Balogun Fire - Ụlọ na-agba ọkụ n'ahia Balogun, Legọs

Ọdọ ahia na-agba ọkụ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbu a na-ekwu na ọkụ na-agba na ahịa Balogun, Legọs.

Onyenta akụko anyi jụrụ ndị nọ ebe ahụ dịka ha na-akowa na ọ bụ igwe eji enye ọku bụ 'generator' ma ọ bụ mmanụ ọkụ 'Diesel' bidoro ọkụ a.

Aha onyonyo, Onitsha fire: "Ụlọ m na 'shọp' m gbara ọkụ, ebe ka m ga-agbaje?

Ha sikwa na ọ bụ n'elekere asatọ nke ụtụtụ ka ọkụ a bidoro mana ndị mmenyụ ọkụ biara na elekere iri.

Otu onye ọgba ama kpọrọ onwe ya 'Nelson' sị na ọku a agbaala ebe a n'afọ abụọ gara aga.

Aṅụrụ ọkụ

Ndị mmadụ nọ ebe ahụ si na ọ bụ 'Great Nigeria Building' na 'Braza Plaza' na-agba ya bụ okụ.

O tere aka tupu ndị na emenyụ ọkụ enwee ike igafe maka na ngwa ahia na ndị mmadụ nọchịrị ụzọ.

Ọdọ ahia na-agba ọkụ
Nkọwa foto, Ndị mmenyụ ọkụ na-agba mbọ imenyu ọkụ a

Ọkụ ọgbụgba a banyere n'ụlọ ahịa ọzọ.

Ọdọ ahia na-agba ọkụ
Nkọwa foto, Ọkụ gbakwara n'ogige ahia afọ abụo gara aga

Ha na-agbalị imenyụ ya bụ ọkụ mana mmiri ha anaghị erute ya bụ ọkụ nke ọma.

Dịka o si dị ụgbụa, ọkarịala awa abụọ ọkụ a gbawara.

Lee ya ka ọ si agba ụgbụ a

Akụkọ ka na-abịa.