Amcon: Buhari emeela Adamu onyeisi

Ebe foto si, Edward Adamu/Facebook
Buhari ahọrọla Edward Adamu n'ọrụ dịka onyeisi otu na-ahazi akụnaụba gọọmentị nke a a kpọrọ Amcon( Asset Management Corporation of Nigeria) n'aha ịchafụ.
Nhọpụta dị n'ozi nke onyeisiala Buhari zigara ndị ụlọomeiwu ukwu ụbọchị Tuzde.
Adamu ga-anọchị Muiz Banire , onye e mere onyeisi Amcon n'afọ 2018.
Ndị ọzọ Buhari họrọ ọrụ gụnyere Godwin Emefiele, ụlọakụ etiti Naijiria(Central Bank of Nigeria), Ladidi Bara'atu Mohammed dịka onye isi ụlọọrụ ọkaiwu ukwu Naijiria, (Office of the Attorney-General of the ederation), nakwa Fatima Z. Hayatu dịka onyeisi mịnịstrị na-ahụ maka ego.
Akụkọ ka na-abịa...
Onyeisiala Buhari agaala Ijipt
Nke dịka ibe ya bụ na onyeisiala Buhari ahapụla Naijiria n'ehihe taa bụ Tuzde gawa Eypt maka ọgbakọ udo na ọganihu Afrịka.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Orji Kalu ga-anata ụgwọ ọnwa ya n'uju
N'agbanyeghị na atụọla ya nga mkpụrụ ọka, Orji Uzor Kalu ga-anata ụgwọ niile ruru ya dịka onye omeiwu n'uju.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ala Naịjirịa a ga-ama jijiji?

Ebe foto si, PA
N'egwuregwu, Anthony Joshua onye kụrụ Andy Ruiz Jnr isi aba oku na Satọde iji nata ọkwa ọkaibe mbaụwa na ịkpụ ọkpọ ekwuola na ọ ga amasị ya inwe asompi ịzọ ọkwa ya n'ala Naijiria.
Ọ bụrụ na o mee otu a nke ga-abụ mbụ a ga akụ ọkpọ mbaụwa n'Afrịka ma e wezuga South Africa.
A maala otu nwaanyị ikpe ọnwụ n'Ebonyi

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe dị n'Ebonyi Steeti amala otu nwaanyị a kpọrọ Agnes Nwefuru bụ onye gburu nwunye di ya na ụmụ ya asaa ikpe ọnwụ.
Ọkaipke Uwabunkonye Onwosi sị na a ga-akwụ nwaanyị a ụdọ maka ịkpọ nwunye di ya na ezinaụlọ ya ọkụ.
Mkpamkpa a mere n'afọ 2017 n'obodo Ishielu dị n'Ebonyi Steeti n'elekere atọ nke isi ụtụtụ mgbe nwaanyị ahụ mụnyere ọkụ n'ụlọ ndị a.
Ọkụ a gburu mmadụ asatọ n'ezinaụlọ ahụ mana naanị mmadụ abụọ ka a zọrọ ndụ.
Gọọmentị Ebonyi steeti kpọpụrụ nwaanyị n'ụlọikpe maka ichekwa onwe ya na ụmụ ya tupu ọ gbaa nke nwunye di ya ọkụ.
JAMB agbarụọla ihu maka agwa ndị Mahadum

Ebe foto si, Jamb/Facebook
Ụlọọrụ ule JAMB agbarụọla ihu etu ụfọdụ mahadum ji e si n'azụ anabata ụmụaka n'ụlọakwụkwọ ha ma kwuo na ha ga-ata mahadum ndị a ahụhụ.
JAMB gara n'ihu kwuo na nwata akwụkwọ ọbụla aha ya na-adịghị na websaịt ha mara na ọ nọghị na Mahadum ọbụla.
Unu agbazila 'knockout' - Uweojii Enugwu

Ndị uweojii Enugwu Steeti adọọla ndị mmadụ ọkachasị ụmụaka aka ntị ka ha ghara ịgba egbe ntụ a kpọrọ 'Knockout' n'oge ekeresimesi a.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ Ebere Amaraizu sị na nke a bụ maka nchekwa n'obodo.
N'ofesi

Ebe foto si, EPA
Otu onye oji egbe agbagbuola ihe ruru mmadụ isii n'otu ụlọọgwụ dị na mba Czech Republic ma gbagbuo onwe ya n'akụkọ ebe ahụ.
Ndị uweojii hụrụ ozu nwoke a dịka ọ tọgbọ site n'ọnya egbe ọ gbara onwe ya n'isi.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi otu egwuregwu Barcelona bụ Josep Maria Bartomeu sị na Pep Guardiole nwereike ị loghachị na Barcelona ma ọ bụrụ ma ọ chọ.
Cheta na Guardiola mere nkeọma mgbe ọ bụ onye nchịkọta Barcelona ebe ọ mabutere ọtụtụ iko.
Nkeji ehihie
Onyeisiala Buhari ga-aga Ijipt

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buharị ga-ahapụ Naịjirịa taa gawa Aswan dị na Egypt maka ọgbakọ a haziri iji wulite udo n'etiti mba Afrịka niile.
Ọgbakọ a nke onyeisiala mba Ijipt bụ Abdel Fatta El-Sisi na-ahazi ga-amalite n'ụbọchị iri na otu ruo ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Disemba 2019.
Naịjirịa ji ndị ọrụ ngo ijeri naịra 306 n'ụgwọ

Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Babatunde Fashola ekwuola na ihe dịka n'ọnwa Ọktoba nke afọ a na ụgwọ gọọmentị etiti ji ndị na-arụ okporoụzọ ruru ijeri narị naịra atọ na isii.
O kwuru nke a mgbe otu jịkọtara ndị nwee ụgbọala e ji eme njem kpọtụrụ ya n'isi ụlọọrụ ya dị n'Abuja.
N'ofesi

Ebe foto si, Michael Schade
Praịm minista mba New Zealand, Jacinda Ardern ekwuola na ọ dịka onweghi onye fọrọ ndụ na mpaghara agwaetiti ọcha e nwere mgbawa ugwu a kpọrọ volcanic eruption.
Chaị! ọ dị egwu ooo!
A na-eche na n'ime mmadụ iri na atọ o metụtara na mmadụ ise n'ime ha anwụọla pịịị ebe a ka na-achọ mmadụ asatọ achọ.

Ebe foto si, Reuters
Ọ dịka agbụ enweteghi mmeri kere ndị Arsenal a hapụla ha dịka ha si n'azụ were ọkpụ atọ asatara otu merie West Ham united
Nke a ga-abụ mmeri mbụ ha n'ime asọmpi iri ha gbara n'otu usoro.
Nkeji
Ihe nkiri











