A maala ndị tọọrọ ma gbuo ụkọchuckwu ụka Katolik ikpe ọnwụ

Ndị ụlọikpe ukwu dị na Makurdi, Benue steeti ekpebiela ka a kwụgbuo mmadụ abụọ, Hartuna Idi na Suleiman Gina bụ ndị fọrọ na ndị tọrọ ma gbuo Fada John Adeyi rue oge ha nwụrụ maka ihe ha mere.
Cheta na ndị ntọọ mmadụ anọ gụnyere Saidu Abdullahi na Aliyu Garba tọrọ Fada Adeyi, onye Vika-Jenaraalụ ụka Katọlik n'Otukpo Dayosis, Benue steeti, gbuo ya ma tufuo ozu ya n'ime ugbo dị nso na Otukpo n'afọ 2016.
Mana e mechara ndị uweojii nwuchie ha anọ, ha kwupụta na ha natara ezinaụlọ ụkọchukwu ahụ otu nde naira na ụma(N1.7m) dịka ego isi ya mana ha gbagburu ya oge ha nụrụ na ndị obodo jikere ịbịa gbapụta ya ebe ha nwụchiri ya.
Otu n'ime ha kwupụtara na ọ bụ ya gbara ya egbe gburu ya, ebe a mara mamdụ abụọ fọrọ n'ime ha ikpe ọnwụ taa bụ Wenezde.
N'ozi ezinaụlọ ụkọchukwu ahụ zigara ụlọakụkọ Daily Post, ha gosiri afọ ojuju na n'ikpeazụ, ikpenkwụmọtọ erutela ha aka.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mana ha tụrụ arịrị na mkpebi ahụ chetara ha ogbugbu n'ike e gburu Adeyi, onye bụ ọkammụta.





