Covid-19: "Mmachị dị mma kama ị ga-amachi onye agụụ na-agụ n’ụlọ” - Peter Obi

Peter Obi
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Peter Obi na BBCIgbo nwere mkparịta ụka n'ụbọchị Tuzde. O kwuru maka ọtụtu okwu a kpụ n'ọnụ.

Lee ka o siri gaa.

Kedu ihe ị chere mmaka mmachị maka coronavirus?

Peter Obi zara sị "Mmachị dị ezigbo mkpa, kama ị ga-amachị onye agụrụ na-agụ sị ya nọro n'ụlo? Onye ahụ ga-apụta iro ka ọ chọo ihe ọ ga-eri."

Obi mara atụ sị "mba dịka Indịa nyere ndị nke ha akpa osikapa ma nye kwa ha ego nke a mere ka ndị mmadụ kweta nọrọ n'ụlo."

Ọ bụrụ na gọọmentị chọrọ ka ndi mmadụ na-asa aka ha ebe ụfọdụ enweghị ego ha ji azụta ncha na mmiri.

Obi kwukwara na ọ dị mkpa ka ebulite ọnụọgụgụ mmadụ ole a na-eme nyocha maka coronavirus.

"Kedu ihe pụtara ihe maka mgbe emere mmachị na Naijirịa?"

Obi kọwara na-nwere ihe atọ dị mkpa e i ama obodo ọnọdụ ya dị mma, ihe atọ a bụ Ahụike, Agụm akwụkwọ na mmadụ ole dara ogbenye.

Obodo ọbụla ihe ndị atọ a nọ n'ime ya nke ọma na-aga n'ihu.

Kama Obi kwuru na Naijirịa gbara ọnyụpo n'ihe atọ ndị a.

Peter Obi ji mba India na Chaina were mma atụ sị na-agbanyeghị na mba abụọ ndịa nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ karịa nke Naijirịa kama achịkọta ndị ogbenye nọ na mba ndịa, na ndị nke nọ na Naijirịa ka nke ha.

O kwuru maka agụm akwụkwọ sị "ntule ziri ezi maka agụm akwụkwọ kwesiri ị bụ ihe dịka passentị iri asatọ kama nke Naijirịa ka nọ passenti iri ise".

Obi kwuru sị "gọọmentị kwesiri ịkwalite ndị mmadụ ka ha nwee ike ịkpata ego nke ha".

O gara n'ihu kwuo sị "Ọ bụrụ na igwe Kọmpụta nọ n'ụlọ akwụkwọ anyị niile kamgbe, ụgbụ a emechiri ụlọakwụkwọ ọ ga-adịrị ụmụ akwụkwọ mfe iji igwe kọmpụta amụ ihe"

Maka ntuliaka 2023?

Peter Obi kwuru na oge a abụghị oge ndọrọndọrọ ọchịchị dịka coronavirus na-awakpo mmadụ. Kama ọge bụ oge anyị ga-eji bịakọ ọnụ maa tikọọ aka ọnụ merịe coronavirus.kama mgbe nke a mechara na enwere ike ikwu maka ntụliaka 2023.

Kedu maka ndị Almajirịa na-abata ala Igbo na-agbanyeghị mmachi?

Obi kwuru sị " mgbe m nọ n'ọchịchị, ahụrụ na obodo niile nwere ndị na-echekwa ha nke a na-akpọ Vigilante. Anyị zụtara ha ụgbọala ma gọọmentị Anambra steeti na-akwụ ha ụgwọ".

Oge eruola ka ndị obodo niile chekwa onwe ha. Nke a ga-eme ka ha chọpụta ndị mmadụ na-ezubata n'obodo ha. Ọ kacha mkpa ugbu a coronavirus na-akpa ike.

"Kedu ihe ị chere maka ndị uweojii na-egbu mmadụ n'ala Igbo?"

Obi kọwara na o nweghị onye kwesiri igbu mmadụ. Kama na ọ dịrị ndị mmadụ ime ka ndị ọchịchi na onyeisi uweojii mara ka onye uweojii ahụ nweta ntaram ahụhụ dịrị ya.

Gịnị mere ala Igbo anaghị emepe?"

Ọ bụ ndị a na-achị kwesiri ịhụ na ndị ha tinyere na ọchịchị mezuru ihe ọ kwesiri ime.

Ndị obodo kwesiri ijide ndị ha tinyere n'ọchị ka ha mezuo nkwa ha kwere.

Kama mmepe obodo bụ ọrụ dịirị mmadụ niile.

"Kedu ihe ị nwere ịkwu maka ọgwụ ọdịnala a sị na-eji agwọ coronavirus?"

Peter Obi kwuru sị " a kwadoro m etu gọọmentị sị chọọ iweta ọgwụ ndị Madagascar ka ha tule ma ọ dị ire".

Obi kwukwara na Naijirịa kwesikwara ị le anya n'ụlọ maka ọgwụ na ịrụpụta igwe Ventilator.

Gee ya n'uju ya ebe a

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Akụkọ ndị ga-amasị gị: