Corruption in Nigeria: Kedu steeti akacha eri aka azụ na Naịjirịa?

Ngalaba gọọmentị na-ahụ maka mgbakọ na mwepụ bụ National Bureau of Statistics ewepụtala mpụtara nnyocha ha mere iji chọpụta ebe mpụ na nrụrụaka ka njọ na gọọmentị.
Nnyocha ha gosiri na ọ bụ n'Imo Steeti ka nrụrụaka na iri aka zụ kacha dị nta na Naịjirịa niile.
Ndị NBS wepụtara mpụtara nnyocha a n'ụbọchị Fraịdee.
Onyeisi ngalaba ahụ bụ Yemi Kale binyere aka n'akwụkwọ mpụtara nnyocha ahụ.
Nke mbụ e mere ya bụ nnyocha bụ na 2016.
Steeti kacha eri aka azụ

Ebe foto si, Twitter/@sgyemikale
Bido n'afọ 2016 ruo ugbua, nnyocha ndị NBS gosiri na iri aka azụ na nrụrụaka kacha nta na steeti Imo
Steeti ndị ọzọ iri aka azụ dị nta gunyere Jigawa, Kano na Plateau.
Mana iri aka azụ bawanyere na steeti ndị dịka Akwa Ibom, Enugwu, Ebọnyị, Gombe, Kogi, Kwara, Osun na Niger.

Ebe foto si, Twitter/sgyemikale
A bịa na mpaghara isii e nwere na Naịjirịa, ọbụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ ka iri aka azụ kacha nta, dịka nnyocha ndị NBS si gosi.
Ebe ọ kacha njọ bụ na 'North West', ebe 'North East' na 'South South' na esochi.
Kedu ndị ka eri aka azụ?

Ebe foto si, Nigeria Bureau of Statistics
Nnyocha ahụ gosiri na ọbụ na ngalaba ndị uweojii ka mpụ, nrụrụaka na iri aka azụ kacha njọ.
Ndị na-esote ha bụ ndị ọrụ ngalaba na-ahụ maka ala.
Ndị ọrụ ụtụisi gbara ndị nke atọ na ndị kacha etinye aka na nrụrụaka nakwa aka azụ.

Ebe foto si, Twitter/sgyemikale
Mana dịka nnyocha ahụ si dị, iri aka azụ na-ebelata na Naịjiria karịa ka ọ dị n'afọ 2016.
Na 2016, iri aka azụ na Naịjirịa dị pasentị iri atọ na abụọ na ụma atọ (32.3%).
Mana na 2019, ọ gbadatara ruo pasentị iri atọ na ụma abụọ (30.2%).

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










