Maersk MD: Gịnị ka i kwesiri ịma tupu ị nabata onye odibo

Di na nwunye

Ebe foto si, BERNADETT KURUCZ/FACEBOOK

Onye bụ onye ahụ ị chọrọ ka ọ bụrụ onye enyemaaka n'ulọ gị?

Akụkọ dị iche iche na-apụta n'oge gara aga na-egosi etu ndị enyemaaka na-atọ ụmụaka maọbụ gbuo ndị 'ọga' ha.

Nke fotere chi taa bụ ụbọchị iri ọnwa Disemba, 2019 bụ akụkọ etu onye ọrụ ọkụ latrịk na-arụrụ onyeisi ụlọọrụ Maersk si gbuo nwunye ya ma merụọ 'ọga' ya ahụ.

Ndị uweojii nọ na Legọsị kwuru na ha anwụchiela mmadụ abụọ a na-eche kpara mkpa a.

Nke a abụghị nke mbụ a na-anụ udiri akụkọ a na Naịjirịa mana gee ntị ka ị mata ụfọdụ ihe ga-enyere gị aka ịgbanahụ ọnwụnwa ndi odibo na-ebute.

Onye nyemaaka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ezinaụlọ na-emegbu ndị nyemaaka ha

Ihe niile di mkpa ma ị na-achọ onyeenymemaaka

BBC Igbo gbara otu nwaanyị aha ya bụ Joke Afolabi bụ onyeisi ụlọọrụ na-ezipu ndị ọrụ enyemaaka a kpọrọ 'Conciege and Home Care Services' ajụjụ ọnụ gbasara okwu a.

Onye nyemaaka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye nyemaaka na-arụ ọrụ dị iche iche n'ime ụlọ

Afolabi kwuru na ọ bụ eziokwu na ụlọọrụ ha na-ezipu ndị mmadụ dịka ndị enyemaaka gawa ụlọ dị iche iche mana ha na-agba mbọ hụụ na ndị niile ha tinyere n'ọrụ bụ ndị mara ihe a chọrọ n'ụwa.

Onye ọzọ aha ya bụ Christanah Akindolie bụ onye ọrụ ndụmọdụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ọ dị ezigbo mkpa ka ị bụrụ onye na-edo anya, onye nwere ọchịchọ ịmata ihe niile.

Ajuju asaa ịkwesiri ịgba onye ọbụla chọrọ ịbụ onye enyemaaka gị

Onye nyemaaka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Gba mbọ hụ ọbụghị nwatakịrị bụ onye nyemaka gị

1. Gịnị mere i ji hapụ ebe ị na-arụ n'oge mbu?

Dịka ọ na-eme nkọwa a, lee anya ka ị mara n'okwu ya ọ na-adaba.

2. Ebe ka i si bịa? Onye bụ nne na nna gị? Ezinaụlọ gị?

3. Nata ya aha na akara ekwenti onye ọ rụrụ ọrụ n'aka ya tupu ọ bịa na nke gị.

4. Lee uda olu ya nakwa omume ya mgbe ọ na-asa gị okwu.

5. Nye ndị uweojii aha ya, ka ha nyocha ọfụma mara ma ọ bụ onye nupuru isi n'iwu, maọbụ onye ha na-achọ achọ.

6. Kpọrọ ya gaa ụlọọgwụ ka ha nyocha ya, ka ha mara ma ọ dị ime, maọbụ o nwere ọrịa mmịnwụ(HIV), ịba ojii (hepatitis) nakwa ụkwaranta (tuberculosis.)

Ha nyochakwa ụdi ọbara dị ya na-ahụ(blood group) maka adịghị a ma ama.

7. Lebanye anya na ndị kwudoru ya dịka onye akaebe.

Akụkọ ga-amasị gị

Aha onyonyo, Ọgbambọ: Lee ka ị ga-esi ji teknụzụ ree ahịa gị