Carlo Ancelotti abụrụla onye nchịkọta nke ise a ga-achụ n'ime otu ọnwa

Ebe foto si, Getty Images
Ajụjụ dị ọtụtụ ndị n'ọnụ ugbua bụ 'kedụ onye nchịkọta ọzọ oge ya ruru ịkwara pụọ?'
Nke a bụ maka etu Carlo Ancelotti si sonye na ndị a chụrụ achụ dịka Napoli nyere ya ọsọ n'abalị iri nke Disemba 2019, n'agbanyeghi na o meriri n'asọmpi Champions League.

Ebe foto si, Getty Images
Ọchụchụ Ancelotti chịkwaburu Chelsea bịara n'ihi na o nwetaghị mmeri n'ime egwuregwu itoolu ikpeazụ Napoli gbarala na Serie A.
N'otu aka ahụ, ndị mmadụ na-ajụkwa ma Premier League ejizi ụtalị mmụọ apịapụ ndị nchịkọta ha?
Gịnị mere ha ji ajụ ajụjụ a? Ọ bụ naanị onye uche ya na-adịghị n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ bụ onye amaghị na a chụọla ndị nchịkọta anọ n'ime otu ọnwa.
Tottenham

Ebe foto si, Getty Images
Tottenham malitere egwu oke a mgbe ha sepụrụ Mauricio Pochettinho oche n'otele.
Na-erughidị awa 24 e ji chụọ ya, a kpọta 'ọgba afa' nke egwuregwu bụ Jose Mourinho, ka ọ bịa gosipụta ike ya.
Arsenal

Ebe foto si, PA Media
Na-erughi otu izu, a dọrọ Unai Emery dọpụ n'ezi, sị ya kwara ngwongwo ya lawa.
Ha họpụtara Fredrik Ljunberg bụ onye gbabuuru Arsenal bọọlụ n'oge gara aga, ka ọ bụrụ onye nkuzi nchere oge.
Mana agbanyeghị nke a, Arsenal ka na-agbakwa ọnyụpa.
Watford

Ebe foto si, Reuters
N'ime otu izu ahụ onye nke Watford bụ Quique Sanchez Flores esorokwa ha n'azụ.
Nke Flores bụ na ekweghidị ya tụọ ute rahụ ụra tupu a wụọ ya mmiri oyi a iji kpọte ya n'ụra.
Florez nọrọ naanị ọnwa atọ n'ọkwa tupu a gbaara ya ụgbọ nwa mkpi.
Everton

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua Marco Silva esonyekwala na ndị anamachọọrụ.
Oteela atụwara anya na ndị Everton ga-enye Silva ọsọ.
Mana ọ bụ mmeri Liverpool meriri ha ụbọchị ụka gara aga ka
Ọchụchụ eleghi anya n'azụ a emeela ka ndị mmadụ na-ajụzị sị "Kedụ onye ụtalị mmụọ ga-ada n'azụ ọzọ?"
Ndị ọzọ e nwere ike inye ọsọ

Ebe foto si, Reuters
Onye ọzọ ọkụ nọ n'ike ugbua bụ Manuel Pellegrini, onye nkuzi ndị Westham.
Pellegrini meriri naanị otu n'ime asọmpi asaa ha gbara n'ọdị nso a.
Mmeri ha nwetara bụ n'aka ndị Chelsea n'abalị ikpeazụ nke ọnwa Nọvemba.

Ebe foto si, EPA
Ọzọkwa bụ onye nkuzi ndị Norwich bụ Daniel Farke.
Naani otu mmeri ka o nweterela n'ime asọmpi asatọ.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:










