Paul na Peter Okoye na ụmụnne ndị ọzọ na-eme otu ihe mana ha anọkọghị ọnụ

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ụfọdụ ndị ka na-arịọ Paul na Peter Okoye bụ ụmụejima na-agụkọbu egwu dịka "Psquare" ka ha bịaghachite taa bụ ụbọchị ọmụmụ ha.
Ụmụejima a mụrụ n'ụbọchị 18 nke ọnwa Nọvemba 1981, kwụsịrị ịkụkọta egwu ọnụ n'afọ 2017, mana ha ka na-amasị ndị mmadụ.
Ụfọdụ ndị mmadụ kwuru na n'ihi na ha gụkọrọ egwu ihe karịrị afọ iri, na ha ekwesịghị ịgbasa, ọkachasị etu a ha bụ ụmụnne.
Mana ọ bụ naanị ha bụ ụmụnne nwere otu ụdịrị akaọrụ na-anaghị arụkọ ọnụ?
Lee ụmụnne ndị ọzọ na-akwụghị n'otu akụkụ:
1)Paul, Florentin na Mathias Pogba:

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụnne atọ a bụ ndị na-eji ihe ha gbatara n'ụkwụ ha akpata ego, mana otu n'ime ha ka ndị ọzọ baa ụba.
A bịa n'ime ha atọ, Paul bụ nke na-agbara Manchester United bụ onye bụ "baba udu ego".
Paul a gbaalara ọtụtụ nnukwu otu egwuregwu bọọlụ, mana nke ahụ anaghị eme ka ọ na-elelị ụmụnne ya anya.
Ebe Florentin na Mathias bụ ụmụejima na-agbara mba Gini bụ mba nna mụrụ ha si, Paul bụ onye ha abụọ tọrọ na-agbara mba Frans bụ ebe ha nọ too bọolụ (o so ha bulie Iko Mbaụwa n'afọ 2018).
2) Niniola na Teniola Akpata

Ebe foto si, Instagram/Tenitheentertainer
Ụmụnne abụọ a na-ewu ewu na Naịjiria maka ihe ha na-agụ n'egwu.
Ebe Niniola bụ onye nke tọrọ malitere iwu ihe ruru afọ atọ na anọ gara aga, Teniola nwanne ya selitere isi n'ime afọ 2017 mana ọ bụrụla onye a na-akpụ n'ọnụ kwa mgbe.
Ha abụọ eritela nturuugo maka egwu ha, mana ha agụkobeghị egwu ọnụ nke ha ji ese okwu n'ihu ọha mbụ
3) Kevin-Prince na Jerome Boateng:

Ebe foto si, Getty Images
Otu nna ji Kevin-Prince na Jerome ebe ọ na-abụghị otu nne mụrụ ha, mana ha abụọ anaghị agbakọrọ otu mba bọọlụ.
Ebe Jerome na-agbara mba Jamini bụ ebe a mụrụ ha bọọlụ, Kevin-Prince tọrọ ya na-agbara Gana.
N'afọ 2014 ha zutere n'Iko Mbaụwa, ha banyere n'akụkọ ụwa agaghị echefu dịka ụmụnne mbụ ga-ezute ma sukọta isi n'asọmpi Iko Mbaụwa.
4) Eden, Thorgan na Kylian Hazard:

Ebe foto si, Getty Images
Eden bụ onye gbarala otu egwuregwu ndị aha ha na-ada ụda bọọlụ, o jirikwala ụkwụ ya gbata ọtụtụ nturuugo.
Ka aha ya ka ada ụda, ka ego ọ na-akpata kakwa nke ụmụnne ya ada ụda.
Eden bụ diọkpara na-agbara Real Madrid bọọlụ, mana ọ gbarala Chelsea bụkwa nnukwu otu egwuregwu bọolụ.
Mana Thorgan na-agbara Borussia Dortmund bụkwa otu nwere aha bọọlụ, mana Kylian na-agbara Cercle Brugge.
5) Granit Xhaka na Taulant Xhaka

Ebe foto si, Getty Images
Xhaka nke gịnwa na-agụ akụkọ a nwereike ịma bụ Granit, bụ nke na-agbara Arsenal bọọlụ.
Mana ị ma na o nwere nwanne ọzọ na-agba bọọlụ?
Ụmụnne abụọ a amụrụ na mba Swizaland amaghị ihe bụ 'nwanne' ma ha zute n'ọgbọegwuregwu.
Nne na nna ha bụ ndị mba Albenia, mana ebe Granit na-agbara mba Swizaland bọọlụ, ọ bụ Taulant nke tọrọ ya bụ onye nke na-agbara Albenia bọọlụ.
Ndị ọzọ
Ndị gụnyere Sone na Eniola Aluko. Ebe Sone gbaara Naịjirịa bọọlụ n'afọ 2009, Eniola nwanne ya esorola mba Briten gaa asọmpi Iko Mbaụwa abụọ na Olimpiks.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:










