Maternal Mortality: Uche Jombo na ụmụnwaanyị ndị ọzọ kwuru ihe mere ha agaghị amụju ụlọ

Nwaanyị ku nwa nwoke

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chioma Obianinwa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo

Ụfọdụ ndị ọkachamara na-eche na ịkwụsị atụmaatụ ebe ụmụnwaanyị na-achọrịrị ka ha mụta nwa nwoke nwereike belata ụmụnwaanyị ịnwụ ebe ha na-amụ nwa.

Uche Jombo kwuru na ọ dịghị ka ụmụnwaanyị na-achịpụta ụmụ iri na abụọ maọbụ itoolu dịka nne ya si mee.

Jombo kwuru na ịmụta nwa na-ara ya ahụ; na afọ ime ya pụrụ ugboro atọ.

Ibukun Ogu ji ụmụ atọ kwuru na o bu ụzọ mụta ụmụnwaanyị abuọ tupu ọ mụta otu nwoke mezuru ha ụmụ atọ.

Nwaanyị ku nwa nwoke

Ebe foto si, Getty Images

Mana o kwuru na ya na di ya kwetara ịmụta ụmụ abụọ sọsọ mgbe ha lụchara di na nwunye.

Otu nwaanyị na-achọghị ka a mata aha ya kwuru na ya mụrụ ụmụ anọ ebe ọ na-achọ ịmụta nwa nwaanyị.

Nwaanyị kụ nwa nwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

O kwuru na o ji ịwa afọ mụọ ha niile nke mere ka di ya were ụjọ sị ya amụzịla ka ọ mụchara nke atọ bụkwa nwoke, mana o siri ọnwụ mụọ nke anọ mechara bụrụ nwa nwaanyị ọ na-achọ kamgbe.

Ihembosi dị afọ iri atọ na asaa mụrụ nke mbụ, ọ bụrụ nwoke, nke abụọ so ya bụrụ ejima nwoke abụọ, nke anọ abụrụzịa nwaanyị ọ na-achọ. Mana otu nwaanyị ahụ mechara nwụọ.

Kedụ ihe mere ụfọdụ mụnwaanyị ji achọkarị ka hamụtarịrị nwoke maọbụ nwaanyị?

N'agbanyeghị ihe ọdachi na-adakwasị ụmụnwaanyị na-agba mbọ ịmụta nwoke maọbụ nwaanyị mgbe ụfọdụ, ọtụtụ achọghị ikwụsị ya bụ atụmatụ.

Ihe mere Chinenye ji ụmụnwoke atọ ji chọ ịmụtarịrị nwa nwaaanyị

  • Ọ chọrọ ka ndị ọgọ bịa be ya (ịnata ụgwọ isi nwaanyị)
  • Ọ chọrọ ịmụta onye yiri ya kpọmkwem
  • Ngwakọ amaka - A mụọ nwoke, a mụọ nwaanyị
  • Ọ chọrọ inwe ohere ịga ọmụgwọ

Gịnị mere e ji achọkarị nwa nwoke?

Chinedu Balogun kwuru na otu n'ime ha bụ oke ịcha ọkụ ụmụ ụwa na-enye di na nwunye.

Ihe ndị ọzọ e ji achọ nwa nwoke gụnyere:

  • Ndị na-achọghị ka aha ezinaụlọ ha 'fuo', maka a na-asị na ezinaụlọ amụtaghị nwa nwoke, na ama ha eshiela.
  • Nwaanyị mụrụ nwa nwoke na-ahụ ya na o chizuola, na ọ ga-ekwunwu okwu ebe ndị ọzọ na-ekwu.
  • Nwa nwoke na-azọtanwu akụnaụba dị n'ezinaụlọ ha karịa nwaanyị a ga-alụpụ alụpụ.
  • Ọtụtụ agbụrụ na-aka akwanyere nwa nwoke ugwu karịa nke nwaanyị.

Ngalaba European Union na United Nations a kpọrọ "Spotlight Initiative" na-ekwu na atụmatụ ịmụtarịrị nwa nwoke ebutela mmegide dị iche iche nye ọtụtụ ụmụnwaanyị na Naịjirịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Di na nwunye mụrụ nwa ka afọ 17 gachara