Igbo Culture: Ihe mere Igbo ji atụ Ikenga egwu

Ikenga

Ebe foto si, Getty Images

Ikenga bụ chi onye.

Ọ bụ mmụọ ịkwụwa aka ọtọ, ike na ọganihu.

Mụọ a bụ mụọ nwoke na ike dimkpa.

Ikenga bụ atụrụatụ dịka ọ dị n'okpukerechi ndị ọzọ dị iche iche dị ụwa gbaa gburugburu site na okpukperechi ụka, Islam, Hinduism, Judaism na ndị ọzọ.

Ndị a niile nwechere atụrụatụ ha na-elejere anya mgbe ha na-efe chukwu.

N'omenala Igbo, a na-akpọ chi onye Ikenga.

Ikenga bụ aka nri mmadụ, nke pụtara obi ọcha, ikwuwa aka ọtọ na eziokwu.

Ihe eji anọchite anya Ikenga bụ atụrụatụ nwoke bu ihe n'isi ma jide ọdụ na oji n'aka abụọ.

Mgbe ụfọdụ ọ na-ebu mma abụọ nwere nko n'isi.

Mgbe ọzọ o burukwa atụrụatụ dịka isi ụmụanụ.

Ọ dị mkpa ịmata na ọbụghị osisi niile ka e ji atụ Ikenga.

Ukwu oji

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ukwu oji obere

Ndịgbo kwenyere na osisi ndị a nwere ike pụrụiche Chineke nyere ha o ji akpa ike.

Ramas Okoyeasuzu, onyenlekọta omenala Igbo sị na "osisi ndị a bụ Oji, ngwu na ogirisi".

Ikenga nwere ike nke mụọ oji arụ ọrụ maka ọbụghị Chukwu mana ọ bụ site na ya ka e si akpọkụ chụkwụ.

Ramas
Nkọwa foto, Ramas Okoyeasuzu bụ onyeamụma omenala Igbo sị na Ikenga bụ Ike dimkpa eji ama onye bụ onye

Ramas kwuru na nwoke ọbụla wagoro akwa, nụrụ nwaanyi kwesiri ịnwe Ikenga.

O kwukwara na "Onye ya na Ikenga ya dị na mma, ihe na-agara ya werewere".

Nke a gosiri na ikenga mmadụ kwesiri ịna edu ya njem ma na-ewetere ya ihe ọma.

Ikenga ole ka e nwere?

Nchọcha anyị nwere na-egosi na-enwere ụdịrị Ikenga dị iche iche.

Ikenga dike

Ikenga a bụ ụdị nke ana enye onye kpara ike n'obodo.

Nke a na-abụkarị aturuatu mmadụ tukwu ọdụ nwere mpi na dịkwa egwu n'anya.

Ọ na ejikwa ọdụ na obejiri n'aka abụọ.

O na-ejikarị mma ahụ n'aka nri bụ nke akpọrọ aka Ikenga.

Ọ bụ onye tozuru okorobịa na-enwe ikenga.

Ikenga ọha

Ikenga nke a na-adị nnukwu nwekwa atụrụatụ mmadụ na ụmụanụ n'ahụ ya.

Ọ na-ejikarị ọdụ n'aka ekpe, jide oji maọbụ mkpọrọ n'aka nri ya.

A na-egbukwa ya ichi n'ihu.

Ọ na-ebu nnukwu ibu maka a na-edowe ya na obodo maọbụ ama ndị nwe ya.

Otu onye anaghị enwe ya kama ọ bụ nke ọha.

Ikenga echichi

Nke a bụ Ikenga a na-enye ndị chiri echichi n'ala Igbo.

Ndị chiri ọzọ na-ejikarị ya.

Ikenga a gosiri ike na ọkwa pụrụiche.

Mgbe ụfọdụ a na-ejikwa igwe akpụ ụdị Ikenga a.

Ọ na-ejikarị ọdụ n'aka ekpe nke gosiri Ike na ọchịchị

Ihe ana emere Ikenga

A na-erekwa Ikenga tupu amalite itinye ya n'ọrụ.

Onye okenye n'ụmụnna chizuru echizu ka ọ bụ ọrụ ya ịmekwa Ikenga tupu e nye ya onye ọ bụ nke ya.

A na-anọ n'ihu ọha maọbụ ụmụ nna mekwa ya bụ Ikenga.

A na-eji ji, ọkụkọ, mmanya, ọjị na oseọjị achụrụ Ikenga aja izu ahụ.

Enwekwara ike iri oriri ụbọchị ahụ dika aka ruru onwe nwe ya bụ Ikenga.

Ya kpatara Igbo ji sị na Ikenga nwamgbenye na-atagbu onwe ya na ọjị.

Onye nye Ikenga ezigbo ihe, ogbutere ya nnukwu anụ.

Igbo sịkwa na Ikenga adighi ire awaa ya nkụ.

Lee ike nkiri a

Aha onyonyo, Igbo Culture: Usoro e ji echi nze n'ala Igbo