Ipob a ga-arịọ Rotimi Amaechi mgbaghara ugbua?

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu kpọrọ onwe ha Concerned Youths of Niger-Delta (CYND) chọrọ ka ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) rịọ Rotimi Amaechi mgbaghara.
Nke a si n'okwu Ipob ziputara, ebe ha sị na ọ bụ ha wakporo ma tie Amaechi bụ mịnịsta na-ahụ maka njem na Naịjiria ihe n'obodo Madrid dị na mba Spen.
Cheta na ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful kwenyere na ha bụ ndị Ipob chọrọ iwakpo Amaechi na mba Spen ka ọ gara ọgbakọ maka mgbanwe ihu eluigwe.
Amaechi gbara ama ihe mwakpo a n'akara Twitter ya:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Amaechi gakwara n'ihu, site n'akwụkwọ mgbasaozi o zipụrụ, kwuo na ndị Ipob akpaghị ya aka, n'agbanyeghị ihe Ipob na-ekwu.
Ihe onyonyo ndị Ipob tinyere na soshal midia gosikwara ka ụfọdụ n'ime ha na-ekwu na ha "enweteghị" Amaechi.
Nke a na-egosi na eziokwu nwereike ịdị n'ihe Minista Njem na-ekwu.
BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful ka o tinye ọnụ n'okwu a otu a si na ha na-ekwuru ndị Naịja Delta kwuru, mana ekwentị ya agaghị.
BBC Igbo kpọkwara ndị na-ekwuru Maazị Amaechi mana ha sị na okwu a otu a kwuru abụghị ihe ha ga-etinyenwu ọnụ makana ha amaghị ebe ya bụ otu si pụta.
Mwakpo ndị nọ n'ọchịchị bụ atụmatụ ọhụru Ipob wepụtara site n'oge ha wakporo onye bụbu osote onyeisi Ụlọomeiwu ukwu bụ Ike Ekweremadu na mba Jamini.
Nyocha BBC Igbo mere maka otu CYND a gosiri na ọ bụ ka ha wepụtara okwu a ka ebu ụzọ nụ maka ha.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:










