Gịnị na-esere Charly Boy na Dewy Oputa nwa ya?

Charles na Dewy Oputa

Ebe foto si, Charly Boy

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Charly Boy na nwa ya nwaanyị bụ Dewy Oputa na-agbagha onwe ha okwu n'elu soshal midia banyere ọnọdụ nwa ya dịka onye naanị nwaanyị ibe ya na-amasị nke Bekee kpọrọ 'Lesbian'.

Ihe kpalitere okwu ahụ bụ na Charles Oputa, a ma dịka Charly Boy, jiri ihe ya na nwa ya jerela n'afọ anọ ọ chọpụtara na ọ bụ naanị nwaanyị na-amasị ya were dụọ ndị nne na nna ọdụ.

Ya bụ okwu Charly Boy kwuru gbara nwa ya nwaanyị iwe, o wee katọọ nna ya sị na ọ bụ "ọkaa mma n'ama'.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Mgbe BBC Igbo kpọrọ Charly Boy ịnụta olu ya banyere ihe nwa ya sara ya, o kwuru sị: "Ihe mere o ji ekwu otu a bụ na ọ bụ ụmụaka."

O kwukwara na ọ dị ya ka ọ gbaala ya n'anwụ."

Charly Boy kwusiri ike mkpa ọ dị nne na nna ịnabata nwa ha torola ogo ihe e ji mmadụ eme ibi ndụ ha etu masịrị ha.

Ihe bidoro ụka

N'ozi Charly Boy depụtara na Facebook ya n'ụbọịchị Fraide, ọ gbara ama ka Naijiria siri dị ya ka Gana oge nwa ya nwaanyị bụ Dewy gbuwara ya akụoyibo Nsugbe na ya bụ nwanwaanyị ihe naanị nwaanyị na-amasị na etu ya sị nabata ya ka ogologo oge gachara.

Ọ sị na " Amaghị m ka ọbị m adị."

"Ọtụtụ ihe gbatara m n'uche:'Kedụ ihe mere mejọọ?' 'Nwa m m che na m ma ma ahụnanya anọghịzịkwa ya',' ọ bụ na ndị mmadụ agaghị ebido kpapụwa nwa m?' ' Ọ bụ na nwa agaghị ebi n'ọkụ ala mụọ?'.

Okwu Charly Boy

Ebe foto si, Charly Boy/Facebook

O kwuru na dịka echiche ndị a na-aga njem n'ime obi ya, ya nọ na-atụ onwe ya mbọiji jide onwe ya aka.

O kwuru na ihe a bịara ya dịka ọnwụwa n'ihi na onwe ole na ole tupu nwa ya a kpọrọ okwu aha, na ya na-ekwuchitere ndị mmasị ha bụ nwoke maọbụ nwaanyị ibe ha.

O kwuru na ịnabata ọnọdụ nwa ya bụrụ ya "ịnabata eziokwu dịka ịwa afọ., Ọ na-afụ ụfụ mana ọ na-agwọ ọrịa. Asị dịka ọgwụ ahụ mkpu, ịṅụ ya, ei nweta onwe gị ozigbo mana ihe so ya na-adigide."

Ihe Dewy sara ya

Dewy Oputa

Ebe foto si, Charly Boy/Facebook

Mana okwu ahụ Charly Boy kusuru nwa ya nwaanyị onye kpọrọ okwu nna ya kwuru, "mere mere n'ihu, gwọmpụtụ n'azụ".

Dewy sịrị na nke bụ eziokwu bụ na nna ya anaghị aza ekwentị ya ma ya fọkwa ya na ya ịdị na mma.

O boro nna ya ebubo ịgbawa ya aka ego oge ọ lọtara na Naijiria nke na ọ bụ site na amara enyi ya ka ya jiri laghachị ala Bekee.

Dewy kwuru sị: "N'afọ 2017, a chụpụrụ m n'ụlọ, enweghịkwa m ebe obibi ma ewezụga enyị akara m ịhụ nri maọbụ ebe ndokwasa isi."

"Ihe zọrọ bụ na e ji akwụkwọ njem ga-ebugachi Atlanta(Amerịka), alaghachiri m na-enweghị ego ọbụla ma ya fọdụ ebe m ga-ehi."

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Charly Boy: Nwa ya nwaanyị na-ayị nwaanyị ibe ya nwere ike ime ihe masịrị ya

Charles na Dewy Oputa

Ebe foto si, Charly Boy

Charly Boy ekwuola na dịka nna ya ebighịrị ya ndụ ya, na ya agaghị ebiri nwa ya nwannyị ndụ nke ya.

Nwa Charly Boy nwaanyị bụ Dewy Oputa na-ewu na soshal midia maka nkwụpụta omere na ya na nwaanyị na anọkọ dịka nwoke na nwaanyị.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Charly Boy gwara BBC Igbo n'elu ekwentị sị, "Ama m maka ihe a kemgbe afọ atọ gara aga.

"Ọ bụghị ihe ọhụrụ, ndụ nwa m na-aga ọfụma."

"Nna m ebighịrị m ndụ m, agaghị m ebiri nwa m nwaanyị ndụ ya."

Charly Boy na Dewy nwa ya nwaanyị

Ebe foto si, Charly Boy

Nwa ịkpeazụ bụ Dewy Oputa kwuru na egwu na-atụ ya mana ọ ga-eme ihe a, we kwuputa na ya na enyi ya nwaanyị emepeela peeji instagram nke ha.

Ọ bụ akụkọ na-ewu ewu n'ihi na Naịjirịa manyere iwu na-ekwu na nwaanyị maọbụ nwoke ọbụla ya na ibe ya nwere mmekọ ahụ ga-aga ụlọmkpọrọ rue afọ iri na anọ.