonyo, Biafra: Gịnị nọ n'ime Bọnka Ojukwu
Emmanuel Nwobosi

Ebe foto si, Nwobosi Family

Nkọwa foto, Emmanuel Nwobosi, oge ọ ka bụ okoroọbịa

Onye bụ Emmanuel Nwobosi?

  • Emmanuel Nwora Nwobosi bụ onye Obosi n'Anambra steeti. Aha echichi ya bụ 'Ogene Obosi'
  • O ji ọkwa 'Captain' nke ndịagha Naịjirịa, mana oge agha malitere, e nyere ya ọkwa 'Major' nke ndịagha Biafra
  • O nwetara ọzụzụ n'ụlọakwụkwọ ndị agha a ma ama bụ 'Royal Military Academy Sandhurst' nke dị na mba UK
  • Nwobosi so na ndị agha weghaara ọchịchị n'ike, nke Bekee kpọrọ 'Coup d'etat', n'ọnwa Jenụwarị afọ 1966
  • Ọ bụ Nwobosi bụ onye ndị agha nke gara Ibadan ma nwuchie ndị ọchịchị nọ na mpaghara ahụ
  • E mechara nwuchie Nwobosi na ụfọdụ ndị agha ndị ọzọ so kpaa nkata ahụ ma tụkpuo ha n'ụlọ mkpọrọ dị na Kirikiri Legọs, mechaa kpụga ha n'ụlọ mkpọrọ dị n'Enugwu, mechakwaa kpụga ha na nke dị n'Owere.
Emmanuel Nwobosi

Ebe foto si, Nwobosi Family

Nkọwa foto, Emmanuel Nwobosi ka onye agha
  • Oge agha Biafra malitere, Ojukwu tọhapụrụ ndị niile nọ na mkpọrọ nke Nwobosi bụ otu n'ime ha.
  • Ojukwu mere Nwobosi onyeisi ndị na-arụkwa ngwa ọgụ, bụ 'Artillery Commander' na Bekee. Isi ụlọorụ ha oge ahụ dị n'Enugu
  • Ogbunigwe 'Shell' tụrụ Nwobosi oge a na-akwa mgbọ n'Obolo-Afọ, tijie ya ngụgụ nakwa ọkpụkpụ azụ, mana ndị agha gbakọtara buga ya ụlọọgwụ ebe e mechara gwọta ya.
  • Mgbe agha kwụsịrị, Nwobosi gbara ọsọ ndụ gbaga mba Guyana nke dị na mpaghara Saut Amerịka.
  • Na mba Guyana, e nyere Nwobosi ọkwa dị elu n'otu ndị agha mba ahụ.
  • O mechara si mba Guyana gaa mba Kanada ma nọọ ebe ahụ ọtụtụ oge tupu ọ lọghachi Naịjirịa.
  • Oge Nwobosi lọghachiri Naịjirịa, ọ malitekwara ịrụrụ Ojukwu ọrụ dịka onye enyemaka ya, mana o kweghị eso Ojukwu banye ndọrọndọrọ ọchịchị
  • Ruo oge ọ nwụrụ, Nwobosi bụ onye nkwado nnwereonwe Biafra, n'ihi na o kwuru na Naịjirịa ahụghị ndị Igbo n'anya.
Nnamdi Kanu na Emmanuel Nwobosi

Ebe foto si, Centapost

Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na Emmanuel Nwobosi
  • Ọ bụkwa onye nkwado otu 'Indigenous People of Biafra nakwa onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu.
  • N'ọnwa Jenụwarị afọ 2015, oge gọọmentị Anambra steeti mere ncheta maka ndị nwụrụ n'agha Biafra, nke a kpọrọ 'Ọzọemezina', Nwobosi so na ndị a kwanyeere ugwu.
  • Nwobosi nwụrụ n'isi ụtụtụ ụbọchị Tọzde, abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Nọvemba afọ 2020

N'afọ 2016, Femi Fani-Kayode, jibu ọkwa Mịnịsta njem ụgbọelu na Naịjirịa, dere akụkọ etu Nwobosi si wakpo ụlọ nna ya oge ndị agha weghaara ọchịchị n'ike na 1966.

Fani-Kayode kọkwara etu Nwobosi na ndịagha ya si gbuo Samuel Akintola, onye ji ọkwa 'Premier' nke mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa oge ahụ.

O kwuru sị: "A katọrọ m ihe Nwobosi na ndị agha ya mere n'abalị ahụ. Ana m eru uju nwanne nna m bụ Akintola bụ onye ha gburu n'abalị ahụ."

"Mana anaghị m ama ya maọbụ ndị otu ya ikpe. Naanị Chukwu ka ikpe dịịrị".

"Ebughị m ihe ọbụla n'obi megide ha. A hapụla m ha n'aka Chineke."

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: