'Ọ bụghị Ojukwu dubara ndị Igbo agha Biafra' - Bishop Obi Onubogu

BBCIgbo na onyeisi ụlọụka Rock Family bụ Obi Onubogu nwere mkparịtaa ụka ka o bunye anyị uche ihe ọ chere maka Biafra ya na ọrịa coronaviorus ma ihe ndị ọzọ a kpụ n'ọnụ.
Onubogu onye toro n'Ọnịcha kwuru na ọ bụ mgbe ọ gara akwụkwọ ka ọ hụtara ndị na-aga ekpere Kraịst.
Mgbe ọ gụchara akwụkwọ, ọ banyere ọrụ uweojii n'afọ 1964 ma rụọ ọrụ dịka onye na-achịkọta isiụlọ ndị Biafra n'Umụahịa.
Lee ka o siri tinye ọnụ n'ihe gbasara ọrịa Coronavirus na okwu ndị ọzọ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ.
Kedu etu ọrịa Covid-19 si metụta okpukpere nke Kraịst?
Obi Onubogu kwuru na ọrịa a bụ atụmatụ ekwensu webatara i ji megịde ụka ma tinye ụjọ na obi mmapụ nye ụfọdụ ndị nke Kraịst.

Ebe foto si, Rock Family Church Nigeria/Facebook
O kwukwara na ọrịa covid-19 bụtere agụụ ma mee kwa ka ndị mmadụ hapụ ịzịsa ozi ọma.
Echiche ya maka agha Biafra na Odimegwu Ojukwu
Obi Onubogu kwuru na ọbụghị Dim Odimegwu Ojukwu dubara ndị Igbo n'agha Biafra kama na ọ bụ mkpebi ndị Igbo.
Mgbe ọ chọrọ ịkọwa ihe o ji echeta Ojukwu, O kwuru otu ihe mere n'obodo azụmịrị ebe ndị agha Biafra na nke Naijirịa jụrụ ilụ agha si kama ka ha bụrụ enyi.
Kama otu mgbe ha gara ị nwe aṅụrị n'Aba dịka ha sị eme, mgbe ha mechara ndị agha Biafra nwụchịrị ha were zịgara Ojukwu ozi na ha ejidela ndị agha Naijiria karịrị otu nari.
Ojukwu pụtara were baara ndị agha Biafra mba ma nye iwu ka ha kpọrọ ndị agha Naijirịa ha jidere me leta ha anya tupu agha ebie.
Ihe Obi Onubogu chere maka imechi ebe ofufe?
Onubogu kwuru sị "orụọla mgbe gọọmentị ga-elebara mmachị amachiri ụlọụka".
Ọ jụrụ " kedu etu ị ga-esi mepee ụlọọgwụ, ọdọ ahia na-ebe ndị ọzọ were kpọọ ha ihe dị mkpa ma mechie ụlọụka nke kachasị mma maka mmepe obodo?"
Onubogu sị na-etinyere iwu a, ọ dị ka ọ na-emegide ndị nke Kraịst.
Kama o kwuru na n'oge na-adịghị anya na gọọmentị ga-ewepụ ya bụ mmachi.
Ihe o kwuru maka ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ ma ndị ụka ha a na-nyere ndị mmadụ aka oge mmachi a
O jị ụlọụka Rock family church maa atụ were sị na ha chọpụtara ndị ihe na-esiri ike were nyere ha aka.
Onubogu kọwara na ihe mere bụ na ndị ụka anaghị eti mkpu ma ha mee ihe, n'ihi na ha nwere ifunanya nke Chineke.
Lee ya n'uju ya ebe a
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post








