Ovularia nwunye Zebrudaya: A ka dị m ndụ

Lizzy Evueme bụ onye e ji Ovuleria Urediya Nwaogbo mara sị na ọ ka dị ndụ na ọ nwụghị anwụ.
Mgbe BBC Igbo kpọrọ ya n'ekwenti ị mata nke bụ eziokwu, ọ sị na ọ ka dị ndụ ma nweekwa ahụike.
N'okwu ya "Adị m ndụ , nwee ahụike. Chineke akpọbeghị m, a mara m na m ga-anwụ mana ọ bụghị ma Chineke a kpọbeghi m".
Lizzy sị na o nweghi ọrụ ọ na-arụ ugbua, na ọ bụ ụmụ ya na-azụ ya nakwa elekọta ya anya.

Ebe foto si, Chika Okpala
Cheta na akụkọ malitere ifegharị na soshial midia kamgbe ụnyaahụ na 'Ovuleria Urediya' anwụọla.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Akụkọ ọzọ pụtara taa bụ na Ụlọikpe mkpegharị enyela Biodun Olujimi nke PDP mmeri dịka ọ gbara Senetọ Dayo Adeyeye nke APC akwụkwọ na ya ekweghị na mkpebi Inec na ntuliaka ha mere.
Cheta na Ụlọikpe napụrụ ndị APC ara n'ọnụ dịka ha enyere Ifeanyi Uba na Obinna Chiduka bụ ndị mmeri na Anambra steeti.
Boris Johnson agbaala afa Brexit

Ebe foto si, @BorisJohnsonTwitter
Kedụ nke na-akpọtụ maka Brexit?
Nke na-eme ebe ahụ bụ na Onyeisi mba ahụ bụ Boris Johnson sị na ọ bụrụ na ya merie ntuliaka ha ga-eme na Disemba na ya ga-akpọpụta Briten na EU na Jenuwarị.
Ka ọ na ekwu nke a, otu onye na pati ha bụ Alun Cairns agbaala arụkwaghị na ya bụ pati.
Nicole Adams alaala ezuike

Ebe foto si, Nicoleadamsobe/Instagram
N'egwuregwu, nwaagboghọ na-akụrụ mba Briten ọkpọ bụ Nicola Adams bụ nke ji ọlaedo abụọ nke ogogo Olympic sị na ya ga ala ezumike n'afọ 37.
Ọ sị na-egwu ịkụpịa ya anya ji ya dịka ọ na-ekele ndị niile kwadoro ya.
Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji
Ụbọelu Airpeace lọghachịrị azụ na njem ya

Otu Ụgbọelu Air Peace kwesiri ịsi Legọs fega Owerre emeela ntụgharị gbatagbata.
Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ Air Peace bụ Stanley Olisa kwuru na ụgbọelụ ahụ efenyiela tupu ọkwọ ụgbọelụ achọpụta na otu injin ya nwere nsogbu ma tụgharịa feghachi Legọs.
Ọzọ,

Ebe foto si, Femi Falana's Facebook page
Otu ụlọikpe na Legọs enyela iwu ka ndị agha Naịjirịa kwụsị atụmatụ ha kpọrọ Operation Positive Identification.
Onye ọkaiwu ukwu bụ Femi Falana bụ onye gbara ndị agha akwụkwọ kọwara na atụmatụ ahụ megidere iwu kpuchiri ọchịchị Naịjirịa.
Na mba ofesi,

Gọọmentị Zimbabwe achụọla dọkịta karịrị iri asaa n'ihi isonye na ngagharịwe ndị dọkịta na-eme kemgbe ọnwa sepụtemba maka ụgwọ ọnwa.
Ndị dọkịta kwụdosiri ike na-eme ngagharịwe n'agbanyeghị na n'ọnwa ọktoba, otu ụlọikpe kpebiri na ngagharị iwe ahụ dara iwu
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Alexandre Schneider - FIFA
Ugo obere Naịjirịa adapụla na njem ịbụlata iko mbaụwa afọ 2019 nke ndị obere, dịka mba Netherlands ji ọkpụ goolu atọ asatara otu merie ha n'ụtụtụ Wenzde.
Olakunle Olusegun bụ onye nyere otu goolu Naịjirịa na ya bụ asọmpị.











