Ite paụda, ili eriri otubo na omenala ndị ọzọ Ndigbo na-eme n'oge ọmụgwọ

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ omenala Igbo nwere bụ ihe ndị mmadụ ka na-akwadosi ike n'agbanyeghị na ọtụtụ amaghị ihe ha pụtara.
Ịma atụ bụ etu mmadụ na-esi ete nzu Bekee a na-akpọ "powder" n'ihu maọbụ n'aka ma ọ garuo ebe a mụrụ nwa ọhụrụ, mana ọtụtụ amaghị ihe ya na ya so.
Akụkọ a ga-etinye anya n'ụfọdụ omenala ndị a na mpụtara ha.
1: Ite nzu maọbụ 'paụda'
Maazị Ozioma Odinani bụ onye ihe omenala Igbo na-adị mma, kọwara na "powder" bụ ihe ndị agba ọhụrụ ji mere nzu.
N'Igbo gboo, nzu bụ amụma ọcha.
Ozioma sị: "a mụọ nwa ọhụrụ, a na-ahụ ya dịka onwe enweghị njọ, nke mere ndị mmadụ ji ete nzu iji mee ọṅụ nwa.
Ihe aka e tere nzu pụtara:
Ebe e tere nzu nwekwara ihe ọ pụtara.
Ị hụ onye si ebe a na-eme ọṅụ tere nzu n'aka nri ya, o gosiri na ọ bụ nwa nwoke ka o si ọṅụ ya.
Ọ bụrụ n'aka ekpe, ị mara na ọ bụ nke nwa nwaanyị.
2: Ili eriri otubo
Eriri otubo nwa so n'ihe a na-akwanyere ezigbote ugwu n'ala Igbo.
Dịka omenala siri dewe, a na-eli eriri otubo ebe a mụrụ nwa ahụ. Ya bụ, ugbua a na-aga ije, n'usoro omenala, e kwesịrị iwere eriri otubo nwa laa obodo nna ya gaa lie ya.
Omenala a abụghị ihe a ka na-emesi ike ugbua, mana ụfọdụ ka na-eme ya.
3: Ili alọ (placenta)
Dịka eriri otubo, alọ bụkwa ihe a na-asọpụrụ nke ukwuu n'ala Igbo.
Dịka eriri otubo, a na-eli uwo n'ebe nwa a mụrụ ọhụrụ si.
Etu o si kwụrụ bụ na a ga-ahọta otu ukwu osisi n'ezinaụlọ nwa ọhụrụ ahụ, ma lie uwo ya n'ukwu osisi ahụ. Mana, ugbua, anaghịzị emekarị ya.

Ebe foto si, Getty Images
4: Ime ọmụgwọ
Mmadụ niile ma ihe bụ ọmụgwọ, nke bụ mgbe nne nwaanyị maọbụ nne di ya nọnyetụrụ ha iji nyere ha aka.
Ọtụtụ mmadụ na-ahụ uru ọmụgwọ bara na etu nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ga-esi nwete enyemaka nakwa nkwado.
Ọmụmụ na-esokwa ya, ọkachasị ebe nwaanyị amụbeghị nwa mbụ.
5: Ịgụ nwa aha
Ndị Igbo na-eme emume ịgụ aha site n'ụbọchị asaa ruo ụbọchị 12 a mụchara nwa. Ihe a bụ oge a na-egosi obodo nwa ahụ.
N'emume a, ezinaụlọ nakwa ndị obodo na ndị enyi ga-ezukọ kpeere nwa ahụ ekpere.
Ugbua, ọtụtụ mmadu na-agazị ụka ime emume a ebe ọtụtụ anaghị eche ka oge a ruo tupu ha a gụọ nwa aha.
6: Ibi ugwu
Ibi ugwu bụbu ihe a na-eme nwa nwoke nakwa nwa nwaanyị, mana ugbua, ọ bụzị sọsọ nwa nwoke ka a na-ebi ugwu.
A na-ebikarị nwa nwoke ugwu ma ọ gafechaa abalị atọ maọbụ karịa, a mụrụ ha.
A na-asị na ọ dị mma ibi ugwu ahụ tupu nwata amata na ihe na-afụ ụfụ, dịka a na-eche na ihe anaghị afụ nwa ọhụru ụfụ etu ọ sị afụ nke katarala ahụ.
Amachaghị uru ibi ugwu baara ndị Igbo mana a na-ekwu na ọ bụ ihe si n'oge gboo.











