Nwaagbọghọbịa ọzọ anwụọla n'ụlọ oriri na nkwari na Delta

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii ekwuola na ọ bụ eziokwu na otu nwaagbọghọ nwụrụ n'ụlọ oriri na nkwarị dị n'Amukpe Sapele, Delta steeti ụbọchị Tọzde.
Akụkọ na-ekwu na ndị na-arụ n'ụlọ oriri na nkwarị ahụ chọpụtara na nwaagbọghọ a nwụrụ oge nwoke kpọ ya laba n'abalị na-achọ ịhapụ ụlọ oriri ahụ laa.
Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Delta bụ Onome Onovwakpoyeya gwara BBC n'ekwentị na nwaagbọghọ ahụ, nke a mabeghị aha ya, anwụghị n'ụlọ oriri ahụ. kama ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ.
"Ya na nwoke labara ụra, ọ rịabara ahụ n'abalị, e buga ya ụlọọgwụ ọ nwụọ."
Onovwakpoyeya gara n'ihu kwụọ na ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ maka ya bụ okwu.
Cheta na abali olemole gara aga, a tọgburu ụmụagbọghọ abụọ n'ụlọ oriri na nkwari otu n'Owere, nke ọzọ na Pọtakọt.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:





