Father's Day: Ihe ise ị ga-emenwuru ụmụnwoke nọ na ndụ gị taa

Ebe foto si, Instagram/Genevievennaji
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ị ma ihe ndị ị ga-emenwuru nna, di, enyi nwoke, deede maọbụ enyi gị nwoke taa?
BBC Igbo chọrọ inyere gị aka gwa gị ihe ndị ị ga-ejinwu mee ha obi aṅụrị n'ọdịniihu.
Ọtụtụ oge ka ụmụnwoke na-ekwu sị "oge niile ka ọ bụ ụmụnwaanyị ka a na-akwanyere ugwu. Gịnịkwanụ ka a na-emere ụmụnwoke iche?"
Taa bụ ụbọchị ncheta ndị nna, lee ihe ndị ị ga-emere ha na ụmụnwoke ndị ọzọ nọ na ndụ gị.
1) Kwụọrọ ya ụgwọ nri:

Ebe foto si, AFP
Ọrịa coronavirus achụbala onye ọbụla n'ime ụlọ mana o kwesịghị ịkwụsị gị n'imere nna, di, nwanne maọbụ enyi gị nwoke ihe ọma taa.
Ọ bụrụ na gọọmentị amachighi ịnọ n'ụlọ oriri na nkwari eri nri ugbua, agaara m asị gị kpọrọ ha gaa ebe a na-ere nri nke Bekee kpọrọ "fast food joint/restaurant", zụọrọ ya nri ma kwụọ ụgwọ ya.
Mana nke ahụ akwụsịla gị o, n'ihi na ị nwere ike "ịtụ order" ka onye ọzọ sie nri dịka nri emume pụrụ iche, butere naanị ya.
Ihe dịka nke Bekee kpọrọ "Breakfast in bed" na-aga ahịa n'ụdịrị ụbọchị a.

Ebe foto si, Odunayo Oyebolu
Makana ụfọdụ oge ka ụmụnwoke na-ekwukarị na oge ọbụla naanị ha na-azụrụ ụmụnwaanyị ihe, mana ị kwụọ ụgwọ nri ahụ, ọ ga-atụ ya n'anya.
Ọ bụrụ na ị chọghị ịtụ order nri, zụta ngwanri ị ga-eji esiri ya nri ọ kacha hụ n'anya.
2) Were 'ihe nsori' merụọ ya ahụ:

Ebe foto si, Getty Images
Nke a bụkwa naanị maka ndị lụrụla di oo ;-)
Iji sị ya na ọ gbalịala ma sị ya na ihe ọ na-eme na-amasị gị kwa mgbe, nabata ya ma ọ lọta ma gosi ya na ị chere ya eche.
Gaa n'ihu nye ya n'ụdị ị na-enyetubeghi ya mbụ, nke ga-eme ka ọ ghara ichefu ụbọchị a echefu.
3) Tinye ego n'akpa ha:

Ebe foto si, Getty Images
Ma ị na-arụ ọrụ ma ị naghị arụ, chọọrọ ya nwaobere ihe, nke ga-eme ya obi aṅụrị.
Sị ya "mpa m; di m; enyi m nwoke; nwanne m nwoke; deede m; ngwa were nke a tinye mmanụ n'ụgbọala gị, were nke a tinye ego n'ekwentị gị maọbụ were nke a gbaa ụgbọala ruo ebe ị na-aga".
Ọ gaghị echefu ụbọchị a echefu ma ị mee ya, makana ọ ga-abịa dịka ihe ọ na-atụwaghị anya.
4) Deere ya akwụkwọ ozi:

Ebe foto si, Getty Images
Nke a abụghị iji zie ya ozi mgbakasị ahụ, kama ọ bụ ebe ị ga-agwa ya ihe niile ọ na-emeta ebe ị nọ.
Ọ bụrụ di gị, gwa ya etu o si elekọta gị na ụmụ gị na etu o si emetụta gị n'obi, ọ bụrụ nna gị, kelee ya maka etu o si zụlite gị nakwa ihe ndị ị mụtara n'aka ya nakwa ihe ọma ọ na-emere gị.
Gwa ya ihe ndị ọ na-eme na-amasị gị na etu o si eme ka ndụ tọọ gị ụtọ.
Gwa ya na ị hụrụ ya n'anya, na ọ bụghị itu ọnụ.
I nwekwara ike iji ekwentị gị zie ozi a, mana nke e dere n'akwụkwọ nwere ike ịka mma n'ihi na ọ ga-adị ka "love nwantịntị".
5) Nye ya ohere:

Ebe foto si, Getty Images
Anyị asịghịkwa gị kwapụrụ ya n'ụlọ oo. Ihe anyị na-ekwu bụ gị nye ya ohere ka ya na ndị enyi ya nọkọọ ma nwee aṅụrị.
Ọ bụrụ na ị na-eleburu ya elekere ma ọ pụọ apụ (ya bụ na ị na-enyo ma ọ lọtara n'oge maọbụ ọ lọtaghị), hapụrụ ya ka ya na ụmụnwoke ibe ya mee naanị ụdịrị ihe na-amasị ha taa.
Ị hụlanụ na ihe ise ndị a agaghị efu gị oke ego, mana ọ ga-eme ka nwoke ahụ nọ na ndụ gị ghọta na ị hụrụ ya n'anya.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










