Chimamanda Adichie: Etu nzere 'Women Prize for Fiction' si mepere m ụzọ

Aha onyonyo, Irite 'Women Prize for Fiction' mepere m ụzọ - Chimamanda Adichie

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, onye na-ede akwụkwọ a ma ama bụ Chimamanda Adichie kọwara ihe nrite ahụ rutere ya aka n'afọ 2007 mere ya.

Chimamanda Adichie eturula ugo "best Women's Prize winner"

Chimamanda Ngozi Adichie

Ebe foto si, Rex Features

Nkọwa foto, Adichie sị na nturuugo ahụ o ritere n'afọ 2007, " dọtara ọtụtụ ndị mmadụ ịgụ akwụkwọ m dere."

A họpụtala akwụkwọ Chimamanda Adichie dere ọ kpọrọ "Half of a Yellow Sun" dịka akwụkwọ kachasị mmana ndị ritere "Women's Prize for Fiction" kemgbe afọ iri abụọ na ise e hiwere ya bụ nturuụgo.

Chimamanda, onye riteburu nzere "Women's Prize for Fiction" n'afọ 2007 oge a ka na-akpọ ya "Orange Prize" meriri dịka ọkacha mma n'etiti mmadụ iri abụọ na ise ndị ọzọ nweterala nturuugo ahụ a na-eme kwa afọ.

Ụmụnwaanyị ndị ọzọ riterela nzere "Women's Prize for Fiction" gụnyere Zadie Smith, Andrea Levy nwụụla anwụ, Lionel Shriver, Rose Tremain na Maggie O'Farrell.

Nturuụgọ ọhụụ a bụ nke ụlọrụ ahụ na-enye turuụgo ahụ ji eme ncheta mmalite nzere ahụ nke a na-akpọbụ " Orange Prize" na "Bailey's Prize".

"Half of a Yellow Sun" bụ akụkọ ihe mere na Naijiria oge Agha Biafra.

Aha onyonyo, Okwu Chimamanda kwuru maka ụgwọ isi

Ya bụ akwụkwọ nke o dere n'afọ 2006 lere anya na njedebe ọchịchị ndị ọcha, agbụrụ, wuru ewu na ụwa niile, ọgaranya na ogbenye.

E mechara were ya mee ihe onyonyo nke Chiwetel Ejiofor (bụ nwa afọ Igbo bi ala Bekee) na Thandie Newton n'afọ 2013.

Adichie sị: "O metụtara n'ọkpụkpụ na a họpụtara m dịka onye meriri n'etiti ndị meriri n'ihi na nrite a dọtara m ọtụtụ mmadụ ịgụ akwụkwọ m - o mekwara m ka m mata akwụkwọ ndị ọzọ nwere nka dere."

Aha onyonyo, Chimamanda akọwapụtala onye "feministị" bụ

Chimamanda natara akpụrụakpụ nzere ahụ a na-enye kwa afọ nke a kpọrọ "Bessie."

Onye na-ede akwụkwọ ma bụrụkwa onye hiwwere nzere ahụ bụ Kate Mosse, kelere Adichie ma kwuo na " obi dị m ụtọ" na "Half of a Yellow Sun" meriri.

Ọ sịrị,"Ebum ịkwalite akụkọ ọkaibe ụmụnwaanyị dere n'ụwa dum.."

"Mbọ anyị na-agba bụ ị hụ na ndị agba ọhụrụ hụrụ ọrụ mmadụ iri abụọ na ise nakwa iweli elu ezi aka ọrụ ụmụnwaanyị na-ede akwụkwọ na mpaghara ụwa dum."

Ihe Karịrị mmadụ puku asatọ narị ise bụ ndị tụụ bvootu e jiri họrọ Chimamanda.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

2px presentational grey line