Rotimi Amaechi: Ụmụ Naijiria amaghị nke a na-akọ wakporo m na Spen
Akụkọ dị mkpa taa:
Ụmụ Naijiria bi Spen enyeela Amaechi ọsọ

Ebe foto si, @ChibuikeAmaechi
Ụmụ afọ Naijiria no mba Spen kusuru mịnịsta na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi dịka ọ gara ọgbakọ mgbenwe ihu igwe nke Bekeee kpọrọ 'Climate change'na mba ahụ.
Amaechi onye gbara ama ihe mere na akara Twitter ya ụbọchị Fraide kwuru na ndị uweojii ala ahụ zọrọ ya tupu ndị ahụ nwe ike imerụ ya ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
'Ịwakpo ụlọikpe ịnwụchi Sowore bụ ihe ihere nye anyị na-akwado Buhari'

Soshal Midia ewurula ọkụ dịka ihe onyonyo na-egosi etu ndị nzuzo Naijiria a kpọrọ "Department of State Security" (DSS) si nwụchigharịa Omoyele Sowore ọzọ n'ime ụlọikpe.
Ndị dabatara n'ụlọikpe n'Abuja ụbọchị Fraide, ebe Sowore na-azara ọnụ ya maka ikpe gbasara ngagharịiwe 'Revolution Now' ọ haziri n'ọnwa Ọgọst, afọ 2019.

Ebe foto si, Sahara Reporters
Ngwangwa nke mere,ọkaikpe bilie gawara onwe ya, ọ ghọrọ egwu ndọndọkịrịdọ dịka (DSS) chọrọ iji ike kpụrụ Sowore.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Nke a na-abịa na-erughị awa iri abụọ na-anọ e ji tọghapụ ya n'ụlọmkpọrọ ka ụlọikpe nyechara iwu ka a hapụ ya.
Ọtụtụ ndị nwere agba na Naijiria akọtọọla nnwụchi a ndị DSS nwụchirị Sowore.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Obiageli Ezekwesili, onye bụbụ Mịnịsta agụmakwụkwọ kwuru na ya bụ ihe jọgburu onwe ya.
Ọ dọrọ onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ ghara ikwe ka ihe ọbụla mee ya bụ nwa amadị.
Ezekwesili kpọkukwara ụmụ Naịjirịa niile ka onye ọbụla bilie ọtọ ma katọọ ọchịchị aka ike Buhari
Lee ihe ụmụ Naijiria na-ekwu:
Otu onye ụlọomeiwu nta bụ Akin Alabi kwuru na ndị merụụ ụlọikpe, na ihe ha mere adabaghị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Otu onye ama dịka onye na-akwado onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Kayode Ogundamisi kwuru na "iwakpo ụlọikpe bụ ihe ihere nye anyị bụ ndị na-akwado ọchịchị ya."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Abdullahi Buhari si na DSS kemgbe ọchịchị Onyeisiala Buhari aghọọla ihe ihere:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Mana onye ọkaiwu bụ Anthony Okah gwara BBC na o nweghị ihe ọjọọ dị na ịnwụchigharị mmadụ n'ime ụlọikpe ma ọ bụụ na o nwere ebubo ọhụrụ e wetara megide ya.
Sowore pụtara ọzọ n'ụlọikpe
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6

End of X post, 7
Tupu DSS atọghapụ ya n'ụbọchị ise nke ọnwa Disemba 2019, Sowore nọrọ n'ụlọmkpọrọ ụbọchị 125.
Mana ugbua a nwuchiela ya ọzọ ma maa ha ebubo ọzọ.

Tupu ọgbaghara sitere na mbọ ndị DSS gbara ịnwụchị Sowore dara, Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu sị na ọ bụ n'ụbọchị 11 nke ọnwa Febụwarị 2020 ka a ga-alachite maka ikpe Sowore.
Onye ntaakukọ BBC sịkwa na Ọkaikpe gbara ọsọ mgbe ndị DSS wabatara ụlọikpe maka nwụchị Sowore.
Gọọmenti Bayelsa si na ọ bụ nde N3.5 ka e zuru na ọbụghi nde N40

Ebe foto si, @iamHSDickson
Kọmishọna na-ahu maka mgbasa ozi na Bayelsa Steeti bụ Daniel Iworiso-Markson gwara BBC na Kọmishọna ndị uweojii nke steeti ahụ enyela iwu ka a nwuchie ndị uweojii nọ nche n'ụlọ Gọomentị steeti ahụ mgbe ezuru nde Naira atọ na ọma.
Mazi Iworiso-Markson kọwara na ndị ohi banyere n'ụlọọrụ osote onye na-ahụ maka ndị ọrụ steeti ahu were zuru ya bụ ego .
Ọ gwara BBC na ndị ohi ahu gbakara igbe ego were zụrụ ego ahụ n'abalị Tuzde.
Dịka o di ugbụ a, ha na eche ka ndị uweojii gwa ha ihe ha chọpụtara.
Akụko ga-amasị gị
Nna Mazi Nnamdi Kanu alaala mmụọ

Ebe foto si, Getty Images
Onye eze obodo Afaraukwu, Ụmụahịa, bụ Israel Kanu, onye bụkwa nna onyeisi ndi otu Ipob bụ Mazị Nnamdi Kanu, alaala mmụọ.
Nwanne Mazị Kanu bụ Emmanuel gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọbụ eziokwu na ndị ichie obodo Afaraukwu amaala ọkwa maka ọnwụ nna ya.
O kwukwara na ozi ọbụla gbasara ọnwụ ya bụ n'ọnụ ndị ichie Afaraukwu ka ọ ga-esi apụta.
Nke a na-abịa dịka orubeghị ọnwa atọ nne ya bụ Ugoeze Nnenne Kanu nwụchara.
A mabeghị ọkwa etu a ga-esi lie ha.
"Knockout" agbakapụla nwatakịrị aka n'Ebonyi

Ebe foto si, Reuters
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Odah akọwaala ka aka nwata akwụkwọ sị laa ebe ọ na-agba egbe cham eji "knockout" mara.
Odah sị na ya bụ egbe cham merukwara ụmụakwụkwọ atọ ndị ọzọ nọ nso ahụ.
O kwuru na ya bụ nwata akwụkwọ aha ya bụ Chibuike Chukwu gbara afọ iri na ise (15) nọ na SS 11 n'ụlọakwụkwọ Glory Land High School dị n'Azugwu, Ebonyi steet atụnyela akaekpe ya na ya bụ ọdachi.
Odah sị na Chibuike na ndị ọzọ ometutara na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua.
Ọ gosikwara nwute ka ya bụ ihe sị mee ma na-adọkwa ụmụaka aka na ntị ka ha chaara egbe cham ahụ maka ọdachị dị otu a.
Odah kọwara na 'ndị ọrụ anyị ga-ejizi ndị ọkụekwe ka ha gagharịa n'ime obodo ịkọwara ndị mmadụ na iwu megidere ịgba "knockout" n'Ebonyi steeti".
Ọ sị na onye obula e jidere na ha ga-ata ya ahụhụ rubere ya dịka iwu kwuru,
O kwukwara na nke abụghị mbu ụdị ihe a na-eme na steeti ahụ na-arịọ nne na nna ka ha nye aka dụọ ụmụ ha ọdụ.
Okwu ụmụ Naịjirịa a chụpụrụ na Kroeshia

Ebe foto si, Getty Images
Abike Dabiri-Erewa bụ onyeisioche ngalaba na-anọchite anya ndị Naịjiria bi na mba ofesi, ekwuola na o zigarala minista na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ ozi, maka ụmụaka Naịjirịa abụọ e si mba Kroeshia chụlata.
Abike kwuru na n'agbanyeghi na Naịjiria enweghi ụlọọrụ nnọchiteanya na mba ahụ, na ha na-etinye anya n'ihe gbasara mmadụ abụọ a gara ịnọchiteanya mahadum FUTO n'asọmpi.
Okwu Orji Uzor Kalu

Otu Socio-Economic Rights and Accountability Project (SERAP) etinyela ọnụ na mkpọrọ a tụrụ Orji Uzor Kalu.
SERAP sị na ya bụ ikpe kwụ ọtọ ka sịga ma sị na Kalu nwere ohere ịga ụlọikpe nke Ukwu chọọ mkpegharị.
Ndị uweojii gburu mmadụ anọ n'India

Ebe foto si, Reuters
Ndị uweojii agbagbuola ụmụnwoke anọ a na-enyo na ha gburu otu nwaanyị ka ha dinachara ya n'ike, na mba India.
Ndị uweojii kwuru na ha gbara ndị ahụ egbe ka ha nwara izuru egbe ha wee gbalaga n'ụlọmkpọrọ ebe ha nwuchiri ha.
Aka akparala gọvanọ Nairobi, Kenya

Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii mba Kenya anwụchiela gọvanọ Nairobi bụ Mike Sonko n'ihi ebubo nrụrụaka na ihe ndị ọzọ.
O teela aka a malitere inyo Sonko enyo n'ihi nrụrụaka mana n'ụbọchị Fraịdee ka aka kpaara ya bụ ezekudele.
Okwu 'nchụpụ' Trump

Ebe foto si, Getty Images
Ka anyị bata ofesi ebe Nancy Pelosi bụ onyeisi n'ụlọomeiwu mba Amerika nyere Kọmitii na-ahụ maka ikpe iwu ka ha malite ịdepụta njọ Donald Trump nke ha ga-eji chụtuo ya n'ọkwa.
Onyeisiala Trump bụ onyeisiala mba Amerịka nke atọ ga-enwete onwe ya n'udị ọnọdụ ahụ, sị na ya nwe mmeri.
Everton chụrụ onye nchịkọta ha tinye onye ọzọ

Ebe foto si, AFP
Everton achụọla onye nchịkọta ha bụ Marco Silva ọsọ mgbada, na-erughi afọ abụọ o bidochara ọrụ, maka ọnyụpa otu ha na-agba na Premier League.
Duncan Ferguson gbabuuru Everton bọọlụ arigorola n'oche dịka onye ga na-achịkọta otu ahụ tupu ha akpọta onye ọzọ.
Nke a na-abịa dịka ndị mmadụ na-ajụ ajụjụ na-asị 'onye ga-anọchi Marco Silva'? bụ onye nchịkọta otu Everton a chụrụ n'ọrụ ụnyaahụ.
Ebe ike kwụrụ ọtọ gwụ ndị na-akwado Arsenal ka Brighton ji ọkpụ abụọ a satara otu merie ha n'Emirates.
Brendan Rodgers ebinyela aka n'akwụkwọ na Leicester

Ebe foto si, Getty Images
Onye nkuzi bọọlụ ndị Leicester City bụ Brendan Rodgers ebinyela aka n'akwụkwọ ịnọgide n'otu egwuregwu ahụ.
Kepukepu na-efegharịbu na Rodgers nwere ike ịga sonyere ndị otu egwu Arsenal bụ ndị chụrụ onye nkuzi ha Unai Emery izuuka abụọ gara aga.
Ka ọ dị ugbua, Rodgers ga-anọ na Leicester City ruo afọ 2025.