Edward Adamu: Lee ebe ndị niile Buhari nyere ọrụ si

Edward Adamu,Hadiza Usman,Nnenna Akajemeli,Muhammadu Nami

Ebe foto si, Adamu/Usman/Akajemeli/Nami/Twitter

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

N'ụbọchị Tuzde, Buhari họpụtaral Edward Adamu dịka onye weghaara ọkwa onyeisi Amcon n'aka Muiz Banire bụ onye nọ n'isi n'ụlọrụ ahụ na-ahazi akụnaụba Naijiria kemgbe afọ 2018.

Nke a na-eme dịka kpọtụchara na Monde na Buhari were ọkwa onyeisi ngalaba na-ahụ maka ụtụ isi bụ nke Babatunde Fowler ji nye Muhammad Nami.

Nhọpụta Muhammadu Buhari họpụtara mmadụ abụọ si Ugwu Awụsa ịnọchị ọkwa abụọ na gọọmentị akpaliteela ọzọ okwu na ọ bụ naanị ndị si Ugwu Naijiria ka ọ kachasị enye ọkwa n'ọchịchị ya.

@ezemmuo_nkanu kwuru na nhọpụta Adamu ka ọ nọchie Banire ggosiri na Naijiria aghọọla ala Ugwu.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

@IamSheyiBright kwuru na anaghị eke oke Naijiria dịka atụmatụ Federal Character siri kwuo.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Mohammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Buhari o ga-enwe ike merị Boko haram?

BBC Igbo mere nnyocha ndị ji ọkwa dị mkpa na gọọmenti a na-ebe ha si iji mata n'ezie okwu adị n'ihe ha na-ekwu.

Lee ihe anyị chọpụtara banyere ndị bụ isi ụfọdụ ụlọọrụ nakwa mpaghara ha si:

Mịnịsta na-ahụ maka ego

Mịnịsta: Zainab Ahmed

Mmanụ agbịdị(Petroleum)

Mịnịsta nta: Timipre Sylva

Mịnịstrị na-ahụ maka njem ụgbọelu

Mịnịsta: Hadi Sirika

Mịnịstrị na-ahụ maka njem

Mịnịsta: Rotimi Amaechi

Mịnịstrị mgbasaozi

Mịnịsta: Lai Mohammed

Mịnịstrị na-ahụ maka agụmakwụkwọ

Mịnịsta: Adamu Adamu

Cheta na Buhari nọbụrụ n'ọnwa ọgọstụ afọ 2019 wepụta akwụkwọ ndị mịnịsta ya na ha ga-anụ ọrụ nke ụfọdụ katọrọ sị na o nyere ndị Ugwu ohere karịa agbụrụ ndị ọzọ.

Mana ụlọọrụ onyeisiala gbaghara nkatọ ahụ si na o sitere na steeti ọbụla dị na Naijiria họrọ mmadụ.

Akụkọ ga-amasị gị: