EFCC vs Orji Uzor Kalu: Ụlọikpe akwụsịtụla EFCC ịkpụpụgharị Orji Uzor Kalu n'ụlọikpe

Ebe foto si, Orji Uzor Kalu/Facebook
Ọkaikpe Inyang Ekwo nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja nọọrọ n'ụbọchị Mọnde kwụsịtụ ụlọọrụ EFCC ka ha ghara ịkpụpụgharị Orji Uzor Kalu n'ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka ego.
O mere nke a mgbe ọ na-achabi ikpe n'elu mkpesa Kalu mere ka e gbochie ụlọọrụ EFCC ịkpụpụgharị ya n'ụlọikpe maka mpụ a sị na o mere mgbe ọ na-achị dịka gọvanọ Abia Steetị site n'afọ 1999 ruo 2007.
Ọ bụ ọkaiwu Kalu bụ ọkammụta Awa Kalu gbara akwụkwọ ahụ n'ụlọikpe.
Ọkaikpe a nyekwara Kalu ikike ka ọ maa EFCC aka n'ụlọikpe maka mkpọpụ ha chọrọ ịkpọpụgharị ya n'ụlọikpe.
E nyere ya ụbọchị asaa ịgbagharị ụlọọrụ EFCC akwụkwọ n'ụlọikpe.
Otu onye enyemaka Orji Uzor Kalu bụ sị gwara BBC na ọ bụ eziokwu na ụlọikpe kwụsịtụrụ ụlọọrụ EFCC ịkpupugharị Kalu.
Cheta na ụlọọrụ EFCC boro Kalụ ebubo izu ego ruru ijeri naịra asaa na ụma mgbe ọ na-achị Abia Steetị.
Ụlọọrụ EFCC chọrọ ka e buru ikpe ha na Orji Uzor Kalu gawa Legọs

Ebe foto si, Instagram/OUKgram
Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ebugharịala ikpe Orji Uzor Kalu bụ aka chịburu Abia steeti, onye ndị EFCC na-ebo ebubo izu ohi ijeri naịra asaa na ụma.
Ọkaikpe Inyang Ekwo yigharịrị ikpe a ka ọ bụrụ n'ụbọchị asaa nke ọnwa June.
Nke a bụ maka na ndị EFCC chọrọ ka ọ bụrụ na Legọs ka a ga-anọ ekpe ya bụ ikpe ọ bụghị Abuja.

Ebe foto si, Instagram/OUKGram
Chile Okoroma bụ ọkaiwu ndị EFCC gwara ụlọikpe ahụ na ihe niile e boro Orji Uzor Kalu enweghị nke mere n'Abuja, ya kpatara ha ji chọọ ka e buga ikpe ahụ na Legọs.
Okoroma kwuru na ha etinyela akwụkwọ maka nke a mana ha na-echezi mpụtara ya bụ akwụkwọ.
Nke a mere ka Ọkaikpe Ekwo kwuo na ọ bụ n'ụbọchị asaa nke ọnwa June ka a ga-ekpebi ebe a ga-anọ kpee ikpe ahụ, ma ọ ga-abụ n'Abụja, maọbụ na Legọs.
Orji Uzor Kalu abịaruola ụlọikpe dịka ikpe ya malitekwara ọzọ

Sinetọ Orji Uzo Kalu erutela ụlọikpe ukwu dị n'Abuja dịka a na-akwado ikpe ya ikpe ebubo izu ego karịrị ijeri naira asaa dịka ụlọ ọrụ ntaakụkọ Channels si depụta.
Orji bụ aka chiburu Abia steeti ga -abia n'ihu ọkaikpe Inyang Ekwo maka ebubo izu ego.
Cheta na ụlọikpe dị na Legọs mara Sinetọ Orji Uzoo kalu chịrị Abia steti site n'afọ 1999 ruo 2007 ikpe ije mkpọrọ ruo afọ iri na abụọ.
Ụlọikpe ahụ kpebiri sinetọ Kalu na ụlọ ahia ya bụ Slok Nigeria Limited, nakwa onye bụbụ onyeisi ndowe ego n'Abia Steeti, Jones Udeogu zuru ego ruru N7.1 billion n'akpa ego steeti ahụ.
Mana ọnụ na-ekwuchitere Orji Uzo Kalu kwuru na ebugharịala ikpe nke taa bụ February 2,2021 ruo June 7, 2021.
Orji Uzor Kalu: 'Mkpọrọ afọ 12 a gosiri na ịgbaba APC abụghị ịgbanarị ikpe - Rotimi Jacobs
Ọkaikpe Muhammed Idris maala Orji Uzor Kalu ikpe maka mpụ na nrụrụaka nke a malitere inyocha ya kemgbe afọ 2007 ọ chịchara dịka Gọvanọ.
A mara Kalu Ikpe ibuba ego dị ijeri asaa, iri isii na ise (7.65bn) bụ nke ha na Udeh Udeogu bụbu onye okwu ego dị n'aka na n'ụlọomeiwu Abia steeti mgbe Orji Uzo nọ na ọchịchị bubara mgbe ọ na-achị Abia steeti.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Nke a bụ afọ iri na abụọ e kpere ikpe a kwuru taa.
Ụlọikpe ukwu dị na Legọs nyere iwu ka ọ rahụ n'ụlọmkpọrọ Kirikiri bido taa, ma kwuo na o nwereike ịnọgide ebe ahụ ruo afọ iri na abụọ.

Ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) boro Kalu, Ụlọọrụ ya bụ Slok Nigeria Ltd and Udeh Udeogu ebubo ịchịba ego ndị Abia steeti karịrị narị ijeri asaa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ọkaiwu Rotimi Jacobs bụ ọkaiwu EFCC n'ikpe a sị na ha ga-ere ụlọọrụ ya bụ Slok Naịjirịa.
Ọ sị; "Ọ bụ kemgbe 2007 ka anyị malitere ikpe a, nke bụ na onye bụ Ọkaiwu Ukwu Naịjirịa n'oge ahụ bụ Michael Aondoaka chọrọ imebi ya bụ ikpe site na-ịsi na agaghị agbanwu onye ka sị ọchịchi rituo ikpe."
"Anyị lụrụ ọgụ ikpe a ruo afọ iri asatọ ma ruo Ụlọ Ikpe Ukwu.

"Ikpe gosiri na mmadu ekwsighi ịda mba n'ịchu eziokwu ma gosikwa na ọ ka nwere ndị ọkaikpe aka ha dị ọcha."
Ihe chere Maazị Kalu ugbua bụ mkpọrọ ihe ruru afọ atọ maọbụ afọ iri na abụọ maka otu ebubo n'ime ebubo iri atọ n'itoolu."
Ọkaiwu Kalu ekweghị ekwu okwu ka amara ya ikpe a.
Ọkaiwu Jacobs si na ihe a gosiri na mmadu banyere otu patị na-achị bụ All Progressives Congress (APC) ọ gbanarị ikpe.
Ọ sị; "Ihe a bụ gọvanọ anọ m so kpee ikpe ya."
N'ọnwa Epurel ka Ụlọ Ikpe Mkpesa dị na Legọs gbajọrọ arịrịọ Orji Uzor Kalu ka ọ sị na onweghi azịza maka ebubo na oriri ego Abia steeti mgbe o bu gọvanọ.
Ihe Kalu gwara kwuru ka o na-aga mkpọrọ bụ "2023 lekwa ka anyị na'abịa!"
Onye ntaakụkọ anyị hụrụ ebe a na-akpọba ya na mpaghara mkpọrọ dị n'ụlọikpe ukwu n'Ikoyi.












