Reinhard Boonke: A na m ekpere ezinụlọ ya ekpere nkasị obi - Gov. Ifeanyi Okowa

Ebe foto si, Reinhard Bonnke/Facebook
Ndị ofufe nke Kraist nọ n'ụju dịka ha nụrụ na Reinhard Bonnke anwụọla.
Nke a na abịa dịka nwunye ya bụ Anni Bonnke kwuputara ya na 'Facebook'.
Bonnke gbara afọ iri asaa na itolu tupu ọ laa mụọ.
Ọ lụru nwunye ya n'afọ 1964 ma ha mụtakwara ụmụ atọ na ụmụụmụ asatọ.
O bidoro mgbasa ozi nke Kraist n'afọ 1967 na Lesotho.
Ọ bụ n'afọ 2017 ka Reinhard Bonnke mere mgbasa oziọma nke Kraist a na-akpọ 'Christ for All Nations' nke ikpeazu na Naijirịa.
Dịka ụlo mgbasa ozi CBN siri kọwa na Bonnke nyefere ọchịchị mgbasa ozi ya n'aka Daniel Kolenda maka ahuisike.
Otutu ndị ndu na ndị ofufe nke Kraist uwa niile gosipụtara iri ụjụ ha, lee ihe ụfọdụ n'ime ha kwuru
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2

End of X post, 3

End of X post, 4

End of X post, 5
N'Akụkọ ọzọ

Ebe foto si, EFCC
Gọọmenti etiti anapụla Paschal Obi bụ bụ onye odeakwụkwọ Rochas Okorocha ụlọọgwụ ya akpọrọ "Dews of Hope Hospital".
Ngalaba EFCC dere n'akara Twitter ha na ọ bụ Ọkaikpe T.G Ringin nyere iwu ịnapụ ụlọ ọgwụ a n'Owere ụnyaahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6
Ọkaikpe Ringim nyere iwu a n'Ụlọikpe Ukwu nke dị n'Owere dịka Ọkaikpe A.T Mohammed nyeburu iwu n'ụbọchị nke 22 nke ọnwa Ọgọstụ ka gọọmentị jide ya bụ ụlọ ọgwụ nwamgbenta.
EFCC si na nke a bịara dịka ha na-enyobu na ego gọọmneti Imo bara na ya bụ ụlọ ọgwụ.
Maazị Obi bu onye nwe ya bu ụlọ ọgwụ bụ bụ onye odeakwụkwọ Rochas Okorocha mgbe ọ bụ aka na-achị Imo steeti.

Abike Dabiri-Erewa agbaruọla ihe maka mwakpo Amaechi

Ebe foto si, @abikedabiri
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdịnamma ndị Naịjirịa nọ mba ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa agbaruọla ihu maka mwakpo awakporo Minista na-ahụ maka Njem bu Chibuike Amaechi.
Odoziakụ Dabiri-Erewa kelere ndị uweojii Spain maka mbo ha gbara ichekwa ndụ Maazi Amaechi ma rịọ ndị Naịjirịa bi ofesi ka ha were ezi agwa n'aga

N'Ofesi,
Mba Saudi Arebiya akatọọla mpka mkpa onye agha agha ha kpara na mba Amerịka ụnyaahụ
Mohammed Saeed Alshamrani gbagburu mmadụ atọ ma merụọ mmadụ asaa ọzọ ahụ n'ọdọ ndị agha mmiri Amerịka dị na obodo Pensacola tupu o gbuo onwe ya

N'egwuregwu
Otu egwu bọọlụ Chelsea wkuola na ngalaba na-elekọta egwuregwu bọọlụ bụ Fifa emeghị ha ọfụma n'ịmachi ha igote maọbụ ree mmadụ.
H asị na Fifa nyere otu Machester City ohere isi tụọ mgbere agbanyeghị na ọ iwu ha abụo dara di ka onwe ha.

Ebe foto si, Ministry of Transport
Otu Indigenous Peoples of Biafra (Ipob) nke Nnamdi Kanu bụ onyeisi ha ekwuola na ọ bụ ha wakporo Minista Njem bụ Chibuike Amaechi n'obodo Madrid di na Spain.
Ipob sị na ọ bụ ndị otu ha nọ na Spain Kpara mkpa mkpa ma kwukwa na ọ bụ ihe ga-echere ndị nọ n'ọchịchị na Naịjirịa ebe ọbụla a hụrụ ha.
Onye binyere aka n'akwụkwọ mgasaozi bu okwu bụ onye ama dịka Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru otu ahụ.
Ọ sị na ọ bụ Maazị Kanu nyere ha ikike ịkpa agwa ha kpara.
Cheta na Minista Amaechi dere n'akara Twitter ya na ndị ọ sị bụ ndị Naịjirịa mere ka ha wakpo ya na Spen mana ndị uweojii gbochiri ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 7
Ihe a mere Amaechi yiri ihe ndị Ipob mere onye bụbụ osote onyeisi Sineti bu Ike Ekweremadu na maba Jamanị.
Gọọmentị Naịjirịa machiri Ipob na Naịjirịa ma kpọọ ha otu na-eyi ndụ egwu.
Nnamdị Kanu n'onwe ya no n'ihu ikpe maka ebubo na o chọrọ itisa Naịjirịa tupu ọ gba ọsọ.

NBA sị ka onyeisi DSS rituo n'ọkwa

Ebe foto si, Olu Onemola
Otu ndị ọkaiwu akpọrọ Nigerian Bar Association na Bekee ekwuola ka onyeisi ụlọọrụ nchekwa eji DSS mara bụ Yusuf Bichi jiri ọso ọsọ rituo n'ọkwa.
NBA si na nke a bụ maka mwakpo ndị ọrụ DSS mere ụylọikpe Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu maka ịnwụchị Omoyele Sowore ụnyaahụ.

N'Ofesi,

Ebe foto si, Reuters
Otu onye agha mba Saudi Arebiya gbagburu mmadụ atọ ma merụọ mmadụ asaa ọzọ ahụ n'ọdọ ndị agha mmiri Amerịka dị na obodo Pensacola ụnyaahụ.
Nwoke ahụ mechara gbuo onwe ya mana Ron DeSantis bụ aka na-achị Florida sị na mba Saụdị Arebiya ji ndị nwe ndị eburu ụgwọ.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Ọ ga-akpọtụ akpọtụ taa na mba Saụdị Arebiya mgbe Andy Ruiz na Anthony Joshua ga-ezute ma suo ọkpọ n'elekere iri na otu nke abali.
Asọmpị a bụ mpiaghari nke ha piara n'ọnwa Juun 2019 oge Ruiz kpịaturu Joshua n'agba nke asaa.
Egwu Bọọlụ

Ebe foto si, Getty Images
Everton ejirila ọkpụ goolu asatara nanị otu were piawa ndị otu egwu bọolụ Chelsea azu.
Nke a na-eme na agbanyeghi na ndi Everton nyere onye nkụzi ha bụ Marco Silva ọso n'ụbọchị Fride.