Orji Uzor Kalu: Biko tọhapụnụ ma ka m gaa ụlọọgwụ

Aka chiburu Abia Steeti bụ Orji Uzor Kalu ebeela akwa begara ụlọikpe dị na Legọs na-arịọ ka atọhapụ ya na mkpọrọ.
Ọ bụ ọkaiwu Kalu rịọrọ ụlọikpe arịrịọ a n'ụbọchị Tuzde.
Kalu gwara ulọikpe na ahụ adịghị ya.
O kwukwara na ọrịa ya abụghị nke ụlọọgwụ dị n'ụlọmkpọrọ ga agwọtali.
Kalu rịọkwara ụlọikpe ahụ ka a tọhapụ ya n'ihi na ọ bụ onye omeiwu.
O kwuru na onweghị onye ga-anọchite anya ndị mpaghara ya n'ụlọ omeiwu ukwu, bụ ebe o ji ọkwa 'chief whip'.

Mana ngalaba EFCC gwara ụlọikpe ka ha gbachi Kalu nkịtị.
EFCC kwuru na ebe ọbụ na a tụọla Kalu mkpọrọ, onweghizi ike isi n'ụlọ mkpọrọ pụta ruo mgbe oge e nyere ya zuru.
Ọka ikpe Mohammed Liman kwuru na ya ga-ekpebi ikpe ahụ n'abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Disemba.
Onyeisiala Muhammadu Buhari
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Onyeisiala Muhammadu Buhari etinyela aka na bọjeti 2020 ugbua, dịka o kwupụtara n'igwe Twitter ya.
Agaghị m anabata nrụrụaka ntuliaka na 2023

Ebe foto si, @NGRPresident
Onyeisiala Muhammadu Buhari agwala ndị chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị n'afọ 2023 ka ha gbasie mbọ ike n'ihi na ọ ga-aghị anagide nrụrụaka na ntuliaka.
Ọ gwara ndị na-akwado iji ndị ọrụ nchekwa napụ ndị mmadụ vootu ha n'ike ka ha chee ya eche na ọ gaghị enwe ha ohere ahụ.
Buhari dọrọ aka na ntị a mgbe ọ na-anabata ndị ọrụ gọọmentị kpọtụrụ ya n'isiụlọọrụ n'emume ncheta ụbọchị ọmụmụ ya.
O kwuru ka onye ọbụla ejila aha ya achụnta vootu na ntuliaka afọ 2023, ka onye ọbụla rụọ ọrụ dịrị ya.
O metara buru

Ebe foto si, Reuters
Onyeisi ụka Katọlik bụ Pope Francis ewepula iwu na-egbochi ịgba ndị ụkọchukwu e boro ebubo ịmetọ ụmụaka n'anwụ
Nke a na-abịa dịka Pope Francis gbara afọ iri asatọ na atọ n'ụbọchị Tuzde.
O kwuru na ụkọchukwu ọbụla e boro ebubo ịmetọ ụmụaka ga-eji isi ya buru.
Ọtụtụ ndị ụkọchukwu Katọlik ka a na-ebo ebubo ịmetọ ụmụntakịrị.
Mana ọtụtụ n'ime ebubo a anaghị apụta ihe.
Mikel Arteta ọ ga-aga Arsenal?

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwu bọọlụ Arsenal na-atule ịhọrọ Mikel Arteta ka ọ bụrụ onye nkuzi ha.
Arteta gbabuuru Arsenal bọọlụ n'oge gara aga.
Ugbua, ọ nọ na Manchester City ebe ọ bụ osote onye nkuzi.

Ebe foto si, AFP
N'otu aka ahụ, ndị Everton na-atulekwa ịkpọta Carlo Ancelotti ka ọ bịa kuziwere ha.
Ancelotti akụzierela otu bọọlụ dị icheiche n'akụkụ ụwa niile.
Ha gụnyere Chelsea, Real Madrid, Juventus, AC Milan, Paris St Germain, Bayern Munich na Napoli.
Otu RevolutionNow emeela ngagharịiwe na Legọs

Ndị otu kpọrọ onwe ha RevolutionNow eburula ngagharịiwe gaa na 'Computer Village' dị na Legọs maka onyeisi ha bụ Omoyele Sowore nọ n'aka ndị DSS.
Otu na-akpọkwa oku sị ka a kagbuo iwu megidere soshal midia nke ndị ụlọomeiwu chọrọ iwepụta nakwa ihe ndị ọzọ.
A maala Perez Musharraf ikpe ọnwụ

Ebe foto si, Reuters
N'ofesi, amaala onye bụbu onyeisi obodo ala mba Pakistan bụ General Perez Musharraf ikpe ọnwụ.
A mara ya ikpe ọnwụ site na-ebubo eboro ya maka ịgba gọọmenti nke ọ nọ bụ n'isi ya site n'afọ 2001 ruo 2008 mgba okpuru. A malitere ikpe ya n'afọ 2013.
Liverpool na Aston Villa ga-ezute na mgbeda a

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu kee nkwụcha chebiri asọmpi Liverpool na Aston Villa mgbe ọ fọrọ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere asatọ nke abalịa.
Onye nkuzi ndị ntorobia Liverpool bụ Neil Critchley sị na ya dị njikere izute Aston Villa ma nweekwa obi isiike ịgbapụ ya mkpụrụ ọkwụru n'anya na agba nke anọ nke iko Carabao.
Naira Marley ọ banyela n'ofe ọkụ ọzọ?

Ebe foto si, @nairamarley
Otiegwu Naira Marley edepụtala n'akara twitter maka akụkọ o kwuru na-efegharị boro ya ebubo ohi ụgbọala.
O dere na ọ bụ ndị afọ ọjọ na-ebugharị akụkọ na-ekwu na o zuru ụgbọala.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Marley kwuru na agbanyeghị etu ụfọdụ ndị mmadụ si akatọ aha ya, na ya ga-abụrịrị onyeisiala Naịjirịa.
Akụkọ ahụ na-efegharịnụ kwuru na otu ụlọikpe enyela iwu ka a nwụchie Naira Marley maka ebubo ohi ụgbọala.
Cheta na o nwere mgbe ụlọọrụ 'Economic and Financial Crimes Commission' nwuchiri Marley maka ebubo mrụrụaka.
Buhari etinyele aka na Bọjet 2020

Ebe foto si, BashirAhmed/Twitter
Onyeisiala bụ Muhammadụ Buharị ga-ebinye aka n'akwụkwọ mkpata na mmefu akụ nke afọ 2020 dịka ọ na eme emume ụbọchi ncheta ọmụmu ya taa.
Ọ bụ n'ụbochị ise nke Disemba ka ndị ụlọ omeiwu nyere ikike ma kwenye na atụmatụ gọọmentị ga eji mefuo puku ijeri iri na ọma.
N'otu aka ahụ ka ndị ụlọomeiwu wepụtara puku ijeri naira anọ na ọma asatọ maka ikwu ụgwọ Naijirịa ji, wepụta puku ijeri naira abụo na ọma anọ ma tinye ijer naira atọ n'ego mmefu ndị ụlọomeiwu nke mere ka ego mmefu ha pụta otu nari ijeri naira na iri abụo na asatọ.
Onyeisiala bụ Muhammadụ Buharị ga-ebinye aka n'akwụkwọ mkpata na mmefu akụ nke afọ 2020 dịka ọ na eme emume ụbọchi ncheta ọmụmu ya taa.
Ọ bụ n'ụbochị ise nke Disemba ka ndị ụlọ omeiwu nyere ikike ma kwenye na atụmatụ gọọmentị ga eji mefuo puku ijeri iri na ọma.
N'otu aka ahụ ka ndị ụlọomeiwu wepụtara puku ijeri naira anọ na ọma asatọ maka ikwu ụgwọ Naijirịa ji, wepụta puku ijeri naira abụo na ọma anọ ma tinye ijer naira atọ n'ego mmefu ndị ụlọomeiwu nke mere ka ego mmefu ha pụta otu nari ijeri naira na iri abụo na asatọ.
APC agbagharala Okorocha na Okechukwu

Otu ndorondoro ọchịchị APC sị na ya agbagharala ndị niile ha machipuru maka ekweghiekwe ha.
Ndị a gụnyere Rochas Okorocha, Rotimi Akeredolu, Osita Okechukwu na ndị ọzọ.
N'akwụkwọ odeakwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Lanre Issa-Onilu dere, APC sị ndị a ha gaa mee udo na steeti ha dị iche iche ma soro ibe ha n'ọrụ mempe obodo
Boeing ga-akwụsịlata ịrụpụta 737 Max

Ebe foto si, Getty Images
Ozi anyị nụrụ na-ekwu na ụlọọrụ Boeing ga-emechinata ọrụrụ ụgbọelu ha bụ 737 Max na January.
Boeing kachiri ntị ịrụpụta ya bụ ụgbọelụ agbanyeghị na ọ kụjara ụgboro abụọ gbuo ọtụtụ mmadụ Indonesia na Ethiopia.
Ọ dịka uche Mikel Arteta adị n'Arsenal?

Ebe foto si, Reuters
N'egwuregwu, maka ọnyụpa Arsenal na-agba, ọ dịka ya bụ otu egwubọọlụ amalitela ịrọ Mikel Arteta nke Manchester City anya dịka onye nchịkota ha.
Amabeghị ka Arsenal enyela Arteta ya bụ ọrụ ịnọchị Unai Emery bụ nke achụrụ n'ọrụ n'ọnwa Nọvemba mana Pep Guardiola sị na ya agaghị abụ ọgbatauhie ya ha.











