Ihe mere otu ọgbọ, otu ebiri na ndị uke ji baa uru n'ala Igbo

Ndị ikperekpe ọgụ Ohafia

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist Igbo

Ndị Igbo tụrụ ilu sị na a gbakọta aka ọnụ ṅyụọ mammiri, ọ gbọọ ezi ọfụfụ.

Ọ dịka a ga-asị na ọ bụ n'ilu a ka a gbakwasịrị ụkwụ ma hiwe otu ọgbọ n'ala Igbo maka ha kwenyere na Igwe bụ ike.

Gịnị bụ Otuọgbọ?

Maazị Chigozie Nnabuihe bụ onye ọkammụta n'asụsụ nakwa omenala Igbo sị na otu ọgbọ bụ omenala e ji mara ndị Igbo.

"Ọ bụ otu jikọtara ndị a mụrụ n'ime otu afọ maọbụ agbata afọ abụọ ruo afọ anọ mana ọ gaghị akarị afọ ise."

Otuọgbọ ndị ụmụnwaanyị n'emume ịgbọtụọmụ n'Ohafia, Abia Steetị
Nkọwa foto, Otuọgbọ ndị ụmụnwaanyị n'emume ịgbọtụọmụ n'Ohafia, Abia Steetị

Ọ sị na obodo dị iche iche n'ala Igbo nwere etu dị iche ha si eme ya nakwa aha dị iche ha na-akpọ ya dịka "Ndị ebiri, Ndị Uke" dgz.

Otu ọgbọ dị iche nwere aha e ji mara ha nke na-egosi ndịiche nakwa ogogo ha n'otu ọgbọ ndị ọzọ dị n'obodo.

Iji maa atụ: Obinwanne dị n'Arochukwu, Ikenga dị n'Ezeukwu-Alayi, Azummini Udomba dị n'Ohafia dgz.

Kedụ mgbe omenala Otuọgbọ malitere n'ala Igbo?

Otuọgbọ ụmụnwoke na ụmụnwaanyị

Igbo sị na ụwa otu onye ka mma n'ime afọ. Nke bụ na ngwa ngwa a mụrụ mmadụ, mmekọrịta ya na ndị ọzọ ga-amalite.

Otu ọgbọ bụ omenala na-ahụ na mmadụ na ibe ya nwere ezi mmekọrịta, ebe nwata ga-ama ndị ọgbọ ya ma kwanyere ndị ọgbọ tọrọ ya ukwu.

Afọ ole ka a na-adị tozuo ịbanye n'Otuọgbọ?

Nwata malite ito, ya na ụmụaka ibe ya a mụtụ na gburugburu oge ahụ ga-amalite igwukọ egwuregwu mana ọ bụghị mgbe otu ọgbọ na-ebido.

Maazị Nnabuihe sị na otu ọgbọ na-amalite mgbe nwata dị na-agbata afọ iri na abụọ na iri na ise.

Otuọgbọ na-agbọ ọtụọmụ n'Ohafia
Nkọwa foto, Ndị otuọgbọ na-agbọtụ ọmụ n'Ohafia, Abia Steetị

"Ọ bụrụ n'obodo dịka Ohafia a na-asị nwata dị afọ iri na ise ga-agbata nnụnụ iji gosi akpamike." O kwuru.

Ọ gara n'ihu sị na isonye n'otu ọgbọ na-akwụsị mgbe ndị ọgbọ ahụ lara ezumike nka nke ụfọdụ na-akpọ "ịkpọtọ mma" maọbụ "ito ọgbọ".

Mgbe ahụ ha ga-akwụsị ihe ọbụla a kpọrọ ọrụ obodo mana a ga-eji ọrụ ha rụrụ na-echeta ha nakwa akwanyere ha ugwu n'obodo.

Kedụ uru Otuọgbọ bara?

Ndị nne larala ezumike nka n'otuọgbọ
Nkọwa foto, Ndị nne larala ezumike nka n'otuọgbọ

Otu ọgbọ dị iche iche nwere ọrụ gbapụtara ihe ha na-arụ n'obodo bụ nke a na-eji echeta ha na mmalite nakwa nkwụsị otu ọgbọ ha.

Ọrụ ndị a gbakwasịrị ụkwụ n'ọdịmma na ncheta obodo gụnyere;

  • Nchekwa obodo - otu ọgbọ ọhụrụ na-arụ ọrụ dịka ndị nchekwa ndụ na akụnauba obodo
  • Ibuagha megide mpụ na arụrụala dị iche iche n'obodo.
  • Inyere onwe ha nakwa ndi obodo aka.
  • Ime ka udo chịa n'obodo
  • Ọrụ mmepe obodo - Ịrụ ụzọ, ụlọakwụkwọ, ọkụ latrik, ụlọ ozuzu, ịgba mmiri, ịrụ ụlọ obibi dgz.
  • Ichekwa omenala na iwu na-achị obodo.
Aha onyonyo, Traditional Retirement:'Ịgba Ọtaọmụ bụ ihe anyị emepe obodo' - Ndị Amaekpu Ohafia

Ọ bụ uru ndị a na ihe ndị ọzọ mere o ji dị mkpa na nwafọ Igbo ọbụla kwesịrị ịbanye n'otu ọgbọ ọkachasị ndị ntoroọbịa, na-agbanyeghi ma i bi n'obodo maọbụ n'ofesi.

Maka na Igbo tụrụ ilu sị "A na-amara mma n'ụlọ pụọ n'ama".

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: