Ụzọ ọgbara ọhụrụ ise ị ga-eji hazinwu ọmụmụ gị

Okpunnabuenyi nke nwoke

Ebe foto si, Getty Images

Etu ihe si kwụrụ n'ụwa ugbua emeela ka ọtụtụ di na nwunye wetulata aka n'etu ha si amụ ụmụ ma ha lụchaa onwe ha.

N'oge mbụ, di na nwunye na-amụtacha ụmụ ruru asatọ (8), iri na abụọ (12) maọbụ karịa mana nke ahụ bụzị akụkọ ifo makana ihe agbanweela.

N'agbanyeghi ihe isi ike dị ugbua, ọ na-ewute ụfọdụ ụmụnwaanyị na ime na-aghọ ha na di ha aghọ (ime akpaghị akpa).

Ụfọdụ gwara BBC Igbo na ha amaghị ụzọ maọbụ ọgwụ mgbochi ga-enyere ha aka ihazi ọmụmụ ha.

Dọkịta na-ahụ maka ihe gbasara ahụike ime ahụ ụmụnwaanyị bụ dtk. Akinde Joseph gụpụtarala anyị ụzọ mgbochi ime ọghọm ruru isii, nke di na nwunye nwereike sị na ha ghọrọ nke dị ha ahụ mma.

O kwuputekwara obere ọghọm sokwa ha.

Mana onye ndụmọdụ na-ahụ maka nhazi ọmụmụ aha ya bụ Samuel, kwuru na ọghọm adịghị n'ụzọ ọhụrụ ndị a eji ahazi ọmụmụ, kama na ndịiche dị n'ahụ ụmụnwaanyị nwereike ime ka ihe gbanwetu ma bịaghachị etu ọ dị na mbụ ma otu maọbụ ọnwa abụọ gachaa.

1.Okpunnabụenyi (Kọndom na Bekee)

Okpunnabuenyi nke nwoke na nwaanyị

Ebe foto si, Google

Dịka aha ya siri dị, a na-eyinye ya bụ okpu rọba n'amụ maọbụ n'ikpu tupu nwoke na nwaanyị enwee aramara.

Dkt Akinde kwuru na e nwere okpunnabụenyi nke ụmụnwoke ma nwekwaa nke ụmụnwaanyị.

O kwuru na okpunnabụenyi magburu onwe ya na mma makana ọị na-echete goolu ọfụma (ọ na-egbochi ịtụ ime) ruo pasenti iri itoolu na asatọ.

Ọ na-enyekwa aka igbochi ọrịa a na-esikari n'aramara ebute.

Ebe a na-enweta ya:

Ị ga-enweta okpunnabụenyi n'ụlọ ahịa, ebe a na-ere ọgwụ maọbụ na nkịtị n'ụlọọrụ ndị na-ahụ maka nhazi ọmụmụ.

Ọghọm

Ọghọm na-adịkarị n'okpunnabụenyi nke ụmụnwoke bụ na ụfọdụ oge ha agaghị eyite ya ọfụma maọbụ aramara tọkụrụ ha, ha anyụọ n'ike tupu ha eyinye ya bụ ihe.

Ọzọ bụ na ụfọdụ ụmụnwoke na-asị na ụtọ aramara anaghị aba ha ahụ maọbụrụ na ha eyighi okpunnabụenyi ọfụma.

2. Ọgwụmgbochi afọ ime e si n'ọnụ aṅụ

Mkpụrụ ọgwụ

Ebe foto si, Getty Images

Nke a bụ ọgwụ a na-aṅụ aṅụ e si n'ụfọdụ kemikalụ na-edozi ahụ emepụta.

A na-aṅụ ya kwa ụbọchị.

Ọ na-egbochi afọ ime akwadoghị ọfụma.

Ebe a na-enweta ya

Dkt Akinde kwuru na ị ga-aga ahụ dọkịta ka ọ were aka ya nye gị.

Ọghọm

Ọ bụrụ na ị bụghị onye na aṅụkarị ọgwụ kwa ụbọchị, ị ga-enwe nsogbu makana ụbọchị ị na-aṅụghị ọgwụ mgbochi ya, afọ ime nwereike ịghọ gị dịka dkta Akinyemi si kwuo.

3. Ọgwụmgbochi eji ntt agbanye

Nwaanyị bịara ịnara ntutu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwaanyị bịara ịnara ntụtụ

Nke a bụ ọgwụmgbochi a na-eji ntụtụ agbanye n'ahụ kwa ọnwa atọ maọbụ abụọ ọbụla.

Nwaanyị kwụsị igba ya, ọ ga-echeriri ruo ọnwa isii tupu ọ tụrụ ime.

Ọ na-egbochi ntụrụ afọ ime.

