US Medical: Gịnị mere ụmụnwaanyị Naịjirịa ji agbaga US ịmụ nwa?

Nwa a mụrụ ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Nwanne ị ma ihe mere ụfọdụ ndị Naịjiria aga ịmụ nwa n'Amerịka?

Ị nwereike ịjụ ihe mere anyị ji ajụ ajụjụ a ma ọ bụrụ na ị nụbeghi na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-akwado imachi ndị na-esi mba ọzọ abịa amụ nwa na mba ya.

O kwuru na tupu i tinye akwụkwọ inweta ikike ịbịa Amerịka mụọ nwa, ị ga-egosiputa na ị nwere ego na mmasị ịkwụ ụgwọ ụlọọgwụ gị nakwa gosi onye na-enye 'visa' na gị na dọkịta ekwekọrịtala maka nlekọta gị.

N'ihi atụmatụ a bụ ihe Bekee kpọrọ 'anchor baby', ọtụtụ ndị mba ọzọ amụtala ụmụ ji akwụkwọ ikike na-egosi na ha bụ ndị mba Amerịka n'agbanyeghi na ha bụ ndị mụrụ ụmụ ahụ ji akwụkwọ si mba ọzọ.

Ọtụtụ ndị Naịjirịa sokwa na ndị a na-aga amụ nwa na mba Amerịka, mana kedụ ihe mere ha na-eji aga?

Ihe mere ụfọdụ ụmụnwaanyị Naịjirịa ji amụ nwa n'Amerịka:

1) Nlekọta ahụike ka mma:

Priscilla
Nkọwa foto, Priscilla hụrụ onwe ya n'ụlọọgwụ dị na mba Briten kama Naịjirịa dịka o si Amerịka na-ala

N'afọ 2017, BBC gosiri etu otu nwaanyị Naịjirịa si mụọ ụmụejima anọ n'ọdọụgbọelu dị na mba Briten ka o si Amerịka na-alaghachi Naịjiria makana a chụghachịrị ya azụ.

Ka ọ mụchara nwa, o jide ụgwọ ruru paụnd puku narị atọ na iri atọ.

Nwaanyị a kwuru na dọkịta ya gwara ya na ọ ga-akara ya mma ịmụ ụmụ ya ndị a n'ala Bekee; ebe e nwere ụlọọgwụ dị mma ebe a ga-enwe ike ilekọta ya ọfụma.

N'ihi ezigbo ụlọọgwụ na nlekọta ahụike ka ọtụtụ ndị na-eji achọ ka ha gbaga Amerịka gaa mụọ nwa.

2) Ịnata akwụkwọ ikike:

Akwụkwọ ikike mba Amerịka

Ebe foto si, Getty Images

Ihe ọzọ na-eme ka ndị mmadụ na-agbaga Amerịka ịmụ nwa bụ ka nwa ha nwee ikike ịza onye Amerịka.

Onye ọbụla ma na onye ọbụla ji akwụkwọ ikike njem Amerịka bụ passport' na Bekee, abụrụla onye mba ahụ; otu ụzọ na-araghị ahụ iji nweta ya bụ ịbụ onye a mụrụ n'ala ahụ.

Uru dị na ya nye gị bụ nne na nna si mba ọzọ mụọ nwa ebe ahụ bụ na nwa gị tozuo afọ iri na asatọ (18), o nwereike itinye akwụkwọ n'aha gị ka gị na onwe gị nweta akwụkwọ ikike ịbụkwa onye mba ahụ.

3) Ọ bụ ihe 'nganga':

Ụfọdụ ndị agaghị ekwe akpọ okwu aha, mana ihe mere ha jiri gaa mba Amerịka ịmụ nwa bụ ka ha nwee ihe ha ga-eji tuo ọnụ ma ọ bụ nyaa isi.

N'ihi ohere ime "ị makwa ndị anyị bụ", ụfọdụ na-ebiri ego ha ga-eji gbaga mba Amerịka mụọ nwa.

Ụfọdụ oge, ndị Amerịka na onwe ha agbasaala akụkọ na-egosi na ụfọdụ ndị abịala mụọ nwa ma jide ụlọọgwụ ndị Amerịka ụgwọ.

Lee ụfọdụ ndị a ma ama na Naịjiria mụrụ ụmụ ha n'Amerịka:

1) Kenneth Okolie

Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 1

2) Daniel K Daniel

Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 2

3) Ruth Kadiri-Ezerika

Skip Instagram post, 3
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 3

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ndị e ji n'ụlọọgwụ maka akwụghị ụgwọ ka ha mụchara nwa