'Gọọmentị Abia steeti jị ndị ABSU ụgwọ enyem aka' - Ụlọomeiwu Abia steeti

Abia State University

Ebe foto si, abiastateuniversity.edu.ng

Ngalaba ụlọomeiwu Abia steeti na-ahụ maka agumakwụkwọ edepụtala nchọpụta ha maka ego gọọmenti Abia steeti ji mahadum nke steeti e ji ABSU mara.

Onye n'ahu maka mgbasa ozi na ntaakụkọ nke ndị ụlọomeiwu Abia steeti bụ Jude Ndukwe kwuru na ihe ha nyochapụtara gosiri na gọọmentị Abia steeti ji mahadum ahụ ụgwọ enyemaka ha kwesiri inye ha kwa ọnwa.

Ụgwọ a bụ ego ndị gọọmenti steeti na enye ụfọdụ ngalaba nke gunyere mahadum iji kwado ha.

Jude Ndukwe na-ahụ maka igbasaozi na ụloomeiwu Abia steeti

Ebe foto si, Jude Ndukwe

Ndukwe kwuru na gọọmentị jị mahadụm ahụ ụgwọ a ọnwa ole na ole.

Ka o di ugbu a, ndi ụlo omeiwu ga-enwe nzuko ebe ha ga atule ụgwo a eji ụlọ akwụkwọ ahụ.

O kwuru na ihe nwere ike ime ma ha mechaa nnyocha ha gunyere:

1) Ha ga-akpọ Kọmishọna na-ahu maka agumakwụkwọ ka ọ kọwaa ihe mere ha ji jiri mahadum a ụgwọ.

2) Ha nwekwara ike inye ikike ka gọmenti steeti kwụo ụgwo a niile.

4) Ha nwekwara ike itụnye aro ka ewetuo ụgwọ enyemaka a, ka gọọmentị steeti nwee ike ịkwụ ya.

Ahọpụtabeghị ndị ga-arụ ọrụ dịka ndị komishọna n'Abia steeti.

Akara ntụ-ntụ

Gụo akụkọ ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, SexforGrade: Ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ya