Ebe a na-enweta ya

Dkt kwuru na ọ bụ dọkịta gị ga-eji aka ya gbaa gị ntụtụ a.

Ọghm

Ọ na-eme ka nsỌ nwaanyị ghara ị na-apụta mgbe o kwesiri.

4.Ọgwụmgbochi a na-etinye n'ime ahụ

Nwaanyị bịara ụlọ gwụ ka ele ihe etinyere ya n'ahụ maka nhazị ọmụmụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwaanyị bịara ụlọọgwụ ka e lee ihe e tinyere ya n'ahụ maka nhazi ọmụmụ

Nke a bụ ụdịrị a na-ewere tinye n'ime ahụ ruo ogologo oge dịka afọ atọ maọbụ afọ ise.

Dkt Akinde kwuru na anaghị eme ya eme ya dịka ọgwụmgbochi ndị ọzọ gụnyere na nwaanyị ga na-eme ihe dị na ya kwa ụbọchị.

Itinye udiri a, ị gawara onwe gị ruo mgbe a ga-eji wepụ ya.

Ọ na-egbochi afọ ime ọfụma ọfụma.

Ebe a na-enweta ya

A na-aga n'ụlọọgwụ ka dọkịta were aka ya tinye ya.

Ọghm

Ị ga-echeriri ka ọnwa isii gafeecha iji wepụ ya tupu ị tụrụ ime.

Ụfọdụ oge ọ na-eme ka nsọ nwaanyị dagharịa adagharịa.

5.Ọgwụmgbochi a na-etinye n'akpa nwa

Igwe a na-etinye n'akpa nwa

Ebe foto si, Getty Images

Nke a bụ obele igwe a na-tinye n'ime akpa nwa nke bekee kpọrọ (Intrauterine device).

Ọ na-ahazi ọmụmụ ọfụma.

Ebe a na-enweta ya

A na-aga n'ụlọ ọgwụ, wara ya obere ahụ tupu dọkịta etinye ya n'ahụ.

Ọghọm

Ọ bụrụ na nwaanyị etinyere ihe a n'ahụ ya nwere nje n'ime ahụ ya, ọ ga-emetụta ọmụmụ ya n'ụzọ dị njọ.

Ọ bụrụ na nke nwoke ya na nwunye ya na-edina nwere ọtụtụ ụmụnwaanyị nọ n'iro ya na ha na-eme aramara, ụzọ a agaghị adabachara nwunye ya ọfụma makana nwoke ahụ nwereike ibute nje n'ahụ ụmụnwaanyị ndị ọzọ ahụ.

Dkt Akinde kwuru na nke a ga-eme ka ọgwụmgbochi nke akpa nwa merụọ nwunye nwoke ahụ ahụ.

Ọ na-ebute nsọ nwaanyị ị na-agba karịa etu o kwesiri i si na-agba, mana ọ gaghị emete ya aka.

Uzọ ndị a nwereike ịgbajọ gị

  • Nhazi nke na-esi n'inye nwa ọhụrụ ara

Dkt Akinyemi kwuru na nwaanyị na-enye nwa sọsọ ara ruo ọnwa isii ka ọ mụchara nwa ọhụrụ nwereike ịlafere itụrụ ime ọghọm.

Mana ọ gafee ọnwa isii ahụ o ji mụchaa nwa ọhụrụ, ọ ga-atụrụ ma ọ mee aramara.

  • Nhazi nke gụnyere izere aramara ụbọchị nwaanyị na-eyi akwa(ovulation). Samuel kwuru na nke anaghị arụcha ọrụ ọfụma
  • Nhazi nke gụnyere nwoke iwepụ amụ ya n'ike ma ọ chọrọ inyụnye uhe n'ahụ ụmụnwaanyị

Ndụmọdụ dọkịta na-enye

Dọkịta Akinde kwuru na tupu nwoke na nwaanyị ya ahọrọ nhazi ọmụmụ ọbụla ọ ga-adị mma ka ha na dọkịta na-ahụ maka ime ahụ nwaanyị na ọmụmụ kpaa maka ya.

Onye ndụmọdụ nhazi ọmụmụ aha ya bụ Samuel kwuru na ụzọ ndị ọhụrụ eji ahazi ọmụmụ na-arụrụ ọrụ ruo paseenti 98 maọbụ 96.

O kwukwara na ọ dị mma ka ụmụnwaanyị chere ruo abali asaa ha ji mechaa nhazi uzọ ọhụrụ ndị a tupu ha emewe aramara.

N'ikpeazu, ụfọdụ ndị ekwenyeghị n'ụzọ ọhụrụ ndị a eji ahazi ọmụmụ mana onye ndụmọdụ Samuel na-ekwu na e kwesighị ịgbagha nhazị ndị a makana ọ naghị egbochi nwaanyị itụrụ ime kama ha na-ahazị ọmụmụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: