Nigerian men: Etu e si ama dimkpa Igbo nwere ogologo imi

Ebe foto si, Instagram/AlexxEkubo
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Ndị Igbo na-ekwu na a hụ dimkpa a hụ ogologo imi ya.
Ebe ọhanaeze Igbo na-esi n'ụzọ gụnyere ịba mmọnwụ, ichi echichi, ịlụ nwaanyị wdgz egosipụta onye bụ dimkpa Igbo, akụkọ a na-egosipụta etu ị ga-esi amata dimkpa site n'akparamagwa.
Ihe ọzọ ga-eme ka i kwere n'ihe na-egosipụta onye bụ 'ezigbo nwoke Igbo' bụ ihe otiegwu a ma dịka Phyno gụrụ n'egwu ya sị "Ị narọ afụ dimkpa, ị nụ isi ego".
O gosiri na e nwere ụfọdụ agwa nwoke ga-akpa i jiri ya mara na ọ bụ nwoke 'tozuru etozu' ka gị na ya na-emekọ ihe.
Mana a bịa n'ala Igbo, kedụ akparamagwa ndị ị ga-eji sị na onye a bụ "dimkpa"?

Dimkpa Igbo nwere ogologo imi
1) Nganga
Ezigbo dimkpa Igbo nwere ogologo imi na-enwe nganga n'ihi na o kwenyere na onwe ya juru ya afọ.

Ebe foto si, Instagram/Noble_Igwe
N'ihi nganga a, kama ọ ga-adara gị n'ala ịrịọ gị arịrịọ ọkachasị ebe o kwetara na o mejọghị gị, ọ kara ya mma na ọ gbaara ọtọ pụọ ahịa. n'ihi na ọ na-akwụ na nkwenye ya.
Kama n'otu aka ahụ, ọ na-ara ahụ ịhụ ebe ọ na-eme "mere mere n'ihu gwọmpịtị n'azụ". Ọ ga-agwa gị eziokwu ma kwụrụ n'ihe o kwuru.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ụzọ ọzọ ha na-esi egosiputa nganga a bụ site n'ọnọdụ nwunye na ụmụ ha.
Ọ bụrụgodu nwoke na-agaghị akwụkwọ, ọ ga-achọ ịlụta nwunye gụrụ akwụkwọ ma chọkwaa ka ụmụ ya gụọ akwụkwọ makana ọ ga-abụrụ ya ihe o ji anya isi.
Ka ọ bụzị etu ha nwereike na-efegharị n'elu ọgbatumtum ma zụọrọ nwunye ha ụgbọala chara chara?
2) Ịgba mbọ:
Dimkpa Igbo ma ihe ekwe na-akụ anaghị eche ka ị nyere aka tupu ọ gbawa mbọ.

Ọ na-ejiri aka ya achụta enyemaka nke ya.
Dimkpa Igbo nwere ogologo imi na-ekweta na ebe ndụ dị, olileanya ka dị.
Ị ga-ejiri ihe a mere n'ahịa ọchanja ebe ndị ahịa akwụghị n'akụkụ na-eche ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka tupu ha ewulitewe ahịa ahụ gbara ọkụ, mara.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ọzọ bụ etu ha si tụtụrụkwa ndụ ha ebe ọ kwụsịrị mgbe agha Biafra biri n'afọ 1970, gbawakwa mbọ ihazi onwe ha.
3) Ịsọ mmegbu:
Dimkpa Igbo nwere ogologo imi anaghị ekwe ekwe, ọkachasị ma ọ bụrụ onye chọrọ imegbu ya.
Ọ gaghị achọ ka ị ghọgbuo ya, makana ya na onwe ya ebughi n'obi ịghọgbu gị.
Ọ na-achọ ka ị nwee ntụkwasị obi n'ebe ọ nọ, makana o mezie gị ọfụma, ị ga-emezikwa ya ọfụma.
4) Ịlụzi nwaanyị:
Dimkpa Igbo na-alụzi nwaanyị ọfụma etu ịhụnanya ga-esi gụọ gị agụụ.

Ebe foto si, Instagram/Henry Onyekuru
Ọ bụ na ị nụbeghị na ọ bụrụ na ị chọrọ ịma nwoke Igbo ji ego i buru ụzọ lee nwunye ya anya?
Nwoke nwere ike ị na-ata ahụhụ, na-eri nri naanị otu ugboro n'otu ụbọchị, mana ọ ga-agba mbọ hụ na nwunye ya riri nri ma yiri ezigbo akwa.
Gịnị ka ị che mere e ji akpọ nwaanyị "oriakụ" nakwa "odoziakụ"?
Akụkọ ndị a ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:









