Childbirth: E jirila akpanwa onye nwụrụ anwụ mụta nwa dị ndụ

Ebe foto si, Reuters
A na-ekwu na "Bekee wụ agbara", ihe a ndị ọkachamara sayensị mere ebe ha si n'akpanwa onye nwụrụ anwụ mee ka a mụta nwa dị ndụ, egosila ya.
Usoro e ji were akpanwa ahụ si n'ahụ onye nwụrụ anwụ tifee ya n'ahụ onye nke dị ndụ nakwa inye ya nleta onye na-achọ ọmụmụ, ruru awa iri, n'ụlọọgwụ dị na Sao Paulo dị na mba Brazịl.
Nwaanyị ahụ mechara mụọ nwa nwaanyị a, ebughị akpanwa pụta ụwa.
Nke ya bụ mbụ mmadụ na-esi n'ọnọdụ ahụ amụ nwa dị ndụ, makana ugboro iri a nwaburu ya, o nweghị isi maọbụ afọime ahụ a pụọ.
Mana n'aka ọzọ, e werela akpanwa onye dị ndụ nye onye ọzọ ugboro 39, nke gụnyere ndị nne nyere ụmụ ha akpanwa ha, ebe esirila mụta ụmụ iri na otu.
Inye ọgwụ
N'okwu a, nke Lancet dere maka ya, onye nyere akpanwa ya, bụ otu nne ụmụ atọ fọrọ obere ka o ruo afọ iri ise nke ọbara ịgba n'ụbụrụisi ya gburu.
Onye natara akpanwa ya nwere ọrịa a kpọrọ "Mayer-Rokitansky-Küster-Hauser syndrome", bụ ọrịa na-arịa otu n'ime ụmụnwaanyị 4,500 niile, ma bụrụkwa ọrịa na-eme ka akpanwa nakwa ebe nwaanyị si amụ nwa ghara ịrụ ọrụ etu o kwesịrị.
Ka o sila dị, enweghị ihe mere akwanwa ya. Ndị dọkịnta nwetere ohere iji wepụta ya, dewe ya ebe ya na ọbara ọcha si n'ahụ onye ga-abụ nna nwa ahụ ga-enwe mmekọ, ma tinye ya na njụoyi.
E nyere nwaanyị ahụ ọgwụ ndị mere ka ihe na-alụso ihe ọjọọ ọgụ n'ahụ ya nke Bekee kpọrọ "Immune system" , daa mba. Nke mere ka ahụ ya ghara ịjụ akpanwa ahụ e tinyere n'ahụ ya.

Ebe foto si, Getty Images
"Ihe ọma merela ndị ọgwụgwọ"
Ka izu isii gachara, ọ malite ịhụ nsọ ya.
Ka ọnwa asaa gachara, e tinyere akwa ndị ahụ e tinyere na njụoyi n'ime ahụ ya.
Ka o buchara afọime ya gara nke ọma, ọ mụrụ nwa ya ha paụnd isii n'ibu, site n'ịwa ahụ a wara ya n'ụbọchị 15 nke Disemba 2017.
Dkta Dani Ejzenberg, nke si n'ụlọọgwụ das Clínicas dị na São Paulo, kwuru sị na usoro ga-eme ka ụmụnwaanyị na-enweghị ikike ịmụ nwa nwee ike ịhụ ndị ga-enye ha akpanwa nakwa ụlọọgwụ ga-egbonwu mkpa ha.








