Ihe di kwesịrị imere nwunye ya mụrụ nwa ọhụrụ

- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ọ bụ naanị nne maọbụ nne di kwesịrị ile nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ọmụgwọ?
N'omenala Igbo, ọ na-abụkarị nne nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ maọbụ nne di ya - ma ọ bụrụ na nne ya anọghị - na-ele ya ọmụgwọ.
N'ihi ọnọdụ a, ọtụtụ ụmụnwoke anaghị aghọta na e nwere ụzọ ole ha kwesịrị iji nyere nwunye ha aka.
Nwaanyị bịara ọmụgwọ na-anọkarị ihe dịka site n'izuụka abụọ ruo ihe ruru ọnwa atọ; oge ọ nọ ya, ọ na-ebukarị ihe niile gbasara inyere ya bụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ aka n'isi.
Mana gịnị ka nwaanyị a na-enyere aka ga-eme mgbe onye na-enyere ya aka lara?
Ebe a ka nna nwa ọhụrụ ahụ kwesịrị iwelite isi, gbaa ajụ ma buru nwunye ya n'isi.
Ị na-ajụ maka gịnị? Ọ bụ makana nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-achọ ohere ahụ ya ga-eji gbakee n'ihi ihe ọ gabigara n'ime ọnwa ole na ole o bu nwa n'afọ.
N'ihi na ọ ka bụrụ ọrụ ya ịhụkwa na nwa ọ mụpụtara dị ndụ ma nwee ezigbo ahụike, ọrụ ya anaghị ebi n'ịmụpụta ya; ọ na-atarakwa ahụhụ na-aga n'ihu ma ọ bụrụ na ọ hụghị onye enyemaka.
Mana dịka di ya, lee ihe ndị ị ga-emenwuru ya iji nyere ya aka:
Ị ga-akwadonwu nwunye gị site n'ime ihe ndị a:
1) Nye onwe gị nri

Ebe foto si, Ogochukwu ihemezue malitere isi nri ka egwuregwu.
N'ọtụtụ ezinaụlọ, ọ bụkwa nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-esi nri enye ezinaụlọ ya, n'agbanyeghi na o nwereike ọ rahụghị ụra ọfụma n'abalị.
Mana ị chọọ imere ya ihe ọma, nwanne biko sie nri nye gị na ndị ọzọ nọ n'ụlọ, maọbụ ị kpọrọ nwunye gị pụọ apụ gaa rie nri.
Zụlatara ya nri maọbụ ị chọta onye ga na-esiri ya nri ruo mgbe ọ ga-enwekwa ike na-esi nri dịka o si emebu.
2) Lekọta nwa a mụrụ ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụghị nwa niile na-arahụ ụra n'abalị, oge onye niile na-arahụ ụra.
Nke a na-eme ka ọ raa nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ahụ ịrahụ ụra ihe ruru awa isii ruo asatọ dịka o kwesịrị.
Tinyekwuoro arahụghị ụra ahụ, ọ ga-enye nwa ara ma lekọtakwa ya ma n'ụtụtụ, ehihie, abalị, ọ na-esocha ebute ike ọgwụgwụ, ma nwekwaa ike ibute nsogbu ụbụrụ nke Bekee kpọrọ "post-natal depression".
Ya mere gị bụ di ya kwesịrị ịgba mbọ lekọta nwa gị ụfọdụ oge iji nye nwunye gị ohere izuru ike ma rahụ ụra.
3) Gaa ozi n'ụlọ

Ebe foto si, Getty Images
Nwa abụghị nke naanị ya, nyere ya aka kuru nwa unu mgbe ụfọdụ, nyere ya aka saa nwa ahụ, nye nwa nri ma ọ bụrụ na nwa malite isi na karama na-eri nri.
Nyere ya aka hichaa ụlọ ma sakwaa akwa ụfọdụ oge.
O nwee ebe ndị ọzọ ọ ga-achọ ka ị nyere ya aka, biko nwanne mee ya na-echeghi ya eche n'ihi na ọ ga-amasị ya nke ukwuu.
4) Wepụta otu ụbọchị lekọta ya:

Ebe foto si, Getty Images
Ị chetara etu unu sibu arụkọ mgbe unu amụtabeghi nwa?
Mee ka ọ mara na ọ ka bụkwa onye na-enye gị ọṅụ site n'imezi ya nke ọma.
Kpọta onye ga-elekọta nwa unu, kpọrọ nwunye gị gaa ebe a ga-emezi ya isi, mbọ na ihe ndị ọzọ ụmụnwaanyị na-eji achọ mma.
Kpọrọzịa ya gaa ebe unu ga-eri nri nakwa mee ụfọdụ ihe ndị unu na-emekọbu ọnụ tupu nwa unu abata ụwa.
5) Kwanyere ya ugwu:

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụghị oge niile ka ọ ga-amasị ya ịkpa nkata mgbe ị chọrọ ịkpa maọbụ ịnọ ala gere gị ntị.
Nke a akpasula gị iwe n'ihi na nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ nwere ọtụtụ ihe na-aga ya n'isi nakwa na-eme ya n'ahụ.
Ọ ka na-aghọta mgbanwe niile ahụ ya gabigara ma ka na-agabiga, ya mere nwanne biko nyetu ya ohere mgbe ahụ ma nyekwa ya ihu ma ọ chọrọ gị bịakwa.
Ọ banye n'ụdịrị ọnọdụ a, gbaa ya ume, kwado ya, sị ya na ọ makazị. Kelee ya maka ịmụtara unu ọmalịcha nwa unu nwere. Na-ezitere ya ozi ga-eme ya obi ụtọ n'ekwentị ka ọ mara na ọ bụghị naanị ya kwụ.








