Ị kwesịrị ịsụcha 'Pubic Hair' gị?

- Onye dere ya, Chris Sanctus Okereke
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
Onweghi onye okorobịa maọbụ agbọghọ na-enweghị "ọhịa" "n'adazianị". Ihe dị mkpa bụ ka i si abọcha maọbụ ebu ya bụ "ọhịa".
Ọtụtụ mmadụ kwenyere na ịkpụ ajị mgbada na-adị mma, ụfodụ sị na ọ ka mma iruwe ya.
Kedụ nke bụ eziokwu?
Taa ka anyị ga-ama nke bụ nke.
Ọ na-adịrị anyị mfe ikwu maka ajị ihu maọbụ aji ahụ ndị ọzọ, mana o ruo n'ajị ọtụ maọbụ aji amụ, ọnụ amawa anyị ririri.
Ọ ga-abụ ya mere muchi muchi jiri karịa n'okwu gbasara aji ọtụ na ajị amụ.
Mana taa anyị ga-agba ya n'anwụ ịmata ihe zoro ezo n'okpuru anyanwụ n'okwu ajị "adaziani" n'etiti nwoke na nwannyi.
Nchọpụta e mere na mba Amerịka na-egosi na ịkpụ ajị a abụghị naani ihe Naịjirịa, kama na mba Amerịka, n'ihe karịrị ụmụnwaanyị pasent iri asatọ na-akpụ ajị mgbada ha, ebe pasent iri ise n'ụmụnwoke na-akpụkwa nke ha.
Dịka nchọcha ha mere n'afọ 2017 siri kwuo, ọtụtụ mmadụ ruru 15% na-emerukwa onwe ha ahụ be ha edozi "adazianị" nke ụmụnwaanyị ka n'ime ha.
Valentine Udora bụ dọkịnta Bekee n'ụlọọgwụ UNTH Enugwu sị na mmadụ asaa maọbụ asatọ n'ime ụmụnwaanyị iri na-abịa nleta n'ụlọọgwụ na-akpụcha aji mgbada ha.
Mana dọkịta Udora dokwara anya na e kwesiri ị na-akpachapụ anya mgbe e ji agụba eje na mgbada.
Nchọpụta gosiri na imerụ ahụ site ịkpụ ajị mgbada na-akakwa njọ na ndị gbagolitegoro n'afọ.
Ọ bụrụ na ha merụọ ahu, ọ na-ara ahụ ịla.

Ebe foto si, Doctor Valentine Udora
Ọ sị na ebe ọka njọ bụ ịkpucha aji niile dị onye ahụ n'ahụ.
O kwuru na o nwere uru aji mgbada bara ọkachasị n'ahụ nwaanyị.
Uru ajị mgbada bara:
- Nke mbụ, ya bụ ajị n'eme ka mmekọrịta nwoke na nwaanyị tọọ ụtọ.
- Ọ na-emekwa ka nje ghara ịba nwaanyị n'ime ahụ ya site n'ọsịsọ kwobenye ya n'ahụ were bute ọrịa a na akpọ "Virginities", "pelvic inflamatory disease" na Bekee - bụ ụfọdu nje na-eme ka ihe na-asuputa nwaanyị na ahụ.
- Ọ nakwa enye aka igbochi ikwoche ahụ mgbe nwoke na nwaanyị na-emekọrịta.
- Udora sị na ya bụ aji 'adaziala" na-enyekwe aka ịkpalite ụfọdụ mmụọ nwoke.
- Ọzọ bụ na aji na-enyekwa aka ịkọwa ọrịa na-eme ụmụnwaanyị. "Ịkpụchapụ aji a na-eme ka ịchọpụta ya bụ ọrịa teetu aka", dịka Udora kwuru.










