Everton vs Chelsea: Everton ewerela ajị imi Chelsea kpọrọ ụtaba

Tammy Abhraham

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mbo niile Tammy Abraham gbara taa amutaghị mkpụrụ

Ndị otu egwu bọọlụ Everton mere ndị nke Chelsea ihe a na-eme nwata ntị ike.

Everton mere ihe a na atụghi anya ya dịka ha ji ọkpụ goolu atọ asatara nani otu merịa ndị otu egwu bọọlụ Chelsea.

Mmeri a na atọ ha ụtọ n'ihi na ha enweghị onye nkụzi dịka ha chụrụ Marco Silva n'ụbọchị 7 Desemba 2019.

Ọ bụ Duncan Ferguson nọchitere dịka onye nkuzi Everton .

Ndị otu egwu bọọlụ Everton

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Obi bụ ndị Everton pọlịnapọlina dịka ha merrir ndi Chelsea were gbagote na gba nke 14

Everton kpughere ite goolu ha na nkeji nke ise mgbe Richarlson De Andre ji isi were nye goolu were sị ndị Chelsea nnọọ.

Chelsea gbaliri ike ha ịsa goolu a mana ndị nchekwa goolu Everton jị odeshi.

Na gba nke abụọ ka Dominic Calvert-Lewin mezuru ya abụo dịka eji nkeji anọ banye na gba nke abụọ

Chelsea gosikwara na ọ bụ nwoke na ibe ya na-emekọ ihe mgbe Mateo Kovacic zahachiri ha were nye ndị Chelsea olileanya.

Kama olieanya ha dara mba mgbe Calvert-Lewin mezuru ya atọ were tịpịa olileanya niile ndị Chelsea nwere.

Dịka ichu ndị nkụzi otu egwu boolụ na-ewu na 'Premiership', oge oruola mgbe Lam[ard jị akwara ngwongwo ya?

Akụkọ ga-amasị gi