Akụkọ kachasị n'abalị a: Naịjirịa nọ n'ụzọ agbaruola ihu maka ego e bere na bọjet Ndigbo
Ihe ndị dị mkpa n'abalị a
Super Eagles nke Naịjirịa emeriela 2 - 0

Ebe foto si, Getty Images
Naịjịrịa na Island akwatara ya n'Iko mbaụwa na Rọshịa na mgbede a ebe Brazil gbara Costa Rica ọkpụ abụọ asataghị otu.
Aịsland riri penariti ha ebe Ahmed Musa nke Naịjirịa tinyere ọkpụ abụọ na ọnụ goolu ndị Aịsland.
DSS Jidere Sen Enyinnaya Abaribe

Ozi na-eru BBC nti n'ehihie taa na-ekwu na ndị DDS akpurula Enyinnaya Abaribe.
Ka ọ dị ụgbụa ekwubeghị ihe ejiri kpụrụ ya mana BBC na-agba mbọ iwetere ụnụ ozi ya ka ọ na-apụta.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
N'mba ọzọ, US amachipụla ndị ọnụ na-eru n'okwu na mba Kongo bụ ndị na-etinye aka na-mpụ na nagarị dị iche iche ịbata be ha.
Naịjirịa nọ n'ụzọ agbaruola ihu maka ego e bere na bọjet ndị Igbo

Ebe foto si, Getty Images
Otu kpọrọ onwe ha ọgbakọ ụmụnna nọ na Kanada etiela ndị nnọchite anya ndị Igbo n'ụlọ ọmeiwu Naijịrịa mkpu n'isi ka ha bụ okenye siri nọrọ n'ụlọ ewu mụọ n'ọgbụ.
Obi adịghị ndị Igbo mma kemegbe Onyeisiala Mụhammadu Buhari kwuchara na ndị omeiwu a chapụrụ ihe n'ego etinyere na bọjeti maka ọrụ mmepe n'ala Igbo.
Gee nkeji nke abalị a ebe a












