Omoyele Sowore: Ọbụghị Buhari ziri DSS gaa nwụchie Sowore ọzọ - Ụlọọrụ Onyeisiala

Ebe foto si, Reuters
Ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na ọbụghị Buhari ziri ndị ngalaba Department of State Services (DSS) ka ha nwụchie Omoyele Sowore ọzọ.
Garba Shehu ọnụ na-ekwuru Buhari kọwara nd ndị DSS na-arụ ọrụ dịịrị ha nke bụ ichekwa Naịjirịa.
Shehu kọwara na ndị DSS agaghị agba nkịtị, fanye aka n'ụkwụ ka ndị mmadụ laa obodo Naịjirịa n'iyi.
Dịka Shehu si kwuo, "Sowore gara ji ihe onyonyoo TV nakwa ụlọọrụ ntaakụkọ ya bụ Sahara Reporters wee gbasaa ozi iji weta ọgbaaghara n'obodo ma chụtuo onye nọ n'isi ọchịchị."
"Onweghị gọọmentị ọbụla ga-agba nkịtị ka mmadụ ọbụla bute ọgbaaghara na mmebi ihe n'obodo."

Ebe foto si, @GarShehu
Shehu kwuru na ọbụ etu ahụ ka ndị otu oyiegwu Boko Haram si malite, mana ọchịchị Buhari agaghị ekwe ka ọzọ mee.
Cheta na ọnụ na-ekwuchitere ndị DSS bụ Peter Afunanya kọwaburu na ọ bụghị ndị otu ha bara n'ime ụlọikpe jichie Sowore.
Afunanya kwuru na ha ọ bụ na ezi ụlọikpe ahụ ka ha nọrọ nwude Sowore.
O kwuru na ihe niile ndị mmadụ hụrụ n'ihe onyonyoo nke na-efegharị na soshal midia bụcha asị asị.
Ọkụ agbagbuola mmadụ 40 na India

Ebe foto si, ANI via REUTERS TV
Mmadụ iri anọ anwụọla n'ọkụ gbara otu ụlọọrụ nrụpụta ihe dị n'obodo Delhi nke mba India.
Ndị ọrụ gbatagbata kwuru na ọkụ ahụ malịtere ịgba n'etiti abalị gburu ọtụtụ mmadụ nọ n'ime ebe ahụ ehi ụra.
A ka na-eme nyocha ịchọpta ihe butere ya bụ ọkụ ebe ndị ọrụ gbata gbata ka chị obi n'aka na ụfọdụ mmadụ ka ga-anwụ.
N'akụkọ ọzo,

Ebe foto si, Ugandan RedCross
Oke ide mmiri eriela isi mmadụ iri na isii na Uganda.
O bụ oke mmiri ozizo nke biara kaawa njọ site n'ụbọchi Fride rụo satụde butere mkpamkpa a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Otụtu ndi mmadu nke karịri otu narị anwụola na ọwụwa anyanwụ nke Afrịka maka mkpamkpa ide mmiri.
Ọ bụ asị! IPOB etighị m ihe - Amaechi

Ebe foto si, AFP
Ndị otu Minista na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi ekwuola hoo haa na o nweghi mgbe ndị otu "Indigenous People of Biafra" IPOB ji tie onyeisi ha ihe.
Ha kwenyere na o doro anya na akwadoro ịwakpo ya bụ Amaechi mana ọ zọrọ isi onwe ya rue mgbe ndị uweojii mba spen ji zọpụta ya.
Ọ bụ ụlọọrụ mgbaza ozi Rotimi Amaechi wepụtara ya bụ ozi,
Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na okwu na-efegharị nke atụrụ aka na ọ bụ Emma Powerful(ọnụ na-ekwuru Ipob) depụtara bụ okpotokpo asị.
Cheta na akụkọ nakwa ihe onyonyo pụtara na ngwụcha izu ụka a gosiri ebe ndị otu Ipob na-aba mba na ha ga-eti Rotimi Amaechi ihe.
Ruiz ị dị aghaa taa?

Ebe foto si, Getty Images












