Ministerial Screening: Ụfọdụ ihe ịrịbaama mere na nhọpụta ndị ọchịchị e mere n'ụlọomeiwu ukwu

Ebe foto si, Nigerian Senate/ Facebook
Ihe mbụ gbagwojuru anya bụ na nwaanyị mbụ bịara ya bụ nnyocha bụ Sharon Ikeazor sị Anambra steeti enweghị ajụjụ ajụrụ ya.

Ebe foto si, Sharon Ikeazo/Twitter
Kama ha sị ya gbuchapụrụ ndị omeiwu gawa maka ọ bụ nwaanyị n'ihi na ihe nwaanyị na-adị ha mma.
Onye ọzọ kpara ụka ọchị ebe ahụ bụ Dede Rochas Okorocha bụ onye juru Olamilekan Adegbite nke Ogun steeti ihe ọ ga-eme ịweta obi aṅụrị na Naịjirịa ọkachasị ugbua obi aṅụrị kọrọ ụkọ n'ala a.

Ebe foto si, Facebook/Rochas
Cheta na Rochas Okorocha hibere ministrị na ahụ maka obi aṅụrị mgbe ọ bụ gọvanọ Imo steeti.
Ihe gbasara obi aṅụrị na-echu ya ụrọ.

Ebe foto si, Ewhrudjakpo Lawrence/Twitter
Nwaamadị ọzọ jụrụ ajụ atụghị anya ebe ahụ bụ Ewhrudjakpo Lawrence bụ onye juru sị "ụgbụa gọọmenti etiti kwusigoro ịta akpụka anụ bụ kanda, bụ nke na enya ha obi aṅụrị, kedụ ụzọ ọ ga-esi wete obi aṅụrị n'ụlọ ndị mmadụ?"
Ndị mmadụ kwachakwara ọchị na ya bụ ajụjụ.
Nke ọzọ bụ Enyinnaya Abaribe gwara Godswill Akpabio na-enwezụga na ha kwekọrịtara na onye bụbu onye otu ha ga-egbuchapụrụ ha na-azaghị ajụjụ ọbụla, na ya kara ịme ya ka ọ gbaa ọsịsọ.
Ndị Sineti gwakwara Rotimi Amechi ankwa George Akume ha gbuchepụrụ ha gaa ihu na-azaghịa ajụjụ ọbụla.
Akụkọ ga-amasị gị









