Bobby Brown: Etu ọnwụ sị napụ ya ụmụ ya na nwunye ya

Ebe foto si, Reuters/Getty.b.brownjnr/Instagrm
Ọnwụ bụ nsogbu ụwa o nweghi onye ga-agbanwenwu mana ọ bịarala oti egwu Bobby Brown ugboro atọ n'ụzọ ọjọọ.
N'ụbọchị Wenzde, akụkọ malitere ịfegharị na Bobby Brown jnr bụ diọkpara Bobby Brown nwụrụ na be ya n'obodo Los Angeles.
Ndị uweojii na-enyocha ya bụ ọnwụ kwukwara na ha echeghi na o nwere onye aka ya dị n'ọnwa nwa Bobby Brown jnr.
Ebe o si kara njọ bụ ụdịrị ọnwụ erughieru abịarala ezinaụlọ Bobby Brown ọrịrị mbụ site n'ọnwụ onye bụbu nwunye ya bụ Whitney Houston nakwa nwa ha bụ Bobbi Kristina.
Whitney Houston

Ebe foto si, Getty Images
Bobby Brown lụburu odogwu n'iti egwu bụ Whitney Houston n'afọ 1992. tupu ha agbasaa n'afọ 2007 ha mụtaRA nwa nwaanyị akpọrọ Bobbi Kristina Brown.
N'afọ 2012 o wuru ewu n'ụwa niile mgbe achọtara Whitney Houston ebe mmiri gbagburu ya n'ime be ya.
Nchọpụta nke e mere gbasara ọnwụ ya gosiri na ọgwụike dị ya n'ime ọbara mgbe nwụrụ.
Dịka ụlọ ntaakụkọ si kwuo, News.com Australia Brown kwuru na ọnwụ Whitney wutere ya nke ukwu n'ihi na ọ ọ na-agba mbọ ịkwụsịi ọgwụ ike ma tụgharịa ndụ ya.
Bobbi Kristina
Boobi Krstina bụ naanị nwa Whitney na Bobby Brown mụrụ n'afọ 1993.
Achọtara ya etu e si chọta nne ebe mmiri gbagburu ya n'ime be ya mgbe ọ dị afọ iri abụọ na abụọ.
Mpụtara nchọpụta emere gosiri na ọgwụike na mmanya ike dịi n'ime ọbara ya.
E buru ya gawa ụlọọgwụ ebe ọ nọ nso n'ọnwụ rue ọnwa ole na ole tupu agbanyụọ igwe na-ekuru ya ume, o were nwụọ n'afọ 2015.
Bobby Jr

Ebe foto si, Instagram/b.brownjr
Achọtara diọkpara Bobby Brown na be ya dị na Los Angeles na mba Amerịka n'ọnwa Novemba afọ 2020.
Ọ dị afọ iri abụọ na asatọ mgbe ọ nwụrụ.
Amabeghi ma ọgwụike maọbụ mmanya ike eso na ihe gburu ya mana nyocha na-aga n'ihu dịka ndị uwoejii mba ahụ si kwuo.
Bobby Brown na ezinaụlọ ya ndị ọzọ
Brown na Kim Ward mụtakwara ụmụ atọ gụnyere diọkpara ya nwụrụ anwụ nakwa La'Princia.
Ọ lụkwara onye na-elekọta egwu ya anya bụ Alicia Etheredge n'afọ 2012, ha amụọ ụmụ atọ.
Nwa ya nwaanyị bụ La'Princia na diọkpara ya bụ Bobby Brown jnr na-emekọ ọfụma dịka nwanne na nwanne.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post









