Kedụ ndị bu ụzọ tụgharịa 'Bible' n'asụsụ Igbo?

Martin Luther

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Martin Luther bụ onye mbụ mere ka akwụkwọ nsọ rụo ndị nkịti aka.
    • Onye dere ya, Chigozie Ohaka
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service

Okwukwe ndị ofufe nke Kraịst bụ n'akwụkwọ nsọ ka o hiwere.

Ndị Igbo nwere akwụkwọ nsọ nke e dere n'asụsụ Igbo ha na-eji aka ụka mgbe ọbụla ha zụgọrọ maka nkea.

Kama ọtụtụ ndị mmadụ mamaghị ọnye tụgharịri ya bu akwukwọ nsọ n'asụsụ Igbo.

Akụkọ a ga-agwa gị onye dere akwụkwọ nso n'asụsu Igbo.

Anyị kpọtụrụ ụkọchukwu Chika Okpalaike ọnye bụ ọkammụta n'ihe gbasara ofufe ka ọ tinyere anyị ụche ma gwa anyị eziokwu opnye ọ bụ ya dere akwụkwọ nsọ.

Onye tụgharịrị akwụkwọ nsọ n'asụsụ Igbo?

Chika Okpalike kọwara na ajụju ndị mmadụ kwesịrị ị na-ajụ abụghi 'Onye tụgharịrị akwụkwọ nso n'igbo?' kama ihe ha kwesiri ịjụ bụ, 'Kedu akwụkwọ nsọ nke atụgharịrị N'Igbo?'.

Okpalike mere ka anyị ghọta na e nwere ọtụtu akwụkwo nso dị iche iche.

Aha onyonyo, Ọ bụdị nkafie bụ ịkpere chukwu n'ụzọ omenala?

Kedụ etu akwụkwọ nsọ si bido?

Okpalike kọwara na ọ bụ n'ihe dịka afọ 400 ka achịkọtara akwụkwọ ndi dị iche iche were kpọọ ya akwụkwọ nsọ.

N'Ime akwụkwọ nsọ a nke agba ọhụrụ bụ New Testament n'okwu bekee bụ n'asụsụ Grik ka eji dee ya nke ha kpọrọ Septuagint.

Septuagint bụ agba akwụkwọ nsọ nke ndị Juu na anọghi n'ala nna ha bụ Israel.

Ọ kọwara na ọ bụ Pọọl dere ọtụtu n'ime akwụkwọ nsọ nke agba ọhụrụ nke ọ jị Grik egbujiri egbuji nke a kpọrọ Koine greek.

Mgbe ndị nzụkọ nke Kraịst bịakọtara were si na ha chọrọ akwụkwọ ofufe nke ga-anọgide na enweghị mgbanwe ka ha hiwere akwụkwọ nsọ nke ha kpọrọ Septuagint.

Agba akwụkwọ nsọ nke Septuagint atụgharịrị n'okwu latin bụ Vulgate.

Gịnị mere n'oge afọ ndi 1600?

Ụkọchukwu Martin Luther bụ onye mbụ tụgharịrị akwụkwọ nsọ n'asụsụ ndị.

Ọ tụgharịrị ya n'asụsụ ndị Jamani.

Kama ọtụgharịghị nke Septuagint kama ọ bụ nke Masoretic ọ tugharịrị.

Masoretic bụ akwụkwọ nsọ nke ndị Juu nke fọdụrụ dịka alụchara agha ma mgbe a dọọrọ ha n'agha gaa mba ọzọ.

Aha onyonyo, Gịnị bụ ọfọ?

Martin Luther tụgharịrị Masoretic text n'ihi na o kwuru na ọ bụ nke ahụ ka Jịsọs gụrụ oge ọ nọ n'ụwa.

Ewepụ nke a, akwụkwọ nso bụ nanị n'asụsu Grik maọbụ latin ka ọ dị na mbụ.

Nkea mere ka ọtụtụ nke mmadụ bido na-atụharị akwụkwọ nso n'asụsụ obodo ha nke gụnyere okwu Bekee.

Kedụ akwụkwọ nso bu ụz bata ala Igbo?

Akụkọ ihe mere eme na-ekwu na ọ bu akwụịkwọ nso nke e dere n'asụsụ bekee bụ nke mbụ batara ala Igbo.

Ọ bụ ndị na-ewete ozi ọma bụ ndị Protestant nke Martin Luther bidoro bụ ndị mbụ batara ala Igbo ịzisa ozi ọma.

Mgbe ndị ụka Katolịk bịara ala Igbo, ọ bụ nke Vulgate atụgharịrị n'asụsu bekee ka ha jiri bịa.

Nkea pụtara na ọtụtụ akwụkwọ nso atụgharịrị bụ nke Masoretic.

Akwụkwọ nso bu ụzọ bata Naijirịa bụ nke Masoretic ma bụru kwa akwụkwọ nsọ mbụ atụgharịrị n'asụsụ Igbo.

Ndị ole tụgharịrị akwụkwọ nso n'asụsụ Igbo?

Ajayi Crowther

Ebe foto si, Getty Images

Chika Okpalike kwuru sị, "Ọ bụ Ajayi Crowther na John Taylor dịkọrọ aka ọnụ were tugharịa akwụkwọ nsọ nke Masoretic n'asụsu Igbo".

Ọ kọwara na Crowther tụgharịrị akwụkwọ Abụọma ebe Taylor tinyere uche n'akwụkwo nke Pọọl.

Dịka o si kọwaa, ọ bụ ndị ụka Protestant tụgharịrị akwụkwọ nsọ nke Masoretic.

Kedụ mgbe ndị Katolịk tugharịrị akwụkwọ nsọ Vulgate na Septuagint n'asụsu Igbo?

Ndị ụka katolịk na ndị nke Protestant nwere nkwekọrịta ịtụgharị akwụkwo nsọ n'asụsụ Igbo.

Okpalike kwuru sị, "ọ bụ ndị nke ụka Protestant ga-ede nke 'New Testament' ebe ndị katolịk ga-ede nke 'Old Testament'.

Kama ndị ụka protestant dechara nke ha mana ndọ katolịk edechaghị nke ha n'oge.

Ọ bụ ya mere ndị preotestant ji ewpụta nke ha kpọrọ 'Agba Ọhụrụ'.

Okpalike kwuru na ọ bụ nkea mere ruo taa a na-akpọ 'New Testament' Agba ọhụrụ.

Aha onyonyo, Emume 'Olili ọnwa isa' Eziagulu Aguleri nke afọ 2020 kporo ọkụ, Kirie ka o si gaa

Ọ bụ n'ihe dịka afọ 1999 maọbụ 2000 ka ndị ụka katolịk wepụtara akwụkwọ nsọ Septuagint ha tụgharịrị n'asụsu Igbo.

Kedụ ndị tụgharịrị akwụkwọ nsọ nke Septuagint n'asụsụ Igbo?

Akwụkwọ nsọ

Ụkọchukwu Chika Okpalike kwuru sị, "Ọtụtụ ndị mmadụ so tụgharịa akwụkwọ nsọ nke ndị Katọlịk nke Ụkọchukwu na Ọkammụta Christopher Amamgbo Ifenatuorah no n'isi ya. Ọtụtu ndị nyeere ya aka gụnyere mu onwe m."

Ọtụtụ ndị ọkammụta si mpaghara dị iche iche soro tụgharịa ya bụ akwụkwọ.

'Ọ bụ n'akwụkwọ nke Septuagint na nke Vulgate ka anyị si tụgharịa ya', Chika Okpalike.