Ikoyi Prison: Ọkụ latrik adọgbuola mmadụ ise n'ụlọmkpọrọ

Ebe foto si, Getty Images
Ọkụ latrik adọgbuola mmadụ atọ na-ezuike n'ụlọmkpọrọ Ikoyi nke dị na Legọs.
Otu onye na-arụ ọrụ ebe ahụ achọghị ka akpọ aha ya gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọdachi a mere n'ezie.
O kwuru na ọ bụ mgbe eweghachitara ọkụ ka eriri bu ọkụ latrịk dobiri metụ akwa igwe ebe ndị ahụ dina ezuike.
O kwukwara na ọ bụrụ na ihe mere n'abalị ọ kara ịka njọ n'ihi na ụfọdụ n'ime ha agaala ụlọikpe mgbe mkpamkpa a kpara.
Atụọla onye uweojii na Saut Afrịka nga afọ iri atọ maka igbagbu nwaafọ Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọ mgbasa ozi dị na Naịjirịa ekwuola na ụlọikpe dị na Saụt Afrịka atụọla onye uweojii aha ya bụ Austin Reynold nga afọ iri atọ maka igbagbụ nwaafọ Naijiria bụ Ebuka Okoli n'anya ọcha.
Ụlọ mgbasa ozi a na-akọwa na-eboro Reynold onye gbara afọ iri abụọ na anọ ebubo ịgbagbu Okoli ma zuo ya ohi n'obodo Durban nke dị na Kwa Zulu-Natal Saut Afrịka.
Ọ bụ onye uweojii ibe ya bụ Brinley Pallo gbara ama megide ya mgbe ọkaiwu bụ Shyam Gyanda na-ekpe ya bụ ikpe.
Ụlọikpe tụrụ ya nga afo iri atọ n'ụbọchi Mọnde mgbe ikpe igbu ọchụ mara Reynold n'abalị atọ gara aga (Frịde).
Ndị omekome na Saut Afrịka

Ebe foto si, SA Police Service/Facebook
N'akụko ọzọkwa ndị uweojii Saut Afrịka anwụchiela mmadụ atọ bụ ndị otu na-akpa nkata iwakpo ndị mmadụ na Saut Afrịka.
A hụrụ egbe na ogbunigwe n'aka ndị otu a bụ National Christian Resistance Movement na-ama ọkwa nata ike ha sị a napụrụ ndị ọcha.
Onyeisi ndị otu a bụ Harry Knoesen na-ama ọkwa ka ndi ọcha bị na Saut Afrịka bịdo ibuso agha iji zọo ndụ ha.
Ọ sị na ọ bụ Chukwu gwara ya ka ọ naghachi ike ekwnsu ji ndọrọndọrọ ọchịchị napụ ndị ọcha.
Knoesen bụ onye ndụ nke Kraịst lara ezumike nka.
N'Akụkọ ọzọ

Ebe foto si, Getty Images/ Twitter-@VirgilvDijk
Taa ka a ga-amata onye ga-eturu ugo Ballon D'or bụ nke a na-enye onye kacha mara agba bọọlụ n'ụwa.
Ka ọ dị ugbua, o doro anya na ọbụ Lionel Messi, Virgil Van Dijk maọbụ Cristiano Ronaldo ga-eturu ugo a.
Cheta na ọbụ Messi tuuru ugo ọkacha agba nke ndị Fifa n'ọnwa Sepụtemba.
Ebe Van Dijk tuuru ugo nke UEFA n'ọnwa Ọgọst.

Ebe foto si, Getty Images
Messi na-agbara otu bọọlụ Barcelona nke dị na mba Spen, Van Dijk na-agbara ndị Liverpool nke mba Ịngland, ebe Ronaldo nọ Juventus nke mba Ịtali.
Luka Modric, onye na-agbara Real Madrid nke Spen bụ onye tuuru ugo a n'afọ gara aga.
Mana aha ya adịghị na ndị ga-eso zọọ nke afọ a.
Ikpeazu enyela ndịisioche okpuru ọchịchị ọsọ

Ebe foto si, @okezieikpeazu
Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu achụọla ndị isioche okpuruọchịchị iri na asaa nke steeti ahụ na ndị osote ha, họpụta ndị ọhụrụ.
Dịka odeakwụkwọ mgbasa ozi steeti ahụ bụ Onyebuchi Ememanka siri dee na akwụkwọ, ndị ohụrụ a esobuola n'ọchịchị di iche iche na steeti ahụ kamgbe 1999.
Ememanka kwuru na aha ndị ahụ eruola ndi omeiwu steeti ahụ aka maka nnyocha na ibinyeaka.
Ndị isioche ọhụrụ a bụ ndị a:
Victor Ubani (Aba North)
Cherechi Wogu (Aba South)
Maurice Okoro (Arochukwu)
Hagler Okorie (Bende)
Udo Nwogwugwu (Isiala Ngwa North)
Chief Nkem Onwubiko (Isiala Ngwa South).
Stanley Ojigbo (Ikwuano)
Osita Igbe (Isuikwuato)
Kingsley Nnaji (Obingwa)
Fred Idika (Ohafia)
Ikechukwu Nwabeke (Osisioma)
Chief Lucky Akabuike (Umuahia North)
Ndukwe Adindu (Umuahia South)
nakwa Matthew Ibe (Umunneochi).
Ọdọụgbọelu Enugwu

Ọrụ na-aga n'ihu nwayọ nwayọ n'okporoụzọ ụgbọelu si ada n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu.
Cheta na Mịnịsta njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika kwuru na a ga-arụcharịrị ọrụ n'ọdọụgbọelu ahụ tupu a gbaa Easter afọ 2020.
Lee ka ọrụ si aga:



Ganduje eburula bata ọzọ

Ebe foto si, Kano State Government
Gọvanọ Kano steeti bụ Umar Ganduje ezigala akwụkwọ ọzọ n'ụlọ omeiwu maka ikewapụta alaeze ọhụrụ anọ na steeti ahụ.
Aha alaeze anọ ọhụrụ a bụ Rano, Gaya, Bichi na Karaye.
N'ọnwa Mee afọ a ka Ganduje bu ụzọ kewaa alaeze Kano.
Ụfọdụ kwuru na nke a bụ iji megbute Lamido Sanusi onye bụ Emir nke Kano.

Ebe foto si, Getty Images
Mana Ganduje kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu.
Ụlọikpe mechara kagbuo alaeze anọ ahụ ma kwuo na okike ha adabaghị etu iwu si kwuo.
Anyị ga-achụ ndị mbịarambịara si azụ owere bata

Gọọmentị Naiịjirịa enyela iwu ka ndị mbịarambịara niile si azụ owere bata obodo a gaa debanye aha n'akwụkwọ ndi immigration tupu ọnwa Janụwari afọ 2020 eruo abalị iri na abụọ.
Emeghi otu a, onye mbịarambịara ọbụla e nwudere na-enweghị akwụkwọ zuru oke, a ga-achụla ya obodo ya ma machie ya ịbata Naịjirịa ọzọ.
Donald Trump na ndị omeiwu US

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi, onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump sị na ya agaghị aga ịza oku ndị omeiwu kpọrọ ya.
Ndịomeiwu ahụ ka na-acha Trump ọkụ n'ike n'ihi ebubo agwa na-ekwesịghị ekwesị.
Ndị ekperima akpaala arụ na Bokịna Faso

Ihe obi mgbawa mere na mba Burkina Faso mgbe ndị omekome wakporo otu ụlọụka n'obodo Hantoukoura ma gbagbuo mmadụ iri na anọ.
Amabeghị ndị kpara arụ nke a mana a na-arọ anya na o nwere ike ịbụ ndị otu oyi egwu a kpọrọ Jihadists mere ya.
Iheanacho ka anyi ga-eso

Ebe foto si, Getty Images
Kelechi Iheanachọ zọpụtara ndị otu egwu bọọlụ Leicester City na mgbede Sọnde mgbe o nyere goolu ikpeazu ha ji merie ndị Everton.
Nke a bụ asọmpi 'English Premier League' nke mbụ Iheanachọ na-esonye na ya kamgbe a malitere afọ EPL ọhụrụ n'ọnwa Ọgọst.
Goolu Iheanachọ mere ka Leicester kwụsie ike dịka ndị nke abụọ na tebulu EPL.
Akụkọ ga-amasị gị:









