Ibrahim Gambari: Ihe i kwesịrị ịma maka onyeisi ọrụ Buhari ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buhari họpụtala Ọkammụta Ibrahim Agboola Gambari dịka onyeisi ndị ọrụ ya (Chief of Staff, CoS).
Ọ bụ odekwụkwọ gọọmentị etiti bụ Boss Mustapha kwupụtara nke a dịka nzukọ ndịisi ọchịchị na-achọ ịmalite taa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Gambari ga-anọchi anya Abba Kyari bụ onye ji ọkwa a ruo mgba ọ nwụrụ n'ụbọchị 17 Eprelụ afọ 2020 n'ihi coronavirus.
Dịka ọ dị ugbua, Gambari amalitela ọrụ dịka ọ n'ime nzukọ ndịisi ọchịchị gọọmentị na-eme taa.

Ebe foto si, @Bashir Ahmad/Twitter
Gambari dịka ọ nọ n'ime nzukọ ndịisi ọchịchị Naịjirịa
Nke a mere ka aha nwoke a malite iwu na soshal midia gbaa gburugburu, ha na-ajụ onye bụ Gambari.

Ebe foto si, Twitter
- Gambari bụ onye Kwara steeti, a mụrụ ya n'afọ 1944.
- Ọ gụrụ akwụkwọ na Kings College, Legọs, gụọ maka Akụnaụba na mahadum London School of Economics n'afọ 1968, nakwa Mahadum Columbia dị na USA.
- Ọ kuziri na mahadum 'Ahmadu Bello University, Zaria, dị na Kaduna Steeti.
- Ọ bụbu Minịsta na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ n'oge ọchịchị Buhari mbụ bido n'afọ 1984 rue 1985.
- Ọ bụ onye ndụmọdụ mbụ nke odeakwụkwọ otu United Nation n'Afrịka.

Ebe foto si, Getty Images
- Ọ bụ ya chọpụtara otu a kpọrọ Savannah Centre dị n'Abuja, nke na-ahụ maka nyocha.
- Gambari bụ onyeisi ndị ndu UNICEF n'afọ 1999.
- Onyeisiala mba Saụt Afrịka n'oge ahụ bụ Jacob Zuma nyere ya nturuugo kachasị dịka onye na-abụghị nwafọ ha n'Ọktoba 2012.
- Gambari gbara afọ iri asaa na isii.





