Igbo culture: Uru i nwere ike irite na nri na-eyi ndị mmadụ izizi Igbo na-eri oge gboo na taa

Akpa, akụ na ụkpana

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Igbo nwere nri, nwekwa nri.

Mana o nwere nri ha na-eyi ndị mba ọzọ izizi n'anya ma na-ebukwa ụfọdụ isi mana n'anya ndi Igbo, ha bụ oke nri.

Dịka ndị ihe nri na-enye na-ahụ dọọ anya siri kwuo, nri ndị a gụnyere akụ, akpankwụ, abụzụ, oke ọhịa na-edozi ahụ dịka ha na-enye 'protein' n'ebe ọ dị ukwuu.

Lee ụfọdụ eri-amịcha-ọnụ Igbo na-eri:

1. Akpa

Akpa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Akpa na-enye 'Protein'

A na-akpọ ya "akpa" maọbụ "akpankwụ". Ụfọdụ na-akpọ ya "akpangwọ, ebe ndị ọzọ na-akpọ ya "akalikpọ. Ndị ọzọ na-akpọ ya "Ụvụvụụ". E nwekwara ndị na-akpọ ya "Apan nkorokoro" maọbụ "Egoro."

Bekee kpọrọ akpa "red palm weevil" mana aha sayensi nyere ya bụ "rhynchophorus ferrugineus".

Akpa bụ ahụhụ a na-ahụkarị n'ugbo maọbụ n'ime ahịa.

Ọ bụ mba dịga n'Asia dịka Vietnam, Cambodia, China, Loas gbasaa rue Yorup na Afrịka ebe ndị Igbo, ọkachasị ndị okenye na ndị bi n'ime obodo, kpọrọ ya nnukwu nri.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Akpa na-adịkarị n'osisi nkwụ maọbụ ngwọ, akụoyibo mana ọ na-ebikwa n'ikpo ahịhịa ebe ọ na-anọ yie akwa.

A ma akpa maka irigbu nkwụ maọbụ ihe ọbụla ọ banyere n'ime ya dịka akwa ya na-aghọ nje Bekee kpọrọ 'larvae'.

Otu nne akpa nwere ike iyi akwa ruru 300 maọbụ 500. Ha na-eto ha na-eri ime osisi nkwụ ganye na ha erigbu osisi ahụ.

Ọ bụ larva ahụ ka ndị mmadụ na-eghekpọ maọbụ nwere ya sie nri.

Oriakụ Margaret Okere kọwara BBC Igbo na mgbe ochie, ndị okenye na-etinye akpa na mmiri hapụ ya nwa oge ka ọ rịgharịa na mmiri nke ha na-azara nye nwa a mụrụ ọhụrụ.

Ọ sị oge gboo a na-eche na "Nwa ọhụrụ ọbụla e nyere ya anaghị arịa ọrịa dịka kansa."

2. Akụ

Akụ

Ebe foto si, Foodrelic

Akụ maọbụ mkpu bụ ahụhụ si n'ezinaụlọ ụchịcha. A na-enwe akụ 'nwoke' na 'nwaanyị' nakwa 'ezenwaanyị'.

Akụ na-adịkarị n'udummiri oge ọ na-apụta ihe ma mmiri zoo bụ oge ha na-ahapụ ebe obibi ha fega ebe ọzọ maka imekọrịta na ibido ezinaụlọ ọhụrụ.

Ụfọdụ agbụrụ gụnyere ndị Igbo na-ahụ akụ dịka nnukwu nri.

Ụfọdụ na-ata ya na ndụ, ụfọdụ na-eghe ya eghe, ebe ụfọdụ ji ya esi ọkpa maọbụ nri ọka.

Ụfọdụ na-ata ya na ndụ, ụfọdụ na-eghe ya eghe, ebe ụfọdụ ji ya esi ọkpa maọbụ nri ọka. Ụzọ ọbụla i siri sie ya, akụ bụ nri na-atọpu isi.

Ụzọ ọbụla i siri sie ya, akụ bụ nri na-atọpu isi.

Mana akụ bụ nsogbu nye ọtụtụ dịka o nwere ike imebi ihe a kọrọ n'ugbo maọbụ mebie ụlọ na ewumewu ndị ọzọ dịka ha nwere ike ịwakpo ụzọ,oche na tabulu gị.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

3. Abụzụ

Ukpana

Ebe foto si, Getty Images

Bekee kpọrọ ya 'cricket'.

abụzụ bụ nri ọzọ Igbo ji emegharị ọnụ. ụfọdụ na-ahụ ya n'ọkụ, ebe ụfọdụ na-eghe ya eghe.

Mana ọ bụghị naanị Igbo na-eri abụzụ. Mba dị na mpaghara Asia ejighị ya egwu egwu dịka ha ji ịzụ ya maka oriri kpọrọ nnukwu ọrụ.

Dịka otu 'Food and Agriculture Organization' siri kwuo, abụzụ nweere 'protein' ọfụma, vitamin,faiba, caalcium, potasium na akọọngwa ndị ọzọ na-edozi ahụ.

4 . Ụkpana

Ụkpana

Ebe foto si, Getty Images

Ụkpana bụ oke nri ndị Igbo na-eri.

N'oge Agha Biafra, ụkpana bụ nnukwu nri eji edochi anụ n'ihi oke ụkọ anụ.

Mana ugbua, ọtụtụ agbahapụla ya, naanị ụmụaka ka ji ya emerụwa ụbọchị n'ala Igbo.

5.Oke ọhịa

Oke

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Oke ọ ga-agọpụli onwe ya na ebubo a?

Oke na ọsọ, ngwere n'ụzọ bụ okwu ma bụrụkwa ụka.

Ndị Igbo ejịghị oke ọhịa egwu egwu dịka ha na-eji ya esi ofe maọbụ tagharịa ọnụ.

Ụfọdụ ka na-eri ya ugbo n'ime obodo.

Kedụ ihe a na-erite na nri ndị a?

Dkta Florence Uchendu

Dọkịta Florence Uchendu nakwa Amaka Ezeoke bụ ndị nri nakwa ihe ha na-enye n'ahụ doro anya(nutritionists) kwuru na nri ndị a bụ ezigbo nri nwere ike ịnọchị anya anụ n'ihi na ha nwere 'protein' n'uju.

Ezeoke sị, "Ọtụtụ nri ndị a anyị na-eleghara anya nwere 'protein' ebe ọ dị ukwu.

"Ọ bụrụ na i tinye ya nnụ, tinye ya ose na mmanụ, tinye ya vitamins inweta ezigbo nri. Nnu nwere iodine,ose nwere vitamins."

Ha tụrụ aro iji ya tikwa nri dịka osikapa, akamụ nri ọka nakwa nrị ndị ọzọ iji nweta ihe ndị na-edozi ahụ zuru oke.

Uchendu kwuru na e nwere ike ighekpọ akụ, kwọọ ya ma gba ya na mkpọ ma na-etinye ya n' akamụ maọbụ were ya mee ịsha n'osikapa jọlọf.

Ugbua ịzụta anụ dịzị ka ịgba akwụkwọ njem mba Amerịka, ọ bụ na o rubeghị oge ndị mmadụ ga-ebido kọwa ugbo ụfọdụ 'anụ' ndị a na-eleghara anya?

Akụkọ ga-amasị gị: