Urine Cup: Iko ga-eme ka nwaanyị nyụọ mamịrị ka nwoke

Otu nwaanyị Kenya na-eweta usoro e nwereike iji gbochie nsogbu ibute ọrịa site n'ụlọmposi ọha nke na-adịghị ọcha.
Njeri Muthaka na-ere iko mamịrị nke na-enyere ụmụnwaanyị aka ịkwụ ọtọ nyụọ mamịrị ka ha ghara ịnọ ọdụ n'ụlọmposi bute ọrịa.
Muthaka gwara BBC na o bubatara iko mamịrị a mgbe ọ rịachara ọrịa si na mamịrị ọtụtụ oge.
O ji ya nyụọ mamịrị ma chọpụta na o nyere aka belata etu o si ebute ọrịa a, nke mere o ji malite ire iko a.
Ndị dọkịnta kwetere sị na iko mamịrị a na-enye aka ibelata ibute ọrịa.
"Ọ bụrụ na ị naghị etukwu ala anyụ mamịrị, ị gaghị eru ụlọmposi nso nke pụtara na ị gaghị eji ike ebute ọrịa.
Ị ga-egbochi ibute ọtụtụ nje dị iche iche," dịka dọkịnta Chris si kwuo.
Mana ụmụnwoke ndị Kenya sị na iko a megidere omenala ha.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:










