Ụgwọ opekatampe nyere ndị mmadụ olileanya mana olileanya a tipiara etipia - Onye ọrụ Enugwu steeti

Ndị chọrọ ụgwọ opekatampe

Ebe foto si, Getty Images

Ụbọchi 31 nke Disemba 2019 bụ ụbọchị ngalaba na-ahụ maka ndị ọrụ na Naijirịa bụ 'Nigerian Labour Congress' (NLC) nyedebere steeti niile na Naijirịa ka ha kwụwa ụgwọ opekatampe.

Mana dịka ụbọchị ahụ na-erute nso, Enugwu steeti na Anambra steeti so na ndị ebidobeghị ịkwụ ya.

N'otu aka ahụ, ka ndị ọrụ steeti ahụ sị na ha ji nwayọ eme emume ekeresimesi nke afọ a makana ego adịghị.

Onye nkuzi na mahadum Enwugwu steeti bụ Mazi Nnamdi Okenwa, kwuru na o cheghị na e nwere steeti na Naijirịa mezuru ihe gbasara ụgwọ opekatampe nke ga-erute ndị ọrụ gọọmentị ruo agba nke iri na isii.

O kwukwara na n'agbanyeghi na gọọmentị Enugwu steeti kwụrụ ụgwọ ọnwa nke ọnwa Disemba ma tụkwasịkwa ya ọnwa ọzọ nke e ji 'ụgwọ ọnwa iri na atọ' mara, na ha ekwubeghị okwu ịkwụ ụgwọ opekatampe.

Ọ kọwara na gọọmentị etiti emebeghị ihe ha kwesịrị ime iji hụ na gọọmentị steeti ahụ ga-akwụnwu ya bụ ụgwọ.

Ọ kọwakwara na a kwụọ ụgwọ opekatampe a, na o nwereike ime ka ego ihe dị n'ahịa laa elu nke ndị bekee na-akpọ 'Inflation'.

Nnamdi Okenwa kwukwara na ya alaghị obodo maka ekeresimesi n'ihi na ego adịghị.

O kwuru na ụgwọ opekatampe nyere ndị mmadụ olileanya kama olileanya a tipịara etipịa.

Ihe ndị 'NLC' Anambara nwere ikwu

Mgbe BBC kpọrọ onyeisioche ndị ngalaba 'NLC' nke Anambara steeti bụ Jerry Nnubia, o kwuru na mgbe ha na gọọmentị Anambara zutere, na ha anabataghị ihe gọọmentị kwuru maka ụgwọ opekatampe.

Nnubia sị na ha na-eche ka gọọmentị zaa ha dịka ha siri kwuo.

O kwukwara na ha ga-akpọtụrụ gọọmentị taa bụ ụbọchi 30 nke ọnwa Disemba 2019, ma ọ bụru na gọọmentị emeghị ihe ha kwesịrị ime na ha ga-ezute were kpebie ihe ha ga-eme echi bụ ụbọchị (31 nke Disemba) ikpeazụ ha nyere gọọmentị ikpebi ịkwụ ụgwọ opekatampe.

Ihe ndị 'NLC' nke Enugwu steeti nwere ikwu

Onyeisi ngalaba ndị NLC nke Enwugwu steeti bụ Nwobodo Virginus, kwuru na a ga-enwe ọgbakọ ngalaba e hiwere maka ịkwụ ụgwọ opekatampe n'Enugwu steeti nke gụnyere ndị ọrụ gọọmentị na ndị otu NLC na mgbede Disemba 30, 2019.

O kwuru na ọ bụ mgbe ha nwechara ọgbakọ a ka ndị otu NLC ga-ama ihe ha ga-eme.

Nwobodo sị na ọ nọghị na ngalaba a ehibere maka ikwụ ụgwọ opekatampe a.

Ọnọdụ gọọmentị Anambara steeti maka ịkwụ ụgwọ opekatampe

Onye kwuchitere gọọmentị Anambara steeti bụ Don Adinuba, gwara ndị ntaakụkọ BBC na gọvanọ Anambara steeti bụ Willie Obiano, gwara ndị ọrụ gọomentị steeti ya mgbe ha na-eme emume maka ncheta ndị ọrụ gọọmentị nke ha mere n'ụbọchi 16 nke Disemba 2019, na gọọmentị ga-akwụ ụgwọ opekatampe.

Adinuba kwuru na gọomentị Anambara steeti ga-akwụ ụgwọ opekatampe nke N30,000 site n'ọnwa Jenụwarị nke afọ 2020.

O kwukwara sị "gọomentị ga-ebuli ụgwọ mmadụ niile na-arụrụ ha ọrụ" .

O kwuru na gọomentị Anambara dị njikere ilekọta ndị ọrụ ha dịka ha kwụrụ ha ụgwọ n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Disemba, ma bunye ndị ọrụ ha niile otu akpa osikapa.