Nwa Jacinda Ardern: Onyeisiala New Zealand amụọla nwa

Jacinda Ardern na ezinaulo ya

Ebe foto si, @JACINDAARDEN

Nkọwa foto, Jacinda Ardern jiri soshal midia qwa ndị mmadụ maka nwa ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onyeisiala New Zealand bụ Jacinda Ardern amụọla nwa mbụ ya, nwata nwanyị dara 3.31kg n'arọ.

Nke a mere Ardern jiri bụrụ nwaanyi nke agba ohụrụ na ụwa nke ugbua mụru nwa ka ọ na-achị mba.

Onyeisiala Ardern gara ụlọọgwụ dị na Auckland na ụtụtụ taa bụ Tọọsde, ka o ji abalị anọ gafe mgbe e chere na ọ ga-amụ nwa.

Ardern dị afọ 37 ga-ewere izu ụka isii jiri me ọmụgwọ ya.

Nke a mere ka onye osote onyeisiala bụ Winston Peters bụrụ aka na-achị New Zealand ugbua.

Mana, Ardern kwukwara na a ga na-eme ka ọ mata maka ihe ukwuu banyere ọchịchị, nakwa na ya ga na-agụ akwụkwọ ọchịchị.

A mụrụ nwa ahụ n'ọnụ ụtụtụ tata.

Onyeisiala Arden mechara gbasa ozi ọmụmụ a na soshala midia ma kwuo na ya na-enye ndị ọrụ ụlọọgwọ ezigbote ekene.

N'ozi o zipụrụ, o dere: "Ama m na anyị na-enwe aṅụrị ka ndị mmadụ mụrụ nwa ọhụrụ, mana anyị na-enye ekele maka ihu ọma niile na ekele ọma ndị mmadụ na-enye anyị. Daalụnụ."

Ndị ndọrọndọrọ ndị ọzọ na-enye ya ekele, ọkachasị onye bụbu onyeisiala New Zealand bụ Helen Clark.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ardern rigoro n'ọkwa ka n'ọnwa Ọktoba nke afọ gara aga, ma kwuo na ọnwa mbu nke afọ na ya dị ime.

Aha di ya bụ Clarke Gayford.

Ardern gwara ndị ụlọ ntaakukọ Radio New Zealand mgbe ha gbara ya ajụjụ n'afọ a sị: "Ọ bughị mụ nwaanyi mbụ na-eme ọtụtụ ihe otu ugboro. Ọ bụghị bụ nwaanyị mbu na-arụ ọrụ ma mụọ nwa; ụmụnwaanyị mere ya mbụ karịrị akarị."

Ọ bụ Ardern bụ onye kachasị bụ nwata na ndị chịrị New Zealand kemgbe 1856.

N'afọ 1990, Benazir Bhutto mụrụ nwa nwaanyị ka ọ bụ onyeisiala Pakistan, nke mere ya mbụ na ndị ọchịchị onyekwuoucheya.

Tata bụkwa ncheta oge a mụrụ Benazir Bhutto.

Akara ntụ-ntụ
Akara ntụ-ntụ