Penis Captivus: Ị tọkịrị n'ime nwaanyị, nọrọ jụụ ma mee ihe ndị a

Ntọkịrị amụ n'ime ọtụ nma-emekarị mgbe mmekọrịta nwoke na nwaanyị sọgburu onwe ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ntọkịrị amụ n'ime ọtụ nma-emekarị mgbe mmekọrịta nwoke na nwaanyị sọgburu onwe ya
    • Onye dere ya, Adline Okere
    • Ndị mere akụkọ a, Editor, BBC Igbo

Ọtụtụ chere na mgbe amụ nwoke tọrọ n'ime ọtụ nwaanyị, ọ na-abụ na ha na-ezu mmekọrịta ha n'ohi.

Mana amụ nwoke ịtọ n'ime ikpu nwaanyị, ihe Beke kpọrọ 'penis captivus', abụghị ihe na-eme kwa mgbe.

Amụ ịtọ n'ọtụ na-emekarị mgbe nwoke na nwaanyị na-enwe mmekọrịta.

Oge ụfọdụ, ndị mmadụ na-asị na ọ bụ mmemina onye gbara n'ezi, ya bụ onye gara dina onye na-abụghị nwunye ha maọbụ di ha.

Ihe onyoonyo wuruewu n'izu gara aga gosiri etu otu nwoke si tọkịrị n'ime nwaanyị ebe ha na-enwe mmekọrịta.

Ndị mmadụ wee si na ọ bụ ọgwụ di nwaanyị ahụ mere jidere ha, ụfọdụ na-asị na ọ bụ n'ihi na ha na-ezuru ezuru eme ya.

Gịnị na-ebute 'Penis Captivus'?

Ihe onyonyo ebe nwoke tọrọ n'ime nwaanyị n'oge mmekọ ahụ

Ebe foto si, Youtube viral

Ndị Yoroba na-akpọ ya 'magun'.

Ihe ndị Yoroba kwenyere maka Magun

  • Ndị Yoroba kwenyere na e ji magun ejide nwaanyị na-agba n'ezi.
  • Ha kwenyere na ọ na-adị n'ụdị na ụdị.
  • Ha kwenyekwara na nwoke ọbụla dinara nwaanyị ọbụla di ya mara magun nwereike ịdakpugharị n'ala ugboro atọ tupu ọ nwụọ.
  • Maọbụ na ha ga-atọkịrị n'elu onwe ha ruo nke ga-emebọ ha

Dkt. Francis Ezenwankwo ọnụ na-eru n'okwu n'ahụike ụmụnwaanyị sị na o kwenyeghi na ọgwụ maọbụ nnsị a, maka na ọ bụ dọkịnta.

Ọ sịkwa na ntọkịrị a abụghị ihe na-eme kwamgbe.

Mana dịka ndị dọkinta si kwuo, ọ sị "ihe na-ebute ntọkịrị amụ n'ime ọtụ - 'penis captivus' - bụ mgbe anụ ọtụ nwaanyị na-akpadosie amụ nwoke ike nke ga-eme na amụ nwoke ahụ agaghị enweike rituo na ọtụ nwaanyị ahụ."

"Nwoke na nwaanyị ga-atọ na mmekọrịta ha. Mana ọ bụghị oge ọbụla ka ọ na-eme."

Ọ sị na ọ hụbeghi ihe dị etu a kamgbe o bidoro rụwa ọrụ dịka dọkịnta.

Mana Dkt Ezenwankwo bụ Obs na Gynae na-agwọ ụmụnwaanyị sị na o nweghi ihe gbasara 'penis captivus' na ịta mmadụ amusu, iji ọgwụ jide mmadụ, maọbụ 'ihe onye chọ ka ọfụ n'ịgba n'ezi'.

Ọ sịkwa na o nweghi ihe na-ebute ya ha ma.

Dkt Ezenwankwo sị na o kwenyeghi n'ịgwọ ọgwụ.

'Penis Captivus' o nwere ọgwụgwọ?

Gịnị na-ebute 'Penis Captivus'?

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Gịnị na-ebute 'Penis Captivus'?

Ebe ọtụtụ dọkinta na-asị na ha ejibeghị anya ha hụ ebe o mere mmadụ mbụ, otu nwaanyị kwuru na o meela ya mgbe ya na di ya na-enwe mmekọrịta.

Ọ sị na ọ bụ mgbe o ruru oge aramara ahụ tọbara ya ụmị.

N'ọnụ nwaanyị a, "ọ bụ etu ọtụ m sị nabata oke ụtọ aramara".

Gịnị ka i ga-eme ma ị tọkịrị n'ime nwaanyị?

Ihe mbụ ndị nwere 'penis captivus' kwesịrị ime bụ

  • Ikpoku ndị ọrụ ahụike maka ịgbatara ha ọsọ enyemaka.
  • Nọrọ jụụ
  • Awụkwala mmanụ
  • Ejikwala ike esepụ amụ ka ọ ghara igbaji maọbụ imeru nwaanyị ahụ

Ihe ndị a ka Dkt Ezenwankwo na-agwa onye ga-ahụ onye ya n'ọnọdụ a.

Mana Dkt John Dean, bụ dọkịnta kajara akaja n'ihe gbasara mmekọrịta nwoke na nwaanyị na mba UK, kwuru si, "ọtụtụ ndị na-abịa ọgwụgwọ agwala ya maka ahumihe ha n'ịtọ n'ime ọtụ nwaanyị".

Ọ sị na o nwere ndịiche dị n'etiti 'penis captivitus' na nke na-emekarị ụmụnwaanyị ana-akpọ 'vaginismus'.

Gịnị bụ 'Vaginismus'?

Ajị mgbada

Dkt sị na ọ bụ nwaanyị achọghị mmekọrịta, ọtụ ya ga-akpuchi onwe ya.

A ga-enye nwaanyị ahụ 'dilators' ga-enyekwa ya aka imepe ọtụ ya.

Dkt Dean sị 'vaginismus' na-eme mgbe ọtụ nwaanyị kpachiri onwe ha (tupu amụ nwoke abata), nke agaghị ekwe ka o nwee mmekọrịta ọbụla.

Otu onye kpọrọ onwe ya Paul gwara BBC na o mere ya sị, "Anụtụla m akụkọ a mgbe m dị 14 maọbụ 15 maka otu nwoke tọkịrị n'ime nwaanyị.

Ọ sị na ha mechara kpọọ ndị ọrụ gbatagbata, ha wee nyere ha aka.

Paul sị na o mechara hụ nwaanyị ọ hụrụ na-anyana mba Japan, ha wee na-enwe mmekọrịta.

N'otu ụbọchị, o wee tọkịrị n'ime nwaanyị a ka ha na-enwe mmekọrịta.

"Ihe niile wee kwụsị ka m tọrọ n'ime nwaanyị a, anyị wee sị na ọ ka mma ka anyị kwụsị, mana ha enweghike ịpụta ka ha nwara ugboro atọ."

"Anyị wee mụwa amụ, n'ihi na ọfụghị anyị ụfụ." Ka Paul si wee cheta, ugbua, Paul dị afọ iri asaa na ise (afọ 75).