Fasting: Ibu ọnụ ruo abalị 40 ọ na-egbu mmadụ?

Ebe foto si, Getty Images
Ibu ọnụ na-abụkarị atụmaatụ ndị okpukpere dị iche iche ji akwado ekpere ha.
Mana ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu na o nwere ụdịrị ibu ọnụ ga-abụ mmadụ mee, o butere onwe ya nsogbu.
Ụkọchụkwụ Paul Chikwem bụ onyeisi n'ụlọụka Christian Pencticostal Church dị na Festac kwuru na ibu ọnụ dị mma maka onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye nke Kraist.

Ebe foto si, Getty Images
O kwuru na ibu ọnụ dị n'ụdị n'ụdị dịka nke gụnyere isi n'ụtụtụ ruo na mgbede, iṅụ sọ mmiri , iri sọ ụfọdụ nri nakwa etu ọbụla onye na-achị ya si kpata.
Mana ọ dụrụ ọdụ sị na ibu ọnụ karịghala nke a ga-ebi ụbọchị ahụ maọbụ gụnye erighị aṅụghị ma ncha ruo ihe gafere ụbọchị iri abụọ na otu, e kwesiri ịkwadoro ya ọfụma site n'ime ihe ndị a.
- Inyocha ahụ gị n'aka dọkịta ga-agwa gị ma ị ga-emeli ya.
- Ị nọ n'otu ebe ịgaghị na-arụ ọrụ maọbụ na-agbakasị ahụ
- Marakwa maọbụ Chukwu si gị mee ya
- Emeela ya ka iwee maa aka
- Kebie ya ekebi
Akụkọ ga-amasị gị
Ihe nkiri a ga-amasị gị:





