Maersk MD: Etu onye na-arụrụ ha ọrụ si gbuo nwụnye onyeisi Maersk na Lagos

Ụlọ ọrụ Maersk so n'ụlọ ọrụ kachasị buo ibu n'ihe banyere njem ngwaahịa n'elu mmiri

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ụlọ ọrụ Maersk so n'ụlọ ọrụ kachasị buo ibu n'ihe banyere njem ngwaahịa n'elu mmiri

Onyeisi ụlọọrụ Maersk nọ n'ụlọ ọgwọ alụ ọgụ ọnwụ na ndụ dịka onye na-arụrụ ha ọrụ latrik wakporo ya ma gbuo nwunye ya n'abalị Sọnde.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Elkana Bala gwara BBC Igbo na Olamide Goke bụ onye na-arụ ọkụ latrịk kpọrọ enyi ya nwoke bụ Ade Akanbi ka ha ga ohi n'ụlọ Gildas Tohouo.

Bala sị na mmadụ abụọ nwetere ohere ịbanye be Maazị Tohouo, bụ onye Kamerun, makana Goke na-arụrụ ya ọrụ ma bụkwara onye ama ama n'ụlọ ahụ.

Dịka uweojii siri kwuo, mmadụ abuo gara n'ihu wakpo Tohouo, jiri mma makasị ya na nwụnye ya bụ Bernadette Tohouo ahụ.

Ka ihe a na-eme, dịka ndị uweojii siri kwuo, he nwetere ozi ma wụchie ebe ahụ.

Bala sị: "Ndi uweojii nọ n'Ikoyi ruru ma nwụchie ndị kpara mkpa mkpa a n'ebe ahụ."

Akpọrọ di na nwụnye a awakporo gawa ụlọ ọgwụ mana odoziakụ Tohouo anwụọla.

"Maazị Tohouo n'onwe ya ka dị ndụ ma na-anata ọgwụgwọ."

Maazị Bala si na Goko na Akande kwetere na ọ bụ ha kpara ya bụ arụ.

Ọ sị na ha sara ajụjụ ihe mere ha jiri kpaa ike a etu: "Ọ bụ ohi ka anyị gara."

Bala si na ya nwetere "ATM" na akpa ego dị ha zutere n'aka ha."

Ọ sịkwa na Goke sị na on were oge ya sị ka Maazị Tohouo binye ya ego ọ jụ, nke so bụrụ iwe ya o jiri gawa ohi na be ya